Ndị Ikpe 11:1-40

  • A chụpụrụ Jefta, e mechaa ya abụrụ onyeisi (1-11)

  • Jefta zigaara eze ndị Amọn ozi (12-28)

  • Nkwa Jefta kwere; ada ya nwaanyị (29-40)

    • Ada Jefta alụghị di (38-40)

11  Jefta+ onye Gilied bụ onye agha dị ike. Ọ bụ nwaanyị akwụna mụrụ ya. Nna Jefta bụ Gilied.  Nwunye Gilied mụtakwaara ya ụmụ nwoke ndị ọzọ. Mgbe ụmụ nwoke ndị nwunye ya mụrụ toro, ha chụpụrụ Jefta, sị ya: “Ị gaghị eketa ihe ọ bụla n’ezinụlọ nna anyị n’ihi na ọ bụ nwaanyị ọzọ mụrụ gị.”  Jefta wee si n’ebe ụmụnne ya nọ gbaa ọsọ ma jee biri na Tọb. Ndị na-enweghị ihe ha na-arụ gakwuuru Jefta ma na-eso ya.  Mgbe obere oge gachara, ndị Amọn lụsoro Izrel agha.+  Mgbe ndị Amọn lụsoro Izrel agha, ndị okenye Gilied gara ozugbo ka ha si na Tọb kpọghachi Jefta.  Ha sịrị Jefta: “Bịa bụrụ ọchịagha anyị ka anyị nwee ike ịlụso ndị Amọn agha.”  Ma Jefta sịrị ndị okenye Gilied: “Ọ̀ bụ na ọ bụghị unu kpọrọ m asị nke ukwuu nke na unu chụpụrụ m n’ụlọ nna m?+ Gịnị mere unu ji bịakwute m ugbu a unu nọ ná nsogbu?”  Ndị okenye Gilied wee sị Jefta: “Ọ bụ ya mere anyị ji bịakwute gị ugbu a. Ọ bụrụ na i soro anyị gaa lụso ndị Amọn agha, ị ga-abụ onyeisi ndị niile bi na Gilied.”+  Jefta wee gwa ndị okenye Gilied, sị: “Ọ bụrụ na unu akpọlata m ka m gaa lụso ndị Amọn agha, Jehova enyere m aka merie ha, m ga-abụ onyeisi unu.” 10  Ndị okenye Gilied sịrị Jefta: “Ka Jehova bụrụ onye akaebe* ma ọ bụrụ na anyị emeghị ihe i kwuru.” 11  Jefta wee soro ndị okenye Gilied laa. Ndị obodo ha wee mee ya onyeisi ha na ọchịagha ha. Jefta nọkwa na Mizpa+ kwughachi ihe niile o kwuru n’ihu Jehova. 12  Jefta zigaziiri eze ndị Amọn+ ndị ozi, sị: “Gịnị ka m mere gị mere i ji bịa ịlụso m agha n’ala m?” 13  Eze ndị Amọn wee gwa ndị ozi Jefta, sị: “Ọ bụ maka na Izrel naara m ala m mgbe ha si n’Ijipt pụta,+ malite ná mmiri Anọn+ ruo ná mmiri Jabọk, ruokwa n’Osimiri Jọdan.+ Ugbu a, nyeghachi m ya n’udo.” 14  Ma Jefta zighachiiri eze ndị Amọn ndị ozi 15  ka ha sị ya: “Ihe a bụ ihe Jefta kwuru: ‘Izrel ewereghị ala ndị Moab+ na ala ndị Amọn,+ 16  n’ihi na mgbe Izrel si n’Ijipt pụta, ha si n’ala ịkpa gafere garuo n’Oké Osimiri Uhie+ ma rute Kedesh.+ 17  Izrel wee zigara eze Ịdọm+ ndị ozi, sị ya: “Biko, ka anyị si n’ala gị gafere,” ma eze Ịdọm egeghị ha ntị. Ha zigakwaara eze Moab+ ozi, ma o kweghị. Izrel wee nọrọzie na Kedesh.+ 18  Mgbe ha si n’ala ịkpa na-aga, ha abanyeghị n’ala Ịdọm+ nakwa n’ala Moab. Ha si n’ebe ọwụwa anyanwụ Moab+ gafere ma maa ụlọikwuu n’ofe mmiri Anọn. Ha abanyeghị n’ala Moab, maka na mmiri Anọn bụ ókè nke ala Moab.+ 19  “Mgbe e mechara, Izrel zigaara Saịhọn eze ndị Amọraịt, onye na-achị Heshbọn, ndị ozi. Izrel sịrị ya: “Biko, ka anyị si n’ala gị gafere gaa n’ala anyị.”+ 20  Ma obi esighị Saịhọn ike ka Izrel si n’ala ya gafere. N’ihi ya, Saịhọn kpọkọtara ndị ya niile ma maa ụlọikwuu na Jehaz wee lụso Izrel agha.+ 21  Jehova bụ́ Chineke Izrel wee nyefee Saịhọn na ndị ya niile n’aka Izrel, ha wee merie ha. Izrel weghakwaara ala ndị Amọraịt niile, bụ́ ndị bi n’ala ahụ.