Joshụa 19:1-51

  • Ala ebo Simiọn ketara (1-9)

  • Ala ebo Zebulọn ketara (10-16)

  • Ala ebo Ịsaka ketara (17-23)

  • Ala ebo Asha ketara (24-31)

  • Ala ebo Naftalaị ketara (32-39)

  • Ala ebo Dan ketara (40-48)

  • Ala Joshụa ketara (49-51)

19  Mgbe e fere nza nke abụọ,+ ọ dabaara Simiọn, ya bụ, ebo Simiọn,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ. Ala ha ketara dị n’ala Juda ketara.+  Ha ketara Bia-shiba,+ Shiba, Moleda,+  Heza-shual,+ Bela, Izem,+  Eltolad,+ Bitọl, Họma,  Ziklag,+ Bet-makabọt, Heza-susa,  Bet-lebeọt,+ na Sharuhen. Ha dị obodo iri na atọ, ha na ógbè ha niile.  Obodo ndị ọzọ bụ Eyin, Rimọn, Ịta, na Eshan.+ Ha dị obodo anọ, ha na ógbè ha niile.  Ọ bụkwa ha nwe ógbè niile dị gburugburu obodo ndị a niile ruokwa Belat-bia, ya bụ, Rema nke dị n’ebe ndịda. Ebe ndị a niile ka ebo Simiọn ketara, n’ezinụlọ n’ezinụlọ.  E si n’ala e kenyere Juda kenye ụmụ Simiọn ala, n’ihi na ala Juda ketara karịrị akarị. N’ihi ya, ụmụ Simiọn ketara ala n’ala Juda ketara.+ 10  Mgbe e fere nza nke atọ,+ ọ dabaara ụmụ Zebulọn,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ. Ala ha rukwara Serid. 11  Ala ha si n’ebe ọdịda anyanwụ gara ruo Mariel, ruokwa Dabeshet, garakwa ruo na ndagwurugwu nke dị ebe e si aga Jọkniam. 12  O sikwa na Serid dị n’ebe ọwụwa anyanwụ gara ruo n’ókè ala Kislọt-tebọ, ruo Daberat,+ ruokwa Jefaya. 13  O sikwa ebe ahụ gara ruo Gat-hifa+ dị n’ebe ọwụwa anyanwụ, ruo Et-kezin, ruokwa Rimọn. Ọ gakwaara ruo Nia. 14  N’ebe ugwu, ala ha ruru Hanatọn, ruokwa na Ndagwurugwu Ịfta-el. 15  O rukwara Katat, Nahalal, Shimrọn,+ Aịdala, na Betlehem.+ Ha dị obodo iri na abụọ, ha na ógbè ha niile. 16  Ebe ndị a niile ka ebo Zebulọn ketara, n’ezinụlọ n’ezinụlọ.+ Obodo ndị a na ógbè ha niile bụ nke ha. 17  Mgbe e fere nza nke anọ,+ ọ dabaara ebo Ịsaka,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ. 18  Ala ha ruru Jezril,+ Kesọlọt, Shunem,+ 19  Hafarem, Shayọn, Anaherat, 20  Rabit, Kishiọn, Ibez, 21  Rimet, En-ganim,+ En-hada, na Bet-pazez. 22  Ala ha ruru Tebọ+ na Shahazuma na Bet-shimesh, ma kwụsị n’Osimiri Jọdan. Ha dị obodo iri na isii, ha na ógbè ha niile. 23  Ebe ndị a ka ebo Ịsaka ketara, n’ezinụlọ n’ezinụlọ.+ Obodo ndị a na ógbè ha niile bụ nke ha. 24  Mgbe e fere nza nke ise,+ ọ dabaara ebo Asha,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ. 25  Ala ha ruru Helkat,+ Helaị, Biten, Akshaf, 26  Alamelek, Emad, na Maịshal. O rukwara Kamel dị n’ebe ọdịda anyanwụ,+ ruokwa Shaịhọ-libnat. 