Maịka 3:1-12

  • Chineke katọrọ ndị ndú Izrel na ndị amụma (1-12)

    • Mmụọ Jehova mere ka Maịka nwee ezigbo ike (8)

    • Ndị nchụàjà na-ezi ihe iji nweta ego (11)

    • Jeruselem ga-abụzi obodo e bibiri ebibi (12)

3  M wee sị: “Ndị isi n’ezinụlọ JekọbNa ndị na-achị ndị Izrel,+ biko nụrụnụ. Ọ̀ bụ na unu ekwesịghị ịma ihe ziri ezi?   Ma, unu kpọrọ ihe ọma asị,+ hụ ihe ọjọọ n’anya.+ Unu na-agba ndị m akpụkpọ, na-adọpụsịkwa anụ dị n’ọkpụkpụ ha.+   Unu na-eri anụ ndị m,+Na-agbakwa ha akpụkpọ,Kụrie ọkpụkpụ ha, gwerisiekwa ha+Dị ka ihe e ji ite* sie, dịkwa ka anụ dị n’ime ite e ji esi nri.   N’oge ahụ, ha ga-akpọku Jehova ka o nyere ha aka,Ma ọ gaghị aza ha. Ọ ga-agbakụta ha azụ n’oge ahụ+ N’ihi ihe ọjọọ ndị ha na-eme.+   Ndị amụma na-eme ka ndị m kpafuo.+ Ọ na-abụ ha nwee ihe ezé ha ga-ata,+ ha asị, ‘Udo dịrị unu.’+ Ma ọ bụrụ na mmadụ etinyeghị ihe n’ọnụ ha, ha alụso onye ahụ ọgụ. N’ihi ya, Jehova gwara ndị amụma ahụ, sị:   ‘Chi ga-ejinahụ unu.+ Unu agaghị ahụ ọhụụ.+ Naanị ọchịchịrị ka unu ga-ahụ. Unu agaghịzi agba afa. Anyanwụ ga-ada n’ihi ndị amụma,Chi ga-ejibidokwa ha.+   Ihere ga-eme ndị na-ahụ ọhụụ,+A ga-emechukwa ndị na-agba afa ihu. Ha niile ga-ekpuchi ọnụ ha,*N’ihi na Chineke azaghị ha ihe ọ bụla.’”   Ma mmụọ Jehova emeela ka ezigbo ike dịrị n’ime m. Ọ na-enyekwara m aka ka m na-ekpe ikpe ziri ezi, na-akatakwa obi,Iji gwa Jekọb isi o nupụrụ, gwakwa Izrel mmehie ya.   Biko nụrụnụ ihe a, ndị isi n’ezinụlọ Jekọb,Na ndị na-achị ndị Izrel,+Ndị kpọrọ ikpe ziri ezi asị, ndị na-agbagọkwa ihe ọ bụla kwụ ọtọ,+ 10  Ndị na-eji igbu mmadụ* arụ Zayọn, na-ejikwa ajọ omume arụ+ Jeruselem. 11  Ndị ndú* ya anaghị ekpe ikpe n’anaraghị aka azụ.*+ Ndị nchụàjà ya anaghị ezi ihe ma ọ bụrụ na a kwụghị ha ụgwọ.+ Ndị amụma ya na-agba afa iji nweta ego.*+ Ma ha tụkwasịrị Jehova obi,* na-asị: “Ọ̀ bụ na Jehova anọnyereghị anyị?+ Ọdachi ọ bụla agaghị adakwasị anyị.”+ 12  N’ihi ya, a ga-eji maka unuKọọ Zayọn ka ubi. Jeruselem ga-abụzi obodo e bibiri ebibi.+ Oké ọhịa ga-etochikwa ugwu nke ụlọ nsọ dị n’elu ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ite ọnụ ya dị obosara.”
Ma ọ bụ “ga-ekpuchi afụ ọnụ ha.”
Na Hibru, “ịwụfu ọbara.”
Na Hibru, “Ndị isi.”
Ma ọ bụ “n’erighị ngarị.”
Ma ọ bụ “ọlaọcha.”
Ma ọ bụ “ha na-asị na ha tụkwasịrị Jehova obi.”