Maịka 6:1-16

  • Ihe Jehova kwuru na ndị Izrel mere ya (1-5)

  • Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka anyị? (6-8)

    • Ikpe ziri ezi, ịbụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi, ịdị umeala n’obi (8)

  • Mmehie ndị Izrel mere na ahụhụ a ga-ata ha (9-16)

6  Biko, nụrụnụ ihe Jehova na-ekwu. Bilienụ, zaranụ ọnụ unu n’ihu ugwu ukwu niile,Ka ugwu nta niile nụkwa olu unu.+   Ugwu niile, nụrụnụ ihe Jehova kwuru na e mere ya. Ntọala ụwa nke siri ike, nụrụkwanụ,+N’ihi na Jehova na ndị ya nwere okwu. Nụrụnụ ihe ọ sị na ndị Izrel mere ya:+   “Ndị m, gịnị ka m mere unu? Oleekwa otú m si mee ka ike m gwụ unu?+ Kwuonụ ihe m mere unu.   Esi m n’Ijipt kpọpụta unu.+ Agbapụtara m unu n’ala unu bụ ndị ohu.+ Eziteere m unu Mosis, Erọn, na Miriam.+   Bikonụ, ndị m, chetanụ nkata Belak eze Moab kpara+Nakwa ihe Belam nwa Biọ zara ya.+ Chetanụ ihe mere malite na Shitim+ ruo na Gilgal,+Ka unu wee mara na Jehova na-eme ihe ziri ezi.”   Olee ihe m ga-eji bịa n’ihu Jehova? Olee ihe m ga-eji kpọọrọ Chineke nọ n’elu isiala? M̀ ga-eji àjà a na-esucha ọkụ bịa n’ihu ya? M̀ ga-eji ụmụ ehi gbara otu afọ bịa n’ihu ya?+   Puku kwuru puku ebule ọ̀ ga-adị Jehova mma? Mmanụ nke na-asọ ka iri puku kwuru iri puku iyi ọ̀ ga-adị ya mma?+ M̀ ga-enye ọkpara m maka isi m nupụrụ? M̀ ga-enye mkpụrụ nke afọ m maka mmehie m?*+   Gịnwa bụ́ mmadụ, Jehova agwala gị ihe dị mma. Gịnịkwa ka ọ na-achọ n’aka gị? Naanị ihe ọ chọrọ bụ ka ị na-ekpe ikpe ziri ezi,+ ka ị bụrụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi,*+Nakwa ka i jiri obi umeala+ soro Chineke gị na-eje ije.+   Olu Jehova na-akpọ obodo òkù. Ndị nwere ezigbo amamihe ga-atụkwa egwu aha ya. Nụrụnụ ihe mkpanaka na onye họpụtara ya na-ekwu.+ 10  È nwere akụ̀ a kpatara otú na-adịghị mmaMa ọ bụ efa* na-ezughị ezu, nke rụrụ arụ, ka dị n’ụlọ onye ajọ omume? 11  Aka m ọ̀ dị ọcha ma m nwee ihe na-adịghị mma e ji atụ̀ iheNa akpa nkume e ji atụ̀ ihe, nke e ji egwu wayo?+ 12  N’ihi na ndị ya bara ọgaranya bụ ndị tigbuo zọgbuo. Ndị bi n’obodo a na-aghakwa ụgha.+ Ire ha bụ aghụghọ aghụghọ.+ 13  “N’ihi ya, m ga-eti gị ihe, merụọkwa gị ahụ́.+ M ga-eme ka ị tọgbọrọ chakoo n’ihi mmehie gị. 14  Ị ga-eri ihe ma afọ agaghị eju gị. O nweghị ihe ga-adị gị n’afọ.+ O nweghị ebe ị ga-ebusa ngwongwo ị kwapụtara, ndị ọzọ aghara iburu ya. M ga-enyefe ndị iro gị ngwongwo ị kwapụtara. 15  Ị ga-akụ mkpụrụ, ma ị gaghị aghọrọ ya. Ị ga-azọcha mkpụrụ oliv, ma ị gaghị ete mmanụ ya. Ị ga-emepụta mmanya ọhụrụ, ma ị gaghị aṅụ mmanya.+ 16  N’ihi na unu na-eme ihe niile Ọmraị na ezinụlọ Ehab mere.+ Unu na-akpakwa àgwà otú ha kpara. Ọ bụ ya mere m ga-eji mee obodo a ihe ọ ga-abụ, ndị mmadụ hụ ya, ya eju ha anya. Ndị bi n’obodo a ga-abụkwa ihe a ga-afụrụ mkpọrọhịhị.+ Ndị dị iche iche ga-akọchakwa ha.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “maka mmehie mkpụrụ obi m mere?”
Ma ọ bụ “ka ị dị obiọma ma na-egosi ndị ọzọ ịhụnanya pụrụ iche.”
Efa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Gụọ B14.