Ndị Ikpe 1:1-36

  • Juda na Simiọn meriri n’agha (1-20)

  • A chụpụghị ndị Jebus bi na Jeruselem (21)

  • Ezinụlọ Josef weghaara Betel (22-26)

  • A chụpụchaghị ndị Kenan (27-36)

1  Mgbe Joshụa nwụchara,+ ndị Izrel jụrụ Jehova ase, sị:+ “Ònye n’ime anyị ga-ebu ụzọ gaa lụso ndị Kenan agha?”  Jehova zara, sị: “Ọ bụ ebo Juda ga-aga.+ Lee, m na-enyefe* ala ahụ n’aka ha.”  Ebo Juda wee sị ebo Simiọn ụmụnne ha: “Soro anyị gaa n’ala e kenyere anyị+ ka anyị lụso ndị Kenan agha. Anyị ga-esokwa unu gaa n’ala e kenyere unu.” Ebo Simiọn wee soro ha gaa.  Mgbe ebo Juda gara, Jehova nyefere ndị Kenan na ndị Perizaịt n’aka ha.+ Ha wee merie puku mmadụ iri (10,000) n’ebe a na-akpọ Bizek.  Ha hụrụ Adonaị-bizek na Bizek. Ha wee lụso ya agha ma merie ndị Kenan+ na ndị Perizaịt.+  Mgbe Adonaị-bizek gbara ọsọ, ha chụwara ya, jide ya ma gbupụsịa ya mkpịsị aka ukwu ya na mkpịsị ụkwụ ukwu ya.  Adonaị-bizek wee sị: “E nwere ndị eze iri asaa e gbupụsịrị mkpịsị aka ukwu ha na mkpịsị ụkwụ ukwu ha, ndị na-atụtụ nri n’okpuru tebụl m. Chineke akwụọla m ụgwọ ihe m mere.” Ha mechara kpọta ya na Jeruselem,+ ya anwụọ n’ebe ahụ.  Ndị Juda lụsokwara Jeruselem agha+ ma weghara ya. Ha ji mma agha gbuo ndị bi na ya, gbaakwa obodo ahụ ọkụ.  Mgbe e mechara, ndị Juda gara lụso ndị Kenan bi n’ebe bụ́ ugwu ugwu na ndị bi na Negeb* na Shefila*+ agha. 10  Ebo Juda wee gaa lụso ndị Kenan bi na Hebrọn agha (ihe a na-akpọbu Hebrọn bụ Kiriat-aba). Ha bibiri Shishaị, Ahaịman, na Talmaị.+ 11  Ha wee si n’ebe ahụ gaa lụso ndị bi na Diba+ agha. (Ihe a na-akpọbu Diba bụ Kiriat-sifa.)+ 12  Keleb+ wee sị: “Onye ọ bụla lụsoro Kiriat-sifa agha ma weghara ya, m ga-akpọnye ya Aksa nwa m nwaanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.”+ 13  Ọtniel+ nwa Kinaz,+ bụ́ nwanne Keleb nke Keleb tọrọ, weghaara ya. N’ihi ya, Keleb kpọnyere ya Aksa nwa ya nwaanyị ka ọ bụrụ nwunye ya. 14  Mgbe Aksa na-ala ebe di ya, ọ gwara di ya ka ọ rịọta nna ya ala. Aksa wee si n’elu jakị ọ nọ rịtuo.* Keleb jụrụ ya, sị: “Gịnị ka ị chọrọ?” 15  Ya asị ya: “Biko, nye m onyinye gosiri na ị gọziela m, n’ihi na ọ bụ otu ibé ala nke dị n’ebe ndịda* ka i nyere m. Biko, nyekwuo m Gọlọt-meyim.”* Keleb wee nye ya Gọlọt Mgbago na Gọlọt Ndịda. 16  Ụmụ nna nwunye Mosis,+ onye Kenaịt,+ na ndị Juda si n’obodo nkwụ+ pụta gawa n’ala ịkpa Juda nke dị n’ebe ndịda Erad.+ Ha gara ebe ahụ, ha na ndị bi n’ebe ahụ ebikọta.+ 17  Ma ebo Juda na ebo Simiọn ụmụnne ha gawara agha. Ha wee lụso ndị Kenan bi na Zifat agha ma bibie obodo ahụ kpamkpam.+ Ha wee kpọọ obodo ahụ Họma.*+ 18  Ebo Juda weghaziiri Gaza,+ Ashkelọn,+ na Ekrọn+ nakwa ala ndị gbara ha gburugburu. 