Ndị Ikpe 10:1-18

  • Ndị ikpe aha ha bụ Tola na Jeya (1-5)

  • Ndị Izrel nupụụrụ Chineke isi, mechaa chegharịa (6-16)

  • Ndị Amọn bịara ịlụso ndị Izrel agha (17, 18)

10  Mgbe Abimelek nwụrụ, Tola nwa Pua, nwa nwa Dodo, onye Ịsaka, pụtara ịzọpụta Izrel.+ O bi na Shemia, n’ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu.  O kpere Izrel ikpe afọ iri abụọ na atọ. O wee nwụọ, e lie ya na Shemia.  Onye nọchiri ya bụ Jeya onye Gilied. Ọ pụtara kpee Izrel ikpe afọ iri abụọ na abụọ.  Ọ mụrụ ụmụ nwoke iri atọ ndị na-agba jakị iri atọ. Ha nwekwara obodo iri atọ. A na-akpọ obodo ndị ahụ Havọt-jeya+ ruo taa. Ha dị na Gilied.  Jeya mechara nwụọ, e wee lie ya na Kemọn.  Ndị Izrel malitere ọzọ ime ihe dị njọ n’anya Jehova.+ Ha malitekwara ife Bel,+ Ashtọret, chi ndị Eram,* chi ndị Saịdọn, chi ndị Moab,+ chi ndị Amọn,+ na chi ndị Filistia.+ Ha hapụrụ Jehova, ha efeghịkwa ya.  Jehova wee wesa ndị Izrel ezigbo iwe. O nyefere ha n’aka* ndị Filistia na ndị Amọn.+  Ha wee chie ndị Izrel ọnụ n’ala, megbuokwa ha nke ukwuu n’afọ ahụ. Ha nọ na-emegbu ndị Izrel niile bi n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan ruo afọ iri na asatọ, ya bụ, ndị bi n’ala bụ́bu ala ndị Amọraịt nke dị na Gilied.  Ndị Amọn na-agafekwa Osimiri Jọdan lụso ebo Juda, Benjamin, na Ifrem agha. Izrel wee na-ata nnukwu ahụhụ. 10  Ndị Izrel wee rịọ Jehova ka o nyere ha aka,+ sị: “Anyị emehiela gị n’ihi na anyị hapụrụ gị, Chineke anyị, fewe Bel.”+ 11  Ma Jehova sịrị ndị Izrel: “Ọ̀ bụ na anapụtaghị m unu n’aka ndị Ijipt+ nakwa n’aka ndị Amọraịt,+ ndị Amọn,+ ndị Filistia, 12  ndị Saịdọn, Amalek, na Midian mgbe ha kpagburu unu? Mgbe unu besaara m ákwá, m napụtara unu n’aka ha. 13  Ma unu hapụrụ m fewe chi dị iche iche.+ Ọ bụ ya mere na agaghị m azọpụta unu ọzọ.+ 14  Gakwurunụ chi ndị ahụ unu họọrọ, rịọkwanụ ha ka ha nyere unu aka.+ Ka ha zọpụta unu ugbu a unu na-ata ahụhụ.”+ 15  Ma ndị Izrel sịrị Jehova: “Anyị emehiela. Mee anyị ihe ọ bụla dị gị mma. Ma, biko, zọpụta anyị taa.” 16  Ha wee wepụsịa chi ndị mba ọzọ ha na-efe ma fewe Jehova,+ nke mere na ahụhụ Izrel na-ata ekweghịzi ya* odidi.+ 17  Ka oge na-aga, ndị Amọn+ kpọkọtara ndị agha ha, ha wee maa ụlọikwuu na Gilied. Ndị Izrel wee zukọta maa ụlọikwuu na Mizpa. 18  Ndị Gilied na ndị bụ́ ndị isi na Gilied gwara ibe ha, sị: “Ònye ga-edu anyị gaa lụso ndị Amọn+ agha? Ka onye ahụ bụrụ onyeisi ndị niile bi na Gilied.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Siria.”
Na Hibru, “o resịkwara ha.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”