Malakaị 4:1-6

  • Ịlaịja ga-abịa tupu ụbọchị Jehova abịa (1-6)

    • ‘Anyanwụ ezi omume ga-acha’ (2)

4  “N’ihi na, lee, ụbọchị nke na-ere ka oké ọkụ na-abịa.+ Ndị niile dị mpako na ndị niile na-eme ajọ omume ga-adị ka ahịhịa ọka. Ụbọchị ahụ nke na-abịa ga-erepịa ha ka ọkụ, ọ gaghịkwa erefọ mgbọrọgwụ ha ma ọ bụ alaka ha.” Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.  “Ma anyanwụ ezi omume ga-achara unu ndị na-asọpụrụ* aha m, ìhè* ya ga-agwọkwa unu. Unu ga-awụgharịkwa ka ụmụ ehi gbara agba.”  Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, “Unu ga-azọgide ndị ajọ omume ụkwụ n’ihi na ha ga-adị ka ájá n’okpuru ọbụ ụkwụ unu n’ụbọchị m ga-eme ihe.”  “Chetanụ Iwu m nyere Mosis ohu m n’ugwu Horeb, ya bụ, ntụziaka na ihe ndị m kpebiri bụ́ ndị m nyere ndị Izrel niile iwu ka ha na-edebe.+  “Lee, m na-ezitere unu Ịlaịja onye amụma+ tupu oké ụbọchị Jehova, bụ́ ụbọchị dị egwu, abịa.+  Ọ ga-eme ka obi ndị nna dịrị ka nke ụmụ,+ meekwa ka obi ụmụ dịrị ka nke ndị nna,* ka m wee ghara ịbịa tie ụwa ihe ma bibie ya.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “na-atụ egwu.”
Na Hibru, “nku.”
Ma ọ bụ “Ọ ga-eme ka obi ndị nna chigharịkwuru ụmụ ha, meekwa ka obi ụmụ chigharịkwuru nna ha.”