19  Jehova nọnyeere ebo Juda, ha wee weghara ebe bụ́ ugwu ugwu, ma ha enweghị ike ịchụpụ ndị bi n’ebe ndagwurugwu, n’ihi na ha nwere ụgbọ ịnyịnya agha ndị a rụnyere ogologo mma n’ụkwụ ha.*+ 20  Ha nyere Keleb Hebrọn, otú Mosis kwere ná nkwa.+ O wee chụpụ ụmụ Anak+ atọ n’ebe ahụ. 21  Ma, ndị Benjamin achụpụghị ndị Jebus bi na Jeruselem. N’ihi ya, ndị Jebus na ndị Benjamin bi na Jeruselem ruo taa.+ 22  N’oge a, ezinụlọ Josef+ gara lụso Betel agha, Jehova nọnyekwaara ha.+ 23  Ezinụlọ Josef zipụrụ ụfọdụ ndị ka ha gaa nyopụta otú Betel dị (ihe a na-akpọbu obodo ahụ bụ Lọz).+ 24  Ndị nnyopụta ahụ hụrụ otu nwoke ka o si n’obodo ahụ na-apụta. Ha wee sị ya: “Biko, gosi anyị ụzọ e si abanye n’obodo a, anyị ga-emekwara gị ebere.”* 25  Nwoke ahụ wee gosi ha ụzọ e si abanye n’obodo ahụ, ha wee jiri mma agha gbuo ndị bi n’obodo ahụ. Ma ha hapụrụ nwoke ahụ na ezinụlọ ya niile.+ 26  Nwoke ahụ gara n’ala ndị Het rụọ otu obodo ma kpọọ ya Lọz. Ọ bụ aha obodo ahụ ruo taa. 27  Ebo Manase ewegharaghị Bet-shian na ime obodo ndị dị ya nso,* nakwa Teanak+ na ime obodo ndị dị ya nso. Ha achụpụghịkwa ndị bi na Dọọ na ime obodo ndị dị ya nso, ndị bi n’Ibliam na ime obodo ndị dị ya nso, nakwa ndị bi na Megido na ime obodo ndị dị ya nso.+ Ndị Kenan gbara isi akwara biri n’ala a. 28  Mgbe ndị Izrel sikwuru ike, ha manyere ndị Kenan ka ha rụwara ha ọrụ,+ ma ha achụpụchaghị ha.+ 29  Ebo Ifrem achụpụghịkwa ndị Kenan bi na Giza. Ha na ndị Kenan wee bikọta na Giza.+ 30  Ebo Zebulọn achụpụghị ndị bi na Kitrọn na ndị bi na Nehalọl.+ Ha na ndị Kenan wee bikọta. Ha manyekwara ndị Kenan ka ha na-arụrụ ha ọrụ.+ 31  Ebo Asha achụpụghị ndị bi n’Ako na ndị bi na Saịdọn,+ Alab, Akzib,+ Helba, Efik,+ na Rihọb.+ 32  Ebo Asha na ndị Kenan, bụ́ ndị bi n’ala ahụ, wee bikọta, n’ihi na ha achụpụghị ndị Kenan ahụ. 33  Ebo Naftalaị achụpụghị ndị bi na Bet-shimesh na ndị bi na Bet-enat.+ Kama ha na ndị Kenan, bụ́ ndị bi n’ala ahụ, bikọtara.+ Ha manyekwara ndị bi na Bet-shimesh na Bet-enat ka ha na-arụrụ ha ọrụ. 34  Ndị Amọraịt ekweghị ka ụmụ Dan gbadata na ndagwurugwu, nke mere ka ụmụ Dan birizie n’ebe bụ́ ugwu ugwu.+ 35  Ndị Amọraịt wee gbaa isi akwara biri n’Ugwu Hires, Aịjalọn,+ nakwa na Shealbim.+ Ma mgbe ezinụlọ Josef sikwuru ike, ha manyere ha ka ha rụwara ha ọrụ siri ike. 36  Ala ndị Amọraịt malitere n’ụzọ e si agbago Akrabim,+ malitekwa na Sila gbagoo.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “m nyefeela.”
Ma ọ bụ “n’ebe ndịda.”
Ma ọ bụ “n’ebe ugwu.”
O nwere ike ịbụ, “Aksa wee nọrọ n’elu jakị ọ nọ kụọ aka.”
Ma ọ bụ “na Negeb.”
Gọlọt-meyim pụtara “Isi Mmiri.”
Họma pụtara “Ibibi Ihe.”
Na Hibru, “ụgbọ ịnyịnya agha ígwè.”
Na Hibru, “ga-egosi gị ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “obodo ndị gbara ya gburugburu.”