Malakaị 1:1-14

  • Jehova hụrụ ndị ya n’anya (1-5)

  • Ndị nchụàjà ji ihe ndị na-adịghị mma achụ àjà (6-14)

    • A ga-asọpụrụ aha Chineke ná mba niile (11)

1  Ozi gbara ọkpụrụkpụ: Okwu Jehova si n’ọnụ Malakaị* gwa Izrel:  Jehova kwuru, sị, “M hụrụ unu n’anya.+ Ma unu sịrị: ‘Olee otú i si hụ anyị n’anya?’” Jehova kwukwara, sị, “Ọ̀ bụ na Ịsọ abụghị nwanne Jekọb?+ Ma ahụrụ m Jekọb n’anya,  kpọọ Ịsọ asị.+ M mere ka ugwu ya tọgbọrọ chakoo,+ hapụkwara nkịta ndị bi n’ala ịkpa ala o ketara.”+  Jehova nke ụsụụ ndị agha kwukwara, sị: “N’agbanyeghị na Ịdọm* na-asị, ‘A kụriela anyị, ma anyị ga-alọghachi rụghachi ebe dakpọsịrị adakpọsị.’ Ha ga-arụ ya, ma m ga-akwatu ya. A ga-akpọ ha ‘ala ajọ omume,’ kpọọkwa ha ‘ndị Jehova jụrụ ruo mgbe ebighị ebi.’+  Anya unu ga-ahụ ya, unu ga-asịkwa: ‘Ka e too Jehova n’ala Izrel niile.’”  “‘Nwa na-asọpụrụ nna ya,+ onye na-eje ozi na-asọpụkwara nna ya ukwu. N’ihi ya, ọ bụrụ na m bụ nna,+ olee otú unu si na-asọpụrụ m?+ Ọ bụrụkwa na m bụ nna unu ukwu, olee egwu unu na-atụ m?’* Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha gwara unu ndị nchụàjà, ndị na-eleda aha m anya.+ “‘Ma unu sịrị: “Olee otú anyị si leda aha gị anya?”’  “‘Ọ bụ maka na unu na-achụ nri* rụrụ arụ n’àjà n’ebe ịchụàjà m.’ “‘Unu na-asịkwa: “Olee otú anyị si mee ka ị ghara ịdị nsọ?”’ “‘Ọ bụ maka na unu na-asị: “E kwesịrị ileda tebụl Jehova+ anya.”  Mgbe unu na-eji anụmanụ kpuru ìsì achụ àjà, unu na-asị: “E nweghị ihe o mere.” Mgbe unu na-ewetakwa anụmanụ dara ngwọrọ ma ọ bụ nke na-arịa ọrịa, unu na-asị: “E nweghị ihe o mere.”’”+ “Biko, werenụ ya gaa nye gọvanọ unu. Obi ọ̀ ga-adị ya mma? Ọ̀ ga-anabata unu nke ọma?” Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.  “Ugbu a, biko, rịọnụ Chineke arịrịọ,* ka o wee meere anyị amara. Ebe unu ji ihe ndị ahụ na-achụ àjà, è nwere onye n’ime unu ọ ga-anabata nke ọma?” Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru. 10  “Ònye n’ime unu ga-ewepụta onwe ya ịna-emechi ọnụ ụzọ?*+ Unu anaghịdị amụnye ọkụ n’ebe ịchụàjà m n’anaghị ihe ọ bụla.+ Ihe unu anaghị amasị m, onyinye ọ bụla unu wetara anaghịkwa eme m obi ụtọ.”+ Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru. 11  “N’ihi na malite n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo n’ebe ọdịda anyanwụ, a ga-asọpụrụ aha m ná mba niile.+ A ga na-achụ àjà n’ebe niile, a ga na-ewetakwa onyinye iji too aha m, bụ́ onyinye dị ọcha; n’ihi na a ga-asọpụrụ aha m ná mba niile.”+ Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru. 12  “Ma unu na-eme ka ọ ghara ịdị nsọ,*+ na-asị, ‘Tebụl Jehova rụrụ arụ, e kwesịkwara ileda mkpụrụ ya anya, ya bụ, nri ndị a na-edokwasị na ya.’+ 13  Unu na-asịkwa, ‘Ike ya agwụla anyị.’ Unu na-emikwara ya ọnụ.”* Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru. “Unu na-ewetakwa anụmanụ ndị e zuru ezu, ndị dara ngwọrọ, na ndị na-arịa ọrịa. N’eziokwu, unu na-enye ha n’onyinye. M̀ kwesịrị ịnara unu ha?”+ Ọ bụ ihe Jehova kwuru. 14  “Onye aghụghọ nke nwere anụmanụ ahụ́ dị mma bụ́ oké n’ìgwè anụ ya, ma ya ekwe nkwa ma jiri nke ahụ́ na-adịghị mma* chụọrọ Jehova àjà, a ga-abụ ya ọnụ. N’ihi na abụ m Eze ukwu,+ aha m ga-adịkwa egwu ná mba niile.”+ Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Malakaị pụtara “Onye Ozi M.”
Ịdọm bụ aha ọzọ a na-akpọ Ịsọ. Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “olee otú unu si na-asọpụrụ m?”
Na Hibru, “achịcha.”
Ma ọ bụ “meenụ ka obi Chineke jụrụ.”
O nwere ike ịbụ ọrụ imechi ọnụ ụzọ ụlọ nsọ ka a na-ekwu okwu ya.
O nwere ike ịbụ, “ka m ghara ịdị nsọ.”
Ma ọ bụ “na-esu ya imi.”
Ma ọ bụ “nke nwere nkwarụ.”