Ndị Ikpe 14:1-20

  • Samsịn chọrọ ịlụ nwaanyị Filistia (1-4)

  • Mmụọ Jehova mere ka Samsịn gbuo ọdụm (5-9)

  • Ilu Samsịn tụrụ n’agbamakwụkwọ ya (10-19)

  • A kpọọrọ nwunye Samsịn kpọnye nwoke ọzọ (20)

14  Samsịn wee gbadaa Timna. Ọ hụrụ otu nwaanyị onye Filistia na Timna.  Mgbe ọ lọtara, ọ gwara nne ya na nna ya, sị: “E nwere otu nwaanyị Filistia m hụrụ na Timna. M chọrọ ka unu lụtara m ya.”  Ma nne ya na nna ya sịrị ya: “Ọ̀ bụ na i nweghị ike ịchọta nwaanyị n’ime ndị ikwu gị nakwa n’ime ndị obodo anyị niile?+ Ị̀ ga-agarịrị na nke ndị Filistia a na-ebighị úgwù lụrụ nwaanyị?” Ma Samsịn gwara nna ya, sị: “Lụtara m ya maka na ọ bụ ya dị mụ mma.”*  Ma nne ya na nna ya amaghị na ihe a si n’aka Jehova, n’ihi na ọ* na-achọ ohere ọ ga-eji mee ndị Filistia ihe, ebe ọ bụ ndị Filistia na-achị Izrel n’oge ahụ.+  Samsịn wee soro nne ya na nna ya gbadaa Timna. Mgbe o ruru n’ubi vaịn ndị dị na Timna, otu ọdụm pụtara na-agbọ ya ụja.  Mmụọ Jehova wee mee ka Samsịn dị ike,+ ya adọwaa ọdụm ahụ abụọ, otú mmadụ si eji aka nkịtị adọwa nwa ewu ụzọ abụọ. Ma, ọ gwaghị nne ya ma ọ bụ nna ya ihe o mere.  Samsịn wee gbadaa Timna ma gwa nwaanyị ahụ okwu, ihe ya ka masịkwara Samsịn.+  Mgbe o mechara gaghachiwa ka ọ kpọrọ nwaanyị ahụ laa,+ ọ kwụsịtụrụ ka o lee ozu ọdụm ahụ. Aṅụ bejuru n’ozu ọdụm ahụ, mmanụ aṅụ dịkwa na ya.  O wee kọrọ mmanụ aṅụ kọnye n’aka ya, na-aracha ya ka ọ na-aga. Mgbe ọ gakwuuru nne ya na nna ya, o nyetụrụ ha ka ha rachaa. Ma, ọ gwaghị ha na ọ bụ n’ozu ọdụm ka ọ kọtara mmanụ aṅụ ahụ. 10  Nna ya gbadara ka ọ gaa hụ nwaanyị ahụ. Samsịn kpọkwara oriri n’ebe ahụ, n’ihi na ọ bụ ihe ụmụ okorobịa na-eme. 11  Mgbe ha hụrụ ya, ha kpọtara ụmụ okorobịa iri atọ ka ha nọnyere ya. 12  Samsịn wee sị ha: “Biko, ka m tụọrọ unu otu ilu. Ọ bụrụ na unu agwa m ihe ilu a pụtara n’ime ụbọchị asaa a ga-eri oriri a ma kọwaa ya, m ga-enye unu uwe ime iri atọ e ji ákwà linin kpaa nakwa uwe elu iri atọ. 13  Ma ọ bụrụ na unu enweghị ike ịkọwa ya, unu ga-enye m uwe ime iri atọ e ji ákwà linin kpaa nakwa uwe elu iri atọ.” Ha sịrị ya: “Tụọrọ anyị ilu gị; anyị chọrọ ịnụ ya.” 14  O wee sị ha: “Ihe a na-eri eri si n’ihe na-eri ihe pụta. Ihe dị ụtọ sikwa n’ihe siri ike pụta.”+ Ha enweghị ike ịkọwa ilu a ruo ụbọchị atọ. 15  N’ụbọchị nke anọ, ha gwara nwunye Samsịn, sị: “Ghọgbuo di gị+ ka ọ kọwaara anyị ilu ahụ. Ma ọ́ bụghị ya, anyị ga-agba gị na ezinụlọ nna gị ọkụ. Ùnu kpọrọ anyị ebe a ka unu nara anyị ihe anyị?” 16  Nwunye Samsịn wee bewere Samsịn ákwá ma sị ya: “Ị kpọrọ m asị. Ị hụghị m n’anya.+ Ị tụụrụ ndị obodo m ilu, ma ị kọwaraghị m ya.” O wee sị ya: “Akọwaraghị m ya nne m na nna m. M̀ kwesịrị ịkọwara gị ya?” 17  Ma ọ nọ na-ebere ya ákwá ụbọchị asaa niile ha nọ na-eri oriri. N’ikpeazụ, Samsịn kọwaara ya ilu ahụ n’ụbọchị nke asaa maka na ọ nọ na-enye ya nsogbu. O wee gaa kọwaara ndị obodo ya ilu ahụ.+ 18  N’ụbọchị nke asaa, tupu anyanwụ adaa, ndị obodo ahụ sịrị ya: “Gịnị dị ụtọ karịa mmanụ aṅụ? Gịnịkwa siri ike karịa ọdụm?”+ Ọ sịrị ha: “A sị na unu ejighị ehi m kọọ ihe,+ Unu agaraghị akọwa ilu m.” 19  Mmụọ Jehova wee mee ka Samsịn dị ike,+ ya agaa Ashkelọn+ gbuo ụmụ nwoke iri atọ n’ime ha, chịrị uwe ha chịnye ndị kọwara ilu ahụ.+ Oké iwe nọ na-ewe ya ka ọ na-ala n’ụlọ nna ya. 20  A kpọọrọ nwunye Samsịn+ kpọnyezie otu n’ime ụmụ okorobịa ndị nọnyeere ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ọ dị mma n’anya m.”
Ọ ga-abụ Chineke ka a na-ekwu maka ya.