Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Efesọs 2:1-22

  • Chineke mere ka anyị dịrị ndụ, anyị na Kraịst adịrịkwa n’otu (1-10)

  • Kraịst kwaturu mgbidi kewara ìgwè abụọ (11-22)

2  N’ihi mmehie unu, unu dịbu ka ndị nwụrụ anwụ. Ma, Chineke mere ka unu dị ndụ.+  E nwere mgbe unu na-eme otú ụwa a* si eme,+ na-emekwa ihe onye ikuku nke ụwa a dị n’aka chọrọ.+ Ikuku a bụ ụdị echiche*+ nke na-akpa ike ugbu a n’ime ndị nnupụisi.  N’eziokwu, n’oge gara aga, anyị niile mere omume otú ha si eme, n’ihi na anyị na-eme ihe ọ bụla anụ ahụ́ anyị chọrọ ka anyị mee.+ Anyị na-eme ihe ọ bụla na-atọ anụ ahụ́ anyị ụtọ, na-emekwa ihe ọ bụla batara anyị n’echiche.+ Kemgbe a mụrụ anyị, anyị bụ ndị Chineke kwesịrị iwesa iwe+ otú ndị ọzọ bụ.  Ma, n’ihi ebere Chineke na-enweghị atụ+ na otú o si hụ anyị n’anya hie nne,+  o mere ka anyị dịrị ndụ, anyị na Kraịst adịrịkwa n’otu, n’agbanyeghị na anyị dị ka ndị nwụrụ anwụ n’ihi mmehie anyị.+ N’eziokwu, ọ zọpụtala unu n’ihi amara ya.  Chineke emeekwala ka anyị dịrị ndụ, nyekwa anyị ebe anyị ga-anọ ọdụ n’eluigwe n’ihi na anyị na Kraịst Jizọs dị n’otu.+  Ihe mere Chineke ji mee ihe a bụ ka o gosi na amara ya enweghị atụ mgbe ọ ga-emere anyị ihe ọma n’oge na-abịa abịa, n’ihi na anyị na Kraịst Jizọs dị n’otu.  N’ihi amara Chineke, a zọpụtala unu, ndị nwere okwukwe.+ A zọpụtaghị unu n’ihi mbọ unu gbara, kama ọ bụ onyinye Chineke.  A zọpụtaghị unu n’ihi ọrụ ndị unu rụrụ,+ ka onye ọ bụla ghara inwe ihe ọ ga-eji na-anya isi. 10  Anyị bụ ọrụ aka Chineke. Ebe ọ bụ na anyị bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst Jizọs,+ e kere anyị+ ka anyị na-arụ ọrụ ọma, nke Chineke dị mbụ kpebie ka anyị na-arụ. 11  N’ihi ya, chetanụ na unu abụghị ndị Juu. Ndị ụmụ mmadụ biri úgwù na-akpọ unu ndị a na-ebighị úgwù. 12  Unu amaghị Kraịst n’oge ahụ. Unu na ndị Izrel anaghị emekọ ihe ọ bụla, unu esoghịkwa n’ọgbụgba ndụ Chineke ji kwe nkwa.+ Unu bi n’ụwa, ma unu enweghị olileanya, unu amaghịkwa Chineke.+ 13  Ma ugbu a, ebe unu bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst Jizọs, unu ndị na-amabughị Chineke, abịala mara ya n’ihi ọbara Kraịst. 14  N’ihi na Kraịst emeela ka anyị dịrị n’udo,+ meekwa ka ìgwè abụọ ahụ bụrụ otu,+ kwatuokwa mgbidi kewara ha.+ 15  O mechara mee ka ha bụrụ otu ìgwe,+ ha adịrịkwa n’udo. N’eziokwu, ìgwè abụọ ahụ bụcha ndị na-eso ụzọ ya. N’ihi ahụ́ ya o ji chụọ àjà, o mere ka a kwụsị ịna-edebe Iwu Mosis. Ọ bụ Iwu a mere ka ìgwè abụọ ahụ dịrị n’iro. 16  N’ihi ọnwụ ọ nwụrụ n’osisi ịta ahụhụ,*+ o mekwara ka Chineke na ìgwè abụọ ahụ dịrị n’ezigbo mma, ka ha nwee ike ịbụ otu ahụ́ maka na o jirila onwe ya mee ka ha ghara ịbụkwa ndị iro.+ 17  Ọ bịakwara zisaara unu ndị na-amaghị Chineke ozi ọma nke udo, zisaakwara ndị ma ya. 18  N’ihi na àjà o ji ndụ ya chụọ emeela ka anyị niile nọ n’ìgwè abụọ a nwee ike ịna-abịa Nna anyị nke eluigwe nso maka na ọ na-enye anyị niile mmụọ nsọ. 19  N’ihi ya, unu abụghịzi ndị mbịarambịa na ndị mba ọzọ,+ kama unu na ndị nsọ bụ ụmụ amaala,+ unu sokwa n’ezinụlọ Chineke.+ 20  A rụkwasịkwara unu n’elu ntọala, nke bụ́ ndịozi na ndị amụma,+ ebe Kraịst Jizọs bụ nkume ji ụlọ e ji tọọ ntọala.+ 21  E jikọkwara akụkụ ụlọ ahụ niile ọnụ. Ebe ọ bụ na ụlọ ahụ na Kraịst dị n’otu,+ ọ na-aghọrọ Jehova* ụlọ nsọ.+ 22  Ebe ọ bụ na unu na Kraịst dịkwa n’otu, Chineke emeela ka unu na ndị ọzọ bụrụ ụlọ o bi, n’ihi na mmụọ ya dị ebe ahụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ndị oge a.” Gụọ Nkọwa Okwu, “Oge a.”
Na Grik, “mmụọ.”
Gụọ A5.