Levitikọs 18:1-30

  • Ụdị mmekọahụ ndị na-adịghị mma (1-30)

    • Unu emela ka ndị Kenan (3)

    • Ndị bụ́ otu ọbara inwe mmekọahụ (6-18)

    • Mgbe nwaanyị na-ahụ nsọ ya (19)

    • Nwoke na nwoke ibe ya inwe mmekọahụ (22)

    • Mmadụ na anụmanụ inwe mmekọahụ (23)

    • ‘A ga-achụpụ unu n’ala ahụ ma ọ bụrụ na unu adịghị ọcha’ (24-30)

18  Jehova gwakwara Mosis, sị:  “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.+  Unu akpala àgwà otú ndị Ijipt unu biri n’ala ha na-akpa. Unu emekwala ihe ndị bi na Kenan, bụ́ ebe m na-akpọga unu, na-eme.+ Unu esokwala omenala ha.  Unu ga na-eme ihe niile m kpebiri, na-edebekwa iwu m niile ma na-eso ha.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.  Unu ga na-edebe iwu m, na-emekwa ihe m kpebiri. Onye ọ bụla na-eme otú a ga-adị ndụ maka na ọ na-eme ha.+ Abụ m Jehova.  “‘Ya enwela onye ọ bụla n’ime unu ga-agakwuru onye ọ bụla bụ́ onye ikwu ya ka ya na ya nwee mmekọahụ.*+ Abụ m Jehova.  Gị na nna gị enwela mmekọahụ. Gị na nne gị enwekwala mmekọahụ. Ọ bụ nne gị, gị na ya enwela mmekọahụ.  “‘Gị na nwunye nna gị enwela mmekọahụ.+ Ime otú ahụ bụ imenye nna gị ihere.*  “‘Gị na nwanne gị nwaanyị enwela mmekọahụ, ma ọ̀ bụ nwa nwaanyị nna gị mụrụ ma ọ̀ bụ nwa nwaanyị nne gị mụrụ, ma à mụrụ gị na ya n’otu ụlọ ma à mụrụ ya n’ebe ọzọ.+ 10  “‘Gị na nwa nwaanyị nwa gị nwoke mụrụ ma ọ bụ nwa nwaanyị nwa gị nwaanyị mụrụ enwela mmekọahụ n’ihi na ime otú ahụ bụụrụ gị ihe ihere.* 11  “‘Gị na nwa nwaanyị nwunye nna gị mụrụ, bụ́ nwa nna gị, enwela mmekọahụ, n’ihi na ọ bụ nwanne gị nwaanyị. 12  “‘Gị na nwanne nna gị nke nwaanyị enwela mmekọahụ. Ya na nna gị bụ otu ọbara.+ 13  “‘Gị na nwanne nne gị nke nwaanyị enwela mmekọahụ n’ihi na ya na nne gị bụ otu ọbara. 14  “‘Gị na nwunye nwanne nna gị nke nwoke enwela mmekọahụ, ka ị ghara isi otú ahụ menye nwanne nna gị ihere.* Ọ bụ nwunye nwanne nna gị.+ 15  “‘Gị na nwunye nwa gị enwela mmekọahụ.+ Ọ bụ nwunye nwa gị nwoke. Gị na ya enwela mmekọahụ. 16  “‘Gị na nwunye nwanne gị nwoke enwela mmekọahụ+ n’ihi na ime otú ahụ bụ imenye nwanne gị nwoke ihere.* 17  “‘Gị na nwaanyị ọ bụla na nwa ya nwaanyị enwela mmekọahụ.+ Alụrụla nwa nwaanyị nwa ya nwoke mụrụ ma ọ bụ nwa nwaanyị nwa ya nwaanyị mụrụ ka gị na ya na-enwe mmekọahụ. Ha na ya bụ otu ọbara. Ọ bụ omume rụrụ arụ.* 18  “‘Alụla nwaanyị lụọkwa nwanne ya nwaanyị ka ọ bụrụ nwunye di ya,+ gị na ya ana-enwe mmekọahụ mgbe nwanne ya nwaanyị ka nọ ndụ. 19  “‘Agakwurula nwunye gị* ka gị na ya nwee mmekọahụ n’oge ọ na-adịghị ọcha, mgbe ọ na-ahụ nsọ ya.+ 20  “‘Gị na nwunye mmadụ ibe gị* enwela mmekọahụ. Ị ga-abụ onye na-adịghị ọcha ma i mee otú ahụ.+ 21  “‘Ekwela ka e were nwa gị ọ bụla nye Molek.*+ Emela otú a ka ị ghara imebi aha Chineke gị.+ Abụ m Jehova. 22  “‘Gị na nwoke ibe gị enwela mmekọahụ.*+ Ọ bụ arụ. 23  “‘Nwoke na anụmanụ ekwesịghị inwe mmekọahụ. Nwoke mere otú ahụ ga-abụ onye na-adịghị ọcha. Nwaanyị ekwesịghịkwa ịgakwuru anụmanụ ka ya na ya nwee mmekọahụ.+ Ọ bụ arụ. 24  “‘Unu emela nke ọ bụla n’ime ihe ndị a ka unu ghara ịbụ ndị na-adịghị ọcha, n’ihi na ọ bụ ihe ndị a niile ka mba ndị m na-achụpụrụ unu nọ na-eme wee bụrụ ndị na-adịghị ọcha.+ 25  N’ihi ya, ala ha adịghị ọcha. M ga-atakwa ndị bi na ya ahụhụ maka mmehie ha. A ga-achụpụ ha n’ala ha.*+ 26  Ma ununwa ga na-edebe iwu m, na-emekwa ihe m kpebiri.+ Unu emekwala nke ọ bụla n’ime arụ ndị a, ma nwa afọ ma onye mbịarambịa nke binyeere unu.+ 27  N’ihi na ọ bụ arụ ndị a niile ka ndị biri n’ala a nọ na-eme,+ nke mere na ala a adịghịzi ọcha. 28  A gaghịkwa achụpụ unu n’ala a otú a ga-achụpụ* mba ndị bi na ya tupu unu erute maka na unu agaghị emerụ ala a. 29  Ọ bụrụ na e nwee ndị na-eme nke ọ bụla n’ime arụ ndị a, a ga-egbu ha niile.* 30  Unu ga na-eme ihe niile m chọrọ ka unu na-eme ma ghara ime nke ọ bụla n’omenala rụrụ arụ ndị bi tupu unu erute nọ na-eme,+ ka omume ndị ahụ ghara ime ka unu bụrụ ndị na-adịghị ọcha. Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

N’amaokwu a nakwa n’amaokwu ndị na-esonụ, otú e si dee “inwe mmekọahụ” na Hibru bụ “ikpughe ọtọ.”
Na Hibru, “Ọ bụ ọtọ nna gị.”
Na Hibru, “ha bụ ọtọ gị.”
Na Hibru, “kpughee ọtọ nwanne nna gị.”
Na Hibru, “ọ bụ ọtọ nwanne gị nwoke.”
Ma ọ bụ “omume na-eme ihere.”
O nwekwara ike ịbụ iko mmadụ ka a na-ekwu.
Ma ọ bụ “onye agbata obi gị; enyi gị.”
Ma ọ bụ “chụọrọ Molek àjà.”
Na Hibru, “Gị na nwoke edinala otú nwoke na nwaanyị si edina.”
Na Hibru, “Ala ha ga-agbọpụ ha.”
Na Hibru, “Ala a agaghịkwa agbọpụ unu otú ọ ga-agbọpụ.”
Na Hibru, “a ga-esi ná ndị ha gbupụ ha.”