Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Efesọs 4:1-32
4 N’ihi ya, mụnwa a tụrụ mkpọrọ+ maka Onyenwe anyị na-arịọ unu ka unu na-eje ije otú kwesịrị+ òkù ahụ a kpọrọ unu.
2 Dịrịnụ umeala n’obi.+ Na-adịnụ nwayọọ mgbe niile. Na-enwenụ ndidi.+ Na-edirinụ ibe unu ihe n’ihi na unu hụrụ ha n’anya.+
3 Unu na ibe unu dịrị n’udo, na-agbasikwanụ mbọ ike ka unu na-adị n’otu otú mmụọ nsọ mere ka unu dịrị.+
4 E nwere otu ahụ́,+ nweekwa otu mmụọ nsọ,+ otú ahụ e nwere otu olileanya+ a kpọrọ unu ka unu nwee.
5 E nwekwara otu Onyenwe anyị,+ otu okwukwe, otu baptizim,
6 otu Chineke na Nna mmadụ niile, onye bụ́ onyeisi mmadụ niile na onye na-esi n’aka mmadụ niile arụ ọrụ, na-ejikwa ike ya arụ ọrụ n’ime mmadụ niile.
7 Chineke meere onye ọ bụla n’ime anyị amara. Ọ bụ ya mere Kraịst ji nye anyị niile onyinye dị iche iche n’efu.+
8 N’ihi na Akwụkwọ Nsọ sịrị: “Mgbe ọ rịgooro n’elu, ọ kpọọrọ ụmụ nwoke a dọọrọ n’agha, jiri ha nye onyinye.”+
9 Ma gịnị ka okwu ahụ bụ́ “ọ rịgooro” pụtara? Ọ pụtara na e nwere mgbe ọ rịdatara n’ụwa.
10 Onye ahụ rịdatara n’ụwa bụkwa ya rịgooro+ ebe dị elu karịa eluigwe niile,+ ka o wee mezuo ihe niile.
11 O nyere ụfọdụ ka ha bụrụ ndịozi,+ nye ụfọdụ ka ha bụrụ ndị amụma,+ nye ụfọdụ ka ha bụrụ ndị na-ezisa ozi ọma,+ nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị ọzụzụ atụrụ na ndị na-akụzi ihe,+
12 ka ha na-agbazi* ndị nsọ, na-eje ozi, na-emekwa ka ahụ́ Kraịst sie ike.*+
13 Ha ga na-eme ihe ndị a ka anyị niile kwere otu ihe, marakwa Ọkpara Chineke nke ọma. Anyị ga-esi otú ahụ bụrụ ndị dimkpa,+ tozuokwa okè ka Kraịst.
14 N’ihi ya, anyị ekwesịghịzi ịbụ ụmụaka, maka na ọ bụrụ na mmadụ ekwere ihe na-abụghị eziokwu ndị aghụghọ na-akụzi,+ onye ahụ yiri ụgbọ dị n’oké osimiri nke ifufe na ebili mmiri na-ebugharị.
15 Kama ka anyị na-ekwu eziokwu, ka ịhụnanya mee ka anyị tozuo etozuo n’ụzọ niile, na-ebikwa ndụ otú Kraịst bụ́ onyeisi anyị biri.+
16 E si n’aka ya jikọọ ahụ́+ niile ọnụ nke ọma, ihe nke ọ bụla dị n’ahụ́ na-enyekwara ibe ya aka ịrụ ọrụ ya otú ga-abara ahụ́ niile uru. Ọ bụrụ na ihe nke ọ bụla dị n’ahụ́ na-arụ ọrụ ya nke ọma, ahụ́ ga na-eto eto, gbasiekwa ike n’ihi na ihe nke ọ bụla dị n’ahụ́ hụrụ ibe ya n’anya.+
17 N’ihi ya, ihe m ji aha Onyenwe anyị na-agwa unu ma na-agba unu ume bụ ka unu kwụsị ịna-eje ije otú ndị mba ọzọ na-eje,+ n’ihi na ha na-ebi ndụ otú echiche ha na-abaghị uru na-agwa ha.+
18 Uche ha gbara ọchịchịrị, ha enweghịkwa olileanya ịdị ndụ Chineke ga-eme ka anyị dịrị, n’ihi na ha amaghị ihe, ihe anaghịkwa emetụ ha n’obi.*
19 Ebe ọ bụ na mmehie ha anaghịzi ewute ha, ha wepụtara onwe ha na-eme ihe ọjọọ n’asọghị anya,*+ jirikwa anyaukwu na-eme ụdị omume niile na-adịghị ọcha.
20 Ma unu ma na Kraịst adịghị otú ahụ,
21 ebe ọ bụ na unu nụrụ ihe o kwuru, a kụzikwaara unu eziokwu ọ kụziri.
22 A kụziiri unu ka unu yipụ àgwà* ochie unu+ n’ihi na ha rụrụ arụ, ọ bụkwa ọchịchọ unu duhiere unu.+
23 Unu kwesịkwara ịna-eme ka otú unu si eche echiche dị ọhụrụ,*+
24 kwesịkwa iyiri àgwà* ọhụrụ+ nke Chineke chọrọ. Àgwà ọhụrụ a pụtara ezi omume na ịkwụsi ike n’ihe ziri ezi.
25 N’ihi ya, ebe unu hapụrụla aghụghọ, ka onye ọ bụla n’ime unu na-agwa onye agbata obi ya eziokwu,+ n’ihi na anyị bụ akụkụ dị iche iche nke otu ahụ́.+
26 Weenụ iwe, ma unu emehiela.+ Unu anọkwala na-ewe iwe ruo mgbe anyanwụ dara.+
27 Unu enyekwala Ekwensu ohere.+
28 Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi. Kama, ka ọ na-arụsi ọrụ ike, jiri aka ya na-arụ ọrụ dị mma,+ ka o wee nwee ihe ọ ga-enye onye nọ ná mkpa.+
29 Ka okwu rere ure ghara isi unu n’ọnụ pụta,+ kama, na-ekwunụ naanị okwu dị mma n’oge dabara adaba, nke ga-abara ndị nụrụ ya uru, meekwa ka okwukwe ha sikwuo ike.+
30 Unu adịkwala na-eme ihe ga-ewute mmụọ nsọ Chineke.+ Ọ bụ ya ka e ji kaa unu akara+ maka ụbọchị a ga-eji ihe mgbapụta gbapụta unu.+
31 Kwụsịnụ inwe ụdị obi ilu+ ọ bụla, iwe, ọnụma, iti mkpu, ịkparị mmadụ,+ na ihe ọjọọ niile.+
32 Ma na-enwerenụ ibe unu obiọma, na-enwekwanụ obi ebere.+ Na-agbagharanụ ibe unu kpamkpam dị ka Chineke sikwa n’aka Kraịst gbaghara unu kpamkpam.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “na-azụ.”
^ Na Grik, “na-ewuli ahụ́ nke Kraịst elu.” Ahụ́ Kraịst a na-ekwu bụ ọgbakọ ya.
^ Na Grik, “obi ha anaghịkwa arụ ọrụ.”
^ Ma ọ bụ “ime ihe ọjọọ n’emeghị ihere.” Grik, a·sel′gei·a. Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Na Grik, “mmadụ.”
^ Ma ọ bụ “ime ka ike nke na-eduzi uche unu dị ọhụrụ.” Na Grik, “ka unu dị ọhụrụ na mmụọ nke uche unu.”
^ Na Grik, “mmadụ.”