Joshụa 3:1-17

  • Ndị Izrel gafere Osimiri Jọdan (1-17)

3  Joshụa wee bilie n’isi ụtụtụ, ya na ndị Izrel niile esi na Shitim+ pụọ gawa Osimiri Jọdan. Ma, tupu ha agafee osimiri ahụ, ha rahụrụ n’akụkụ ya.  Mgbe ụbọchị atọ gachara, ndị isi+ ha gagharịrị ebe ha mara ụlọikwuu  gwa mmadụ niile, sị: “Ozugbo unu hụrụ na ndị nchụàjà, bụ́ ndị Livaị,+ eburula igbe ọgbụgba ndụ Jehova bụ́ Chineke unu, sinụ ebe unu nọ kwalie. Na-esokwanụ igbe ahụ n’azụ,  ka unu nwee ike mata ụzọ unu ga-esi na-aga, n’ihi na unu agatụbeghị n’ụzọ ahụ mbụ. Unu agala igbe ọgbụgba ndụ ahụ nso. Ohere unu ga-enye ya ga-adị ihe dị ka puku kubit abụọ (2,000).”*  Joshụa wee sị ndị Izrel: “Doonụ onwe unu nsọ,+ n’ihi na Jehova ga-emere unu ihe dị ebube echi.”+  Joshụa wee gwa ndị nchụàjà, sị: “Burunụ igbe+ ọgbụgba ndụ ahụ na-aga n’ihu ndị Izrel.” Ha wee buru igbe ọgbụgba ndụ ahụ na-aga n’ihu ha.  Jehova wee sị Joshụa: “Taa ka m ga-amalite ime ka ị bụrụ nnukwu mmadụ n’anya Izrel niile,+ ka ha mara na m ga-anọnyere gị+ otú ahụ m nọnyeere Mosis.+  Gwa ndị nchụàjà bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, sị: ‘Ozugbo unu ruru n’ọnụ ọnụ Osimiri Jọdan, kwụrụnụ otu ebe.’”+  Joshụa wee gwa ndị Izrel, sị: “Bịanụ nso ka unu nụ ihe Jehova bụ́ Chineke unu kwuru.” 10  Joshụa agwazie ha, sị: “Ọ bụ ihe a ka unu ga-eji mara na Chineke dị ndụ nọnyeere unu+ nakwa na o nweghị ihe ga-eme ka ọ ghara ịchụpụrụ unu ndị Kenan, ndị Het, ndị Haịvaịt, ndị Perizaịt, ndị Gegash, ndị Amọraịt na ndị Jebus.+ 11  Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe ụwa niile nọ n’ihu unu ka ọ banye n’Osimiri Jọdan. 12  Ugbu a, họpụtanụ ụmụ nwoke iri na abụọ n’ebo Izrel niile. Unu ga-esi n’otu ebo họpụta otu onye.+ 13  Ozugbo ọbụ ụkwụ ndị nchụàjà bu Igbe Jehova, bụ́ Onyenwe ụwa niile, ga-azọsa n’Osimiri Jọdan, mmiri si n’ebe mgbago na-asọdata ga-akwụsị ịsọ asọ, kwụrụkwa otu ebe ka mgbidi.”+ 14  Mgbe ndị Izrel si ebe ha mara ụlọikwuu pụwa, tupu ha agafee Osimiri Jọdan, ndị nchụàjà bu igbe+ ọgbụgba ndụ ahụ nọ na-aga n’ihu ha. 15  Ozugbo ndị nchụàjà bu Igbe ahụ ruru n’Osimiri Jọdan, ụkwụ ha azọnyekwa n’ọnụ ọnụ ya (Osimiri Jọdan na-etoju n’ọnụ+ n’oge a na-ewe ihe ubi), 16  mmiri si n’ebe mgbago na-asọdata kwụsịrị ịsọ asọ. O toro, kwụrụkwa otu ebe ka mgbidi, si ebe ahụ ruo Adam dị ezigbo anya. Obodo a dị nso na Zaretan. Ma, mmiri nke na-asọga n’Oké Osimiri Araba, ya bụ, Oké Osimiri Nnu, tara. Ha kwụsịrị ịsọ asọ, ndị Izrel esi n’ihu Jeriko gafee. 17  Mgbe ndị nchụàjà ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Jehova kwụụrụ n’ala nkịtị+ n’etiti Osimiri Jọdan, ndị Izrel niile nọ na-aga n’ala nkịtị+ ruo mgbe ha niile gafechara Osimiri Jọdan.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ihe dị ka mita 890 (amaụkwụ 2,920). Gụọ B14.