Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Filipaị 3:1-21

  • Ndị na-atụkwasịghị obi n’anụ ahụ́ (1-11)

    • Iwere ihe niile ka ihe na-abaghị uru n’ihi Kraịst (7-9)

  • Ịgbalịsi ike inweta ihe ndị na-abịa n’ihu (12-21)

    • Ụmụ amaala eluigwe (20)

3  N’ikpeazụ, ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ maka na unu na Onyenwe anyị dị n’otu.+ Idetara unu ihe ndị m detabuuru unu n’akwụkwọ ozi abụrụghị m nsogbu, kama m na-edetara ya unu ka unu ghara ịba ná nsogbu.  Kpacharanụ anya maka ndị dị ka nkịta. Kpacharanụ anya maka ndị na-emerụ ndị ọzọ ahụ́. Kpacharanụ anya maka ndị na-ebepụ ahụ́.*+  N’ihi na ọ bụ anyị bụ ndị e biri ezigbo úgwù,+ anyị ndị mmụọ Chineke mere ka anyị na-eje ozi dị nsọ, ndị ji Kraịst Jizọs anya isi,+ ndị na-atụkwasịghịkwa obi n’anụ ahụ́,  n’agbanyeghị na mụnwa nwere ihe mere m ga-eji tụkwasị obi n’anụ ahụ́, ma a sị na e nwere onye nwere ihe mere ọ ga-eji tụkwasị obi na ya. Ọ bụrụ na e nwere onye ọzọ chere na ya nwere ihe mere ọ ga-eji tụkwasị obi n’anụ ahụ́, mụnwa nwere karịa ya:  E biri m úgwù n’ụbọchị nke asatọ.+ Abụ m onye Izrel. Esi m n’ebo Benjamin. Abụ m onye Hibru, onye ndị Hibru mụrụ.+ A bịa n’idebe iwu, abụ m onye Farisii.+  A bịa n’ịnụ ọkụ n’obi, m kpagburu ọgbakọ.+ A bịa n’ime ezi omume otú iwu kwuru, e nweghị ihe a ga-eji taa m ụta.  Ma, ihe niile m webuuru ka nnukwu ihe, m weziiri ha ka ihe na-abaghị uru* n’ihi Kraịst.+  N’eziokwu, m wekwaara ihe niile ka ihe na-abaghị uru n’ihi otú ihe m mụtara banyere Kraịst Jizọs Onyenwe m si baara m ezigbo uru. Ahapụla m ihe niile n’ihi Kraịst, m wekwaara ha ka ihe e kpofuru ekpofu,* ka m wee rite uru dị n’iso ụzọ ya,  ka mụ na ya wee dịrị n’otu. Ọ bụghị na m na-asị na m bụ onye ezi omume maka na m na-edebe Iwu.* Kama ọ bụ maka na m nwere okwukwe na Kraịst+ mere e ji were m ka onye ezi omume.+ N’eziokwu, Chineke weere ndị nwere okwukwe ka ndị ezi omume.+ 10  Ihe m bu n’obi bụ ka m mata ya, matakwa ike ahụ nke mere ka o bilite n’ọnwụ+ nakwa ka m taa ahụhụ otú ọ tara+ ma kweta ịnwụ ụdị ọnwụ ọ nwụrụ,+ 11  ka m mara ma è nwere otú m ga-esi soro ná ndị a ga-ebu ụzọ kpọlite n’ọnwụ.+ 12  Ọ bụghị na mụ enwetala ihe m na-atụ anya ya ma ọ bụ na e meela ka m zuo okè, kama m na-agbalịsi ike+ ka m mara ma m̀ ga-enweta ihe ahụ mere Kraịst Jizọs ji họrọ m.+ 13  Ụmụnna m, ewerebeghị m onwe m ka onye nwetarala ya. Ma e nwere otu ihe m na-eme: Ana m echefu ihe ndị garala aga,*+ na-agbalịsi ike ka m nweta ihe ndị na-abịa n’ihu.+ 14  Ana m agbasi mbọ ike ka m nweta ihe m na-atụ anya ya, nke bụ́ ịdị ndụ n’eluigwe.+ Ọ bụ ya bụ ụgwọ ọrụ+ Chineke ga-enye ndị o si n’aka Kraịst Jizọs kpọọ. 15  N’ihi ya, ka anyị niile ndị tozuru etozu+ na-eche echiche otú a. Ma, ọ bụrụ na unu anaghị eche echiche otú m kwuru, Chineke ga-enyere unu aka ka unu chewe echiche otú ahụ. 16  Ma, otú ọ bụla anyị merurula nke ọma, ka anyị si otú ahụ mere nke ọma na-aga. 17  Ụmụnna m, mewenụ ka m,+ lekwasịkwanụ anya ná ndị na-ebi ndụ otú unu hụrụ anyị si ebi. 18  N’ihi na e nwere ọtụtụ ndị m na-agwakarị unu banyere ha. Ma ugbu a, eji m anya mmiri na-agwa unu banyere ha maka na ha na-eleda ọnwụ Kraịst nwụrụ n’osisi ịta ahụhụ* anya. 19  Ihe na-echere ha bụ mbibi. Chi ha bụ afọ ha. Ihe ha ji anya isi bụ ihe kwesịrị ịna-eme ha ihere, uche ha dịkwa n’ihe ndị dị n’ụwa.+ 20  Ma anyị bụ ụmụ amaala+ eluigwe,+ anyị na-echeresikwa onye nzọpụta nọ n’ebe ahụ ike, bụ́ Onyenwe anyị Jizọs Kraịst,+ 21  onye ga-eji ike dị ukwuu o nwere, nke o ji eme ka ihe niile dịrị n’okpuru ya,+ gbanwee ahụ́ anyị na-adịghị ike ka ọ dị ka ahụ́ ya dị ebube.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, ndị na-agwa ndị mmadụ ka ha bie úgwù.
O nwere ike ịbụ, “m ji obi m hapụ ha niile.”
Ma ọ bụ “unyi; ahịhịa.”
Ya bụ, Iwu Mosis.
Na Grik, “dị n’azụ.”