Maịka 2:1-13

  • A ga-ata ndị na-emegbu ndị ọzọ ahụhụ (1-11)

  • A kpọkọtara ndị Izrel ka ha dịrị n’otu (12, 13)

    • Ìgwè mmadụ ga na-eme mkpọtụ n’Izrel (12)

2  “Ndị na-akpa nkata ihe ọjọọ, Ndị na-edina n’àkwà* ha eme atụmatụ otú ha ga-esi mee ihe na-adịghị mma, ga-ata ahụhụ. Ha na-eme ihe ahụ ha kpara nkata ya mgbe chi bọrọ,N’ihi na ha ga-emeli ya.+   Ha chọọ inweta ubi, ha anara ya n’ike.+ Ha chọọ inweta ụlọ, ha eweghara ya. Ha na-egwu mmadụ wayo nara ya ụlọ ya.+ Ha na-egwukwa mmadụ wayo nara ya ala ya.   N’ihi ya, Jehova kwuru, sị: ‘M na-eme atụmatụ ka ọdachi dakwasị unu,+ ọdachi nke unu na-agaghị agbanahụ.*+ Unu agaghịzi adị mpako,+ n’ihi na ọ bụ oge ọdachi.+   N’ụbọchị ahụ, ndị mmadụ ga-eji unu na-atụ ilu. Ha ga-ebekwara unu ákwá arịrị.+ Ha ga-asị: “A laala anyị n’iyi.+ O nyere ndị ọzọ ala anyị ketara. Ọ napụla anyị ya.+ O nyere onye na-anaghị efe Chineke ubi anyị.”   N’ihi ya, unu agaghị enwe onye ga-eji ụdọ na-atụ̀ ala,Onye ga-ekere ọgbakọ Jehova ala.   Ha na-asị, “Unu ekwusala ihe ọ bụla. E kwesịghị ikwusa ihe ndị a. A gaghị emenye anyị ihere.”   Ndị si n’ezinụlọ Jekọb, ndị mmadụ hà na-ajụ, sị: “Jehova ọ́ naghịzi enwe ndidi?* Ọ̀ bụ ya mere ihe ndị a?” Okwu m ọ́ naghị eme ka ihe gaziere ndị na-eme ihe ziri ezi?   Ma n’oge na-adịbeghị anya, ndị m na-emezi ka ndị iro. Ọ na-abụ, ha hụ ndị tụsaara ahụ́ na-agafe ka ndị si agha na-alọta,Ha eyipụ ha ihe ndị dị oké ọnụ* e ji chọọ uwe ha mma.   Ha na-achụpụ ụmụ nwaanyị ndị m n’ụlọ ha na-enwe obi ụtọ na ya. Ha na-anapụ ụmụ ha ihe ndị m ji gọzie ha. Ha anaghịkwa enyeghachi ha ihe ndị ahụ ọzọ. 10  Bilienụ pụọ, maka na ebe a abụghị ebe a na-ezu ike. N’ihi na ala a adịghị ọcha.+ E bibiela ya ezigbo mbibi.+ 11  Ọ bụrụ na onye na-achụ ikuku, nke na-aghọkwa aghụghọ, aghaa ụgha, sị: “M ga-agwa unu okwu banyere mmanya ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ na-aba n’anya,” Ọ bụ ụdị onye a ka ndị a na-achọ ka ọ na-agwa ha okwu.+ 12  Jekọb, m ga-akpọkọta unu niile. O nweghị ihe ga-eme ka m ghara ịkpọkọta ndị Izrel fọdụrụnụ.+ M ga-eme ka ha dịrị n’otu dị ka ìgwè atụrụ nke nọ n’ogige atụrụ,Dị ka ìgwè anụ nke nọ ebe ha na-ata ahịhịa.+ Ìgwè mmadụ ga na-eme mkpọtụ ebe ahụ.’+ 13  Onye na-etipu mgbidi ga-ebutere ha ụzọ. Ha ga-etipukwu mgbidi. Ha ga-esi n’ọnụ ụzọ ámá gafere, sikwa na ya pụọ.+ Eze ha ga-ebutere ha ụzọ,Jehova ga-abụkwa onyeisi ha.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Na Hibru, “na-agaghị ewepụ olu unu na ya.”
Ma ọ bụ “Mmụọ Jehova ọ́ naghịzi enwe ndidi?”
Ma ọ bụ “ihe ndị pụrụ iche.”