Ndị Ikpe 12:1-15

  • Jefta na ndị Ifrem lụrụ agha (1-7)

    • A gwara ndị Ifrem ka ha kpọọ “Shibolet” (6)

  • Ndị ikpe aha ha bụ Ibzan, Ịlọn, na Abdọn (8-15)

12  E wee kpọkọta ụmụ nwoke ndị Ifrem, ha wee gafee rute Zefọn* ma sị Jefta: “Gịnị mere na ị kpọghị anyị ka anyị soro gị mgbe ị na-aga ịlụso ndị Amọn agha?+ Anyị ga-agbakọta gị na ụlọ gị ọkụ.”  Ma Jefta gwara ha, sị: “Ndị Amọn sesara mụ na ndị m ezigbo okwu. M kpọrọ unu ka unu nyere m aka, ma unu azọpụtaghị m n’aka ha.  Mgbe m hụrụ na unu agaghị azọpụta m, m kpebiziri ime ihe gaara ata isi m ma gaa lụso ndị Amọn+ agha, Jehova nyefekwara ha n’aka m. Gịnịzi mere unu ji bịa ịlụso m agha taa?”  Jefta wee kpọkọta ndị Gilied+ niile ozugbo ma lụso ndị Ifrem agha. Ndị Gilied meriri ndị Ifrem, bụ́ ndị sịrị: “Unu si n’Ifrem gbapụ, unu ndị Gilied ndị nọ n’Ifrem nakwa na Manase.”  Ndị Gilied bu ndị Ifrem ụzọ ruo ebe ndị a na-eji ụkwụ agafe Osimiri Jọdan+ ma nọchie ebe ahụ. Mgbe ndị Ifrem na-achọ ịgbalaga, ha na-asị, “Ka m gafere.” Ndị Gilied na-ajụ onye ọ bụla n’ime ha, sị: “Ị̀ bụ onye Ifrem?” Ọ bụrụ na ọ sị, “Mba,”  ha asị ya: “Biko, kpọgodị Shibolet.” Ma onye ahụ na-asị: “Sibolet,” n’ihi na ọ gaghị akpọtali okwu ahụ. Ha na-ejide ya ma gbuo ya n’ebe ndị a na-eji ụkwụ agafe Osimiri Jọdan. Ndị Ifrem e gburu n’oge ahụ dị puku iri anọ na puku abụọ (42,000).  Jefta kpere Izrel ikpe ruo afọ isii. Jefta onye Gilied mechara nwụọ, e lie ya n’obodo ya nke dị na Gilied.  Onye nọchiri ya bụ Ịbzan onye Betlehem. O kpere Izrel ikpe.+  Ọ mụrụ ụmụ nwoke iri atọ na ụmụ nwaanyị iri atọ. O dupụrụ ụmụ ya ndị nwaanyị ka ha gaa lụọ ụmụ nwoke ndị na-esighị n’ọnụmara ya. Ọ lụtakwaara ụmụ ya ndị nwoke ụmụ nwaanyị iri atọ na-esighị n’ọnụmara ya. O kpere Izrel ikpe ruo afọ asaa. 10  Ịbzan wee nwụọ, e lie ya na Betlehem. 11  Onye nọchiri ya bụ Ịlọn onye Zebulọn. O kpere Izrel ikpe ruo afọ iri. 12  Ịlọn onye Zebulọn wee nwụọ, e lie ya n’Aịjalọn nke dị na Zebulọn. 13  Onye nọchiri ya bụ Abdọn nwa Hilel onye Piratọn. O kpere Izrel ikpe. 14  Ọ mụrụ ụmụ nwoke iri anọ, nweekwa ụmụ ụmụ ndị nwoke iri atọ. Onye ọ bụla n’ime ha nwere otu jakị ọ na-agba.* O kpere Izrel ikpe ruo afọ asatọ. 15  Abdọn nwa Hilel onye Piratọn wee nwụọ, e lie ya na Piratọn nke dị n’Ifrem, n’ugwu ndị Amalek.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “gafee n’ebe ugwu.”
Ma ọ bụ “Ha na-agba jakị iri asaa.”