+ 22  Ha wee weghara ala ndị Amọraịt niile malite ná mmiri Anọn ruo ná mmiri Jabọk, malitekwa n’ala ịkpa ruo n’Osimiri Jọdan.+ 23  “‘Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke Izrel chụpụụrụ ndị ya Izrel ndị Amọraịt.+ Ị̀ ga-abịazi chụpụ ha ugbu a? 24  Ọ̀ bụ na ọ bụghị ala chi gị Kimọsh+ nyere gị ka ị na-eweghara? N’ihi ya, ọ bụ onye ọ bụla Jehova Chineke anyị chụpụụrụ anyị ka anyị ga-achụpụ.+ 25  Ị̀ ka Belak+ nwa Zipọ, bụ́ eze Moab? È nwere mgbe o sesara ndị Izrel okwu, ka è nwere mgbe ọ lụsoro ha agha? 26  Mgbe Izrel bi na Heshbọn na n’ime obodo ndị dị ya nso*+ nakwa n’Aroa na n’ime obodo ndị dị ya nso nakwa n’obodo niile dị n’akụkụ mmiri Anọn ruo narị afọ atọ (300), gịnị mere na ị napụghị ha ya n’oge ahụ?+ 27  E nweghị ihe ọjọọ m mere gị. Ọ dịghịkwa mma na ị na-alụso m agha. Taa, ka Jehova bụ́ Onyeikpe+ kpee ikpe ndị Izrel na ndị Amọn.’” 28  Ma eze ndị Amọn egeghị ntị n’ozi Jefta zigaara ya. 29  Jehova wee wụkwasị Jefta mmụọ ya.+ Jefta wee si na Gilied nakwa na Manase gafere gaa Mizpa* nke Gilied.+ O sikwa na Mizpa nke Gilied na-aga ka ọ gakwuru ndị Amọn. 30  Jefta wee kwe Jehova nkwa,+ sị: “Ọ bụrụ na i nyefee ndị Amọn n’aka m, 31  onye ọ bụla si n’ọnụ ụzọ ụlọ m pụta izute m mgbe m ga-esi n’ebe ndị Amọn nọ lọta n’udo ga-abụ nke gị, Jehova.+ M ga-achụ onye ahụ n’àjà ka àjà a na-esu ọkụ.”+ 32  Jefta wee gaa ịlụso ndị Amọn agha. Jehova nyefere ha n’aka ya. 33  Ọ sụrụ ha akwụ malite n’Aroa ruo na Minit, ya bụ, obodo iri abụọ, ruokwa Ebel-keramin. Ndị Izrel si otú a merie ndị Amọn. 34  N’ikpeazụ, Jefta lọtara n’ụlọ ya dị na Mizpa.+ Ma lee, ada ya kụụrụ obere ịgbà, gbara egwú na-apụta izute ya. Ọ bụ ya bụ naanị nwa o nwere. E wepụ ya, o nweghị nwa nwoke ma ọ bụ nwa nwaanyị ọzọ. 35  Mgbe Jefta hụrụ ya, ọ dọwara uwe ya ma sị: “Ewoo, ada m! I mewaala m obi, n’ihi na ọ bụ gị ka m chụpụrụ. Emegheela m ọnụ m kwe Jehova nkwa, enweghịkwa m ike ịgbanwe ihe m kwuru.”+ 36  Ma ọ sịrị ya: “Nna m, ọ bụrụ na i megheela ọnụ gị kwe Jehova nkwa, mee m ihe i kwere ya ná nkwa,+ ebe ọ bụ na Jehova abọọrọla gị ọbọ n’isi ndị iro gị, bụ́ ndị Amọn.” 37  Ọ gwaziri nna ya, sị: “Ka e meere m ihe a: Ka a hapụ m ka m gaa n’ugwu nọọ ọnwa abụọ, ka mụ na ụmụ agbọghọ ibe m bee ákwá maka na agaghị m alụ di.” 38  Jefta wee sị: “Gawa.” O wee hapụ ya ka ọ gaa nọọ ọnwa abụọ n’ugwu. Ya na ụmụ agbọghọ ibe ya wee gaa n’ugwu ka ha bee ákwá maka na ọ gaghị alụ di. 39  Mgbe ọnwa abụọ gachara, ọ lọghachikwutere nna ya. Nna ya wee mezuo nkwa o kwere n’isi ya.+ Ya na nwoke ọ bụla enweghị mmekọahụ. O wee bụrụ omenala n’Izrel na 40  si n’afọ ruo n’afọ, ụmụ agbọghọ Izrel na-aga aja ada Jefta onye Gilied mma, ụbọchị anọ n’afọ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “onye na-ege ntị.”
Ma ọ bụ “obodo ndị gbara ya gburugburu.”
Na Hibru, “Mizpe.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede Mizpa.