Joshụa 4:1-24

  • Nkume ndị a ga-eji na-echeta ihe merenụ (1-24)

4  Ozugbo mba ahụ niile gafechara Osimiri Jọdan, Jehova gwara Joshụa, sị:  “Họta ụmụ nwoke iri na abụọ. Ị ga-esi n’ebo nke ọ bụla n’Izrel họrọ otu onye.+  Gwakwa ha, sị: ‘Gaanụ n’etiti Osimiri Jọdan, n’ebe ahụ ndị nchụàjà guzo,+ bute nkume iri na abụọ. Burukwanụ ha gafee osimiri ahụ ma busa ha n’ebe unu ga-arahụ n’abalị a.’”+  N’ihi ya, Joshụa kpọrọ ụmụ nwoke iri na abụọ, ndị o si n’ebo nke ọ bụla n’Izrel họpụta, ka ha bịa.  Joshụa wee sị ha: “Gaanụ n’etiti Osimiri Jọdan n’ihu Igbe Jehova Chineke unu. Onye nke ọ bụla n’ime unu buru otu nkume n’ubu ya, ka unu bute ole ebo ndị dị n’Izrel dị.  Nkume ndị a ga na-echetara unu ihe Chineke mere. Ọ bụrụ na ụmụ unu ajụọ unu n’ọdịnihu, sị, ‘Gịnị mere unu ji busa nkume ndị a ebe a?’+  unu ga-asị ha: ‘Nkume ndị a ga na-echetara ndị Izrel mgbe niile+ na e mere ka mmiri Jọdan kwụsị ịsọ asọ mgbe e bu igbe+ ọgbụgba ndụ Jehova banye na ya. Mgbe e bu ya gafee n’etiti mmiri Jọdan, e mere ka mmiri Jọdan kwụsị ịsọ asọ.’”  Ndị Izrel mere nnọọ ihe Joshụa gwara ha. Ha buuru nkume iri na abụọ n’etiti Osimiri Jọdan otú Jehova gwara Joshụa. Ha buuru ole ebo niile dị n’Izrel dị. Ha buuru ha gaa ebe ha ga-arahụ, busa ha ebe ahụ.  Joshụa dokwara nkume iri na abụọ n’etiti Osimiri Jọdan n’ebe ahụ ndị nchụàjà bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ guzo.+ Nkume ndị ahụ dịkwa ebe ahụ ruo taa. 10  Ndị nchụàjà ahụ bu Igbe ahụ guzo n’etiti Osimiri Jọdan ruo mgbe e mechara ihe niile Jehova gwara Joshụa ka ọ gwa ndị Izrel, otú Mosis gwara Joshụa ka o mee. N’oge ahụ niile, ndị Izrel nọ na-agafe ngwa ngwa. 11  Ozugbo mmadụ niile gafechara, ndị nchụàjà buuru Igbe Jehova gafee n’ihu ha.+ 12  Ebo Ruben, ebo Gad, na ọkara ebo Manase wee gafee n’usoro ka ndị agha,+ na-aga n’ihu ndị Izrel ndị ọzọ, otú Mosis gwara ha mee.+ 13  Ihe dị ka puku ndị agha iri anọ (40,000), ndị jikeere agha, gafekwara banye n’ọzara Jeriko. Jehova nọnyekwaara ha. 14  N’ụbọchị ahụ, Jehova mere ka Joshụa bụrụ nnukwu mmadụ n’anya ndị Izrel niile.+ Ha na-akwanyekwara ya ezigbo ùgwù* n’oge niile ọ dị ndụ otú ahụ ha na-akwanyere Mosis mgbe ọ dị ndụ.+ 15  Jehova wee sị Joshụa: 16  “Gwa ndị nchụàjà bu igbe+ ọgbụgba ndụ* ka ha si n’Osimiri Jọdan gbagote.” 17  Joshụa wee sị ndị nchụàjà ahụ: “Sinụ n’Osimiri Jọdan gbagote.” 18  Ozugbo ndị nchụàjà bu igbe+ ọgbụgba ndụ Jehova si n’etiti Osimiri Jọdan pụta, ọbụ ụkwụ ha apụtakwa ma zọsa n’ala nkịtị, Osimiri Jọdan malitere ịlaghachi n’ọnọdụ ya. O tochiri ebe niile+ otú ọ dị na mbụ. 19  Ndị Izrel si n’Osimiri Jọdan pụta n’abalị iri n’ọnwa mbụ. Ha makwara ụlọikwuu na Gilgal+ nke dị nso n’ebe ọwụwa anyanwụ Jeriko. 20  Joshụa dọsara nkume iri na abụọ ahụ e si n’Osimiri Jọdan bupụta na Gilgal.+ 21  Ọ gwaziri ndị Izrel, sị: “Mgbe ọ bụla ụmụ unu jụrụ unu n’ọdịnihu, sị, ‘Gịnị mere e ji busa nkume ndị a ebe a?’+ 22  unu ga-agwa ha, sị: ‘Ndị Izrel si n’ala nkịtị gafee Osimiri Jọdan+ 23  mgbe Jehova bụ́ Chineke anyị mere ka Osimiri Jọdan taa n’ihu anyị ruo mgbe anyị gafechara. Otú ahụkwa ka Jehova bụ́ Chineke anyị mere ka Oké Osimiri Uhie taa n’ihu anyị ruo mgbe anyị gafechara.+ 24  Jehova mere ihe a ka ndị niile bi n’ụwa mara na aka ya dị ike,+ nakwa ka unu na-atụ egwu Jehova bụ́ Chineke unu mgbe niile.’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Ha na-atụ ya ezigbo ụjọ.”
Na Hibru, “igbe Ihe àmà.”