Ndị Ikpe 14:1-20
14 Samsịn wee gbadaa Timna. Ọ hụrụ otu nwaanyị onye Filistia na Timna.
2 Mgbe ọ lọtara, ọ gwara nne ya na nna ya, sị: “E nwere otu nwaanyị Filistia m hụrụ na Timna. M chọrọ ka unu lụtara m ya.”
3 Ma nne ya na nna ya sịrị ya: “Ọ̀ bụ na i nweghị ike ịchọta nwaanyị n’ime ndị ikwu gị nakwa n’ime ndị obodo anyị niile?+ Ị̀ ga-agarịrị na nke ndị Filistia a na-ebighị úgwù lụrụ nwaanyị?” Ma Samsịn gwara nna ya, sị: “Lụtara m ya maka na ọ bụ ya dị mụ mma.”*
4 Ma nne ya na nna ya amaghị na ihe a si n’aka Jehova, n’ihi na ọ* na-achọ ohere ọ ga-eji mee ndị Filistia ihe, ebe ọ bụ ndị Filistia na-achị Izrel n’oge ahụ.+
5 Samsịn wee soro nne ya na nna ya gbadaa Timna. Mgbe o ruru n’ubi vaịn ndị dị na Timna, otu ọdụm pụtara na-agbọ ya ụja.
6 Mmụọ Jehova wee mee ka Samsịn dị ike,+ ya adọwaa ọdụm ahụ abụọ, otú mmadụ si eji aka nkịtị adọwa nwa ewu ụzọ abụọ. Ma, ọ gwaghị nne ya ma ọ bụ nna ya ihe o mere.
7 Samsịn wee gbadaa Timna ma gwa nwaanyị ahụ okwu, ihe ya ka masịkwara Samsịn.+
8 Mgbe o mechara gaghachiwa ka ọ kpọrọ nwaanyị ahụ laa,+ ọ kwụsịtụrụ ka o lee ozu ọdụm ahụ. Aṅụ bejuru n’ozu ọdụm ahụ, mmanụ aṅụ dịkwa na ya.
9 O wee kọrọ mmanụ aṅụ kọnye n’aka ya, na-aracha ya ka ọ na-aga. Mgbe ọ gakwuuru nne ya na nna ya, o nyetụrụ ha ka ha rachaa. Ma, ọ gwaghị ha na ọ bụ n’ozu ọdụm ka ọ kọtara mmanụ aṅụ ahụ.
10 Nna ya gbadara ka ọ gaa hụ nwaanyị ahụ. Samsịn kpọkwara oriri n’ebe ahụ, n’ihi na ọ bụ ihe ụmụ okorobịa na-eme.
11 Mgbe ha hụrụ ya, ha kpọtara ụmụ okorobịa iri atọ ka ha nọnyere ya.
12 Samsịn wee sị ha: “Biko, ka m tụọrọ unu otu ilu. Ọ bụrụ na unu agwa m ihe ilu a pụtara n’ime ụbọchị asaa a ga-eri oriri a ma kọwaa ya, m ga-enye unu uwe ime iri atọ e ji ákwà linin kpaa nakwa uwe elu iri atọ.
13 Ma ọ bụrụ na unu enweghị ike ịkọwa ya, unu ga-enye m uwe ime iri atọ e ji ákwà linin kpaa nakwa uwe elu iri atọ.” Ha sịrị ya: “Tụọrọ anyị ilu gị; anyị chọrọ ịnụ ya.”
14 O wee sị ha:
“Ihe a na-eri eri si n’ihe na-eri ihe pụta.
Ihe dị ụtọ sikwa n’ihe siri ike pụta.”+
Ha enweghị ike ịkọwa ilu a ruo ụbọchị atọ.
15 N’ụbọchị nke anọ, ha gwara nwunye Samsịn, sị: “Ghọgbuo di gị+ ka ọ kọwaara anyị ilu ahụ. Ma ọ́ bụghị ya, anyị ga-agba gị na ezinụlọ nna gị ọkụ. Ùnu kpọrọ anyị ebe a ka unu nara anyị ihe anyị?”
16 Nwunye Samsịn wee bewere Samsịn ákwá ma sị ya: “Ị kpọrọ m asị. Ị hụghị m n’anya.+ Ị tụụrụ ndị obodo m ilu, ma ị kọwaraghị m ya.” O wee sị ya: “Akọwaraghị m ya nne m na nna m. M̀ kwesịrị ịkọwara gị ya?”
17 Ma ọ nọ na-ebere ya ákwá ụbọchị asaa niile ha nọ na-eri oriri. N’ikpeazụ, Samsịn kọwaara ya ilu ahụ n’ụbọchị nke asaa maka na ọ nọ na-enye ya nsogbu. O wee gaa kọwaara ndị obodo ya ilu ahụ.+
18 N’ụbọchị nke asaa, tupu anyanwụ adaa, ndị obodo ahụ sịrị ya:
“Gịnị dị ụtọ karịa mmanụ aṅụ?
Gịnịkwa siri ike karịa ọdụm?”+
Ọ sịrị ha:
“A sị na unu ejighị ehi m kọọ ihe,+
Unu agaraghị akọwa ilu m.”
19 Mmụọ Jehova wee mee ka Samsịn dị ike,+ ya agaa Ashkelọn+ gbuo ụmụ nwoke iri atọ n’ime ha, chịrị uwe ha chịnye ndị kọwara ilu ahụ.+ Oké iwe nọ na-ewe ya ka ọ na-ala n’ụlọ nna ya.
20 A kpọọrọ nwunye Samsịn+ kpọnyezie otu n’ime ụmụ okorobịa ndị nọnyeere ya.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “ọ dị mma n’anya m.”
^ Ọ ga-abụ Chineke ka a na-ekwu maka ya.