Maịka 1:1-16

  • Ihe Chineke ga-eme Sameria na Juda (1-16)

    • Ihe kpataara ha nsogbu bụ mmehie ha na isi ha nupụrụ (5)

1  Ihe a ka Jehova gwara Maịka*+ onye Moreshet, n’oge Jotam,+ Ehaz,+ na Hezekaya+ bụ ndị eze Juda.+ Ọ gwara ya ihe a n’ọhụụ gbasara Sameria na Jeruselem:   “Unu niile, geenụ ntị. Ụwa na ihe jupụtara na ya, ṅaanụ ntị. Jehova nọ n’ụlọ nsọ ya. Nụrụnụ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova na-ekwu ihe unu mere.+   N’ihi na Jehova si n’ebe o bi na-apụta. Ọ ga-agbadata wee zọda ebe ndị dị elu n’ụwa.   Ugwu niile ga-agbaze n’okpuru ụkwụ ya.+ Ndagwurugwu niile ga-agbawasịDị ka mgbá aṅụ* ọkụ gbazere,Dị ka mmiri a wụpụrụ n’ebe kpọdara akpọda.   Ọ bụ maka na Jekọb nupụrụ isi mere ihe a niile ji na-eme,N’ihi mmehie ndị Izrel mere.+ Ole ndị mere Jekọb ji nupụ isi? Ọ́ bụghị ndị bi na Sameria?+ Ole ndị mekwara e ji nwee ebe ndị dị elu na Juda?+ Ọ́ bụghị ndị bi na Jeruselem?   M ga-eme ka Sameria bụrụzie obodo e bibiri ebibi nke dị n’ọhịa,Ebe a na-akọ ubi vaịn. M ga-awụba nkume ya na ndagwurugwu. M ga-akụrikwa ntọala ya.   A ga-akụri arụsị ya niile a pịrị apị,+Kpọọkwa onyinye niile e ji kwụọ ya ụgwọ ọkụ.*+ M ga-ebibi arụsị ya niile. N’ihi na o ji ihe ọ gbatara n’akwụna nweta ha. A ga-ejikwa ha kwụọ ndị akwụna nọ ebe ọzọ ụgwọ.”   M ga-ebe ákwá arịrị, tiekwa mkpu ákwá n’ihi ihe a.+ M ga-agba ụkwụ efu, gbarakwa ọtọ na-ejegharị.+ M ga na-eti mkpu dị ka nkịta ọhịa,Na-erukwa uju dị ka enyí nnụnụ.   N’ihi na ọnyá ya enweghị ike ịla ala.+ Ọnyá ahụ erutela Juda.+ O rutela n’ọnụ ụzọ ámá ndị m, rutekwa Jeruselem.+ 10  “Unu akọla ya na Gat. Unu ebela ákwá. Tụrụọnụ n’ájá na Bet-afra.* 11  Ndị bi na Shefia, gbaranụ ọtọ jiri ihere si n’ala unu pụọ. Ndị bi na Zeanan apụtabeghị. Ndị Bet-izel ga na-eti mkpu arịrị. Ha agaghịzi enyere unu aka. 12  Ndị bi na Merọt na-eche ka ha nweta ihe ọma. Ma, Jehova emeela ka ihe ọjọọ bịa n’ọnụ ụzọ ámá Jeruselem. 13  Ndị bi na Lekish,+ kegidenụ ịnyịnya n’ụgbọ ịnyịnya. Mmehie Zayọn mere si unu n’aka,N’ihi na ọ bụ unu mere ka Izrel nupụ isi.+ 14  N’ihi ya, unu ga-enye Moreshet-gat onyinye ọ ga-eji ala. Ụlọ ndị dị n’Akzib+ rafuru ndị eze Izrel. 15  Ndị bi na Marisha,+ m ga-ezitere unu onye ga-emeri unu.*+ Ebube Izrel ga-eru Adọlam.+ 16  Meenụ onwe unu isi nkwọcha ma kpụchapụ ntutu isi unu n’ihi ụmụ unu unu hụrụ n’anya. Meenụ ka isi nkwọcha unu dị ka nke udele,N’ihi na e si ebe unu nọ dọrọ ụmụ unu n’agha.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Maịka bụ mkpọbiri Maịkel ma ọ bụ Mịkaya. Maịka pụtara “Ònye Dị Ka Jehova?”
Mgbá aṅụ bụ ihe aṅụ na-anyụpụta nke na-adị n’ụgbụgbọ mmanụ aṅụ. Ihe a na-agbaze ngwa ngwa.
Ma ọ bụ “Kpọọkwa ụgwọ niile a kwụrụ ya maka akwụna ọ na-agba ọkụ.”
Ma ọ bụ “n’ụlọ Afra.”
Ma ọ bụ “ga-anapụ unu ihe niile unu nwere.”