27  O sikwa Bet-degọn dị n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo Zebulọn, ruokwa Ndagwurugwu Ịfta-el dị n’ebe ugwu. O rukwara Bet-imek na Neyel, ruokwa n’aka ekpe Kebul. 28  O rukwara Ibrọn, Rihọb, Hamọn, na Kena, ruokwa Saịdọn bụ́ obodo ọtụtụ mmadụ bi.+ 29  Ala ha ruru Rema, ruokwa Taya bụ́ obodo a rụsiri ike.+ O rukwara Hosa, ma kwụsị n’oké osimiri dị nso n’Akzib, 30  Ọma, Efek,+ na Rihọb.+ Ha dị obodo iri abụọ na abụọ, ha na ógbè ha niile. 31  Ebe ndị a ka ebo Asha ketara, n’ezinụlọ n’ezinụlọ.+ Obodo ndị a na ógbè ha niile bụ nke ha. 32  Mgbe e fere nza nke isii,+ ọ dabaara ụmụ Naftalaị, n’ezinụlọ n’ezinụlọ. 33  Ala ha bidoro na Hilef nakwa ná nnukwu osisi dị na Zeananim,+ gara ruo Adami-nikeb na Jabniel, ruokwa Lakọm, ma kwụsị n’Osimiri Jọdan. 34  Ala ha sikwa n’ebe ọdịda anyanwụ ruo Aznọt-tebọ. O sikwa ebe ahụ ruo Họkọk, ruokwa Zebulọn n’ebe ndịda. O ruru Asha n’ebe ọdịda anyanwụ, ruokwa Juda n’Osimiri Jọdan n’ebe ọwụwa anyanwụ. 35  Obodo ya ndị a rụsiri ike bụ Zidim, Zee, Hamat,+ Rakat, Kineret, 36  Adama, Rema, Hezọ,+ 37  Kidesh,+ Edraị, En-hezọ, 38  Yaịrọn, Migdal-el, Horem, Bet-enat, na Bet-shimesh.+ Ha dị obodo iri na itoolu, ha na ógbè ha niile. 39  Ebe ndị a ka ebo Naftalaị ketara, n’ezinụlọ n’ezinụlọ.+ Obodo ndị a na ógbè ha niile bụ nke ha. 40  Mgbe e fere nza nke asaa,+ ọ dabaara ebo Dan,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ. 41  Ala ha ruru Zora,+ Eshtaọl, Iye-shimesh, 42  Shealabin,+ Aịjalọn,+ Ịtla, 43  Ịlọn, Timna,+ Ekrọn,+ 44  Elteke, Gibetọn,+ Belat, 45  Jihọd, Bene-birak, Gat-rimọn,+ 46  Me-jakọn, na Rakọn. Ebe ala ha ruru dịkwa nso na Jọpa.+ 47  Ala Dan ketara abaghị ha.+ N’ihi ya, ha gara lụso Lishem agha,+ merie ya ma jiri mma agha bibie ya. Ha weghaara ya ma biri na ya. Ha gụgharịkwara Lishem aha, kpọwa ya Dan, aha nna nna ha.+ 48  Ebe ndị a ka ebo Dan ketara, n’ezinụlọ n’ezinụlọ. Obodo ndị a na ógbè ha niile bụ nke ha. 49  Otú a ka ha si kee ala ahụ, ndị ọ bụla ewere nke ha. Ndị Izrel sizi n’ala ha ketara nye Joshụa nwa Nọn ala. 50  Ha nyere ya obodo ọ rịọrọ ha otú Jehova gwara ha mee. Ha nyere ya Timnat-sira+ dị n’ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu. Ọ rụghachiri obodo ahụ, birikwa na ya. 51  Ala ndị a ka Elieza onye nchụàjà, Joshụa nwa Nọn na ndị isi ọnụmara ọ bụla n’ebo dị iche iche n’Izrel, keere ha.+ A nọ n’ihu Jehova, n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute+ nke dị na Shaịlo,+ fee nza, keere ha ala ndị ahụ. Otú a ka ha si kechaa ala ahụ niile.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji