Ndị Ikpe 15:1-20

  • Samsịn bọrọ ọbọ n’isi ndị Filistia (1-20)

15  Mgbe obere oge gachara, n’oge a na-ewe ọka wit n’ubi, Samsịn kpụ nwa ewu gaa ileta nwunye ya. Ọ sịrị: “M chọrọ ịbakwuru nwunye m n’ime ụlọ ya.” Ma nna nwunye ya ekweghị ka ọ banye.  Nna nwunye ya sịrị: “M chere na ị kpọọla ya asị.+ M wee kpọrọ ya kpọnye otu n’ime ụmụ okorobịa ndị nọnyeere gị mgbe ị bịara ịlụ ya.+ Ọ̀ bụ na nwanne ya nwaanyị nke nta akaghị ya mma? Biko, lụwa yanwa.”  Ma Samsịn sịrị ha: “Ndị Filistia agaghị ata m ụta n’oge a ma m mesie ha ike.”  Samsịn wee pụọ gaa jide narị nkịta ọhịa atọ (300), chịtakwa ọwa ọkụ. O dowere nkịta ọhịa ndị ahụ abụọ abụọ, kegide ọdụ otu na nke ibe ya ma fanye otu ọwa ọkụ n’etiti ọdụ nkịta ọhịa abụọ ọ bụla o kekọtara ọnụ.  O wee mụnye ọkụ n’ọwa ọkụ ndị ahụ ma chụba nkịta ọhịa ndị ahụ n’ubi ọka ndị Filistia, bụ́ ọka* ndị kwụcha ọtọ. Ọ gbara ihe niile ọkụ, malite n’ọka ndị e kere n’ùkwù n’ùkwù ruo n’ọka ndị kwụ ọtọ, ma ubi vaịn ma ubi oliv.  Ndị Filistia jụrụ, sị: “Ònye mere ihe a?” A gwara ha, sị: “Ọ bụ Samsịn ọgọ onye Timna. O mere ya maka na ọgọ ya kpọọrọ nwunye ya kpọnye otu n’ime ụmụ okorobịa ndị nọnyeere ya mgbe ọ bịara ịlụ ya.”+ Ndị Filistia wee gaa kpọọ nwaanyị ahụ na nna ya ọkụ.+  Samsịn wee sị ha: “Ọ bụrụ otú a ka unu si eme, agaghị m ezu ike ruo mgbe m bọrọ ọbọ n’isi unu.”+  O wee sụọ ha akwụ, gbuo ha otu otu. Mgbe o gbuchara ha, ọ gara nọrọ n’ọgba dị ná nnukwu nkume Itam.  Mgbe e mechara, ndị Filistia bịara maa ụlọikwuu na Juda ma na-agagharị na Lihaị.+ 10  Ndị Juda wee sị: “Gịnị mere unu ji bịa ịlụso anyị agha?” Ha wee zaa, sị: “Anyị bịara ijide Samsịn,* ka anyị megwara ya ihe o mere anyị.” 11  Puku ndị Juda atọ (3,000) wee gaa n’ọgba dị ná nnukwu nkume Itam ma sị Samsịn: “Ọ̀ bụ na ị maghị na ọ bụ ndị Filistia na-achị anyị?+ Gịnịzi mere i ji mee anyị ihe a?” O wee sị ha: “M megwaara ha ihe ha mere m.” 12  Ma ha sịrị ya: “Anyị bịara ka anyị jide gị* ma nyefee gị n’aka ndị Filistia.” Samsịn wee sị ha: “Ṅụọrọnụ m iyi na unu agaghị emerụ m ahụ́.” 13  Ha sịrị ya: “Mba, naanị ihe anyị ga-eme bụ ike gị agbụ nyefee gị n’aka ha, ma anyị agaghị egbu gị.” Ha wee jiri ụdọ ọhụrụ abụọ kee ya ma si ná nnukwu nkume ahụ kpụpụta ya. 14  Mgbe o rutere Lihaị, ndị Filistia tiri mkpu ọṅụ mgbe ha hụrụ ya. Mmụọ Jehova wee mee ka ọ dị ike,+ ụdọ ndị ahụ e kere ya n’aka adịzie ka eriri ákwà linin a ṅara n’ọkụ, agbụ e kere ya n’aka wee dapụsịa.+ 15  Ọ hụrụ ọkpụkpụ agba oké jakị nke na-akpọbeghị nkụ. Ọ matịrị aka were ya kụgbuo otu puku (1,000) ụmụ nwoke.+ 16  Samsịn wee sị: “Eji m ọkpụkpụ agba jakị gbuo ha, ha atọgbọrọ n’ikpo n’ikpo. Eji m ọkpụkpụ agba jakị kụgbuo otu puku (1,000) ụmụ nwoke.”+ 17  Mgbe o kwuchara ihe a, ọ tụfuru ọkpụkpụ agba jakị ahụ ma kpọọ ebe ahụ Remat-lihaị.*+ 18  Mmiri wee gụsiwe ya ike, ya akpọkuo Jehova, sị: “Ọ bụ gị mere ka ohu gị merie nnukwu mmeri a. Ma, agụụ mmiri ọ̀ ga-agụgbuzi m, ndị a na-ebighị úgwù abịa kpara m aka?” 19  Chineke wee gbapuo otu olulu nke dị na Lihaị, mmiri wee si na ya gbapụta.+ Mgbe ọ ṅụrụ mmiri ahụ, ike* ya lọghachiri, ya enweta onwe ya. Ọ bụ ya mere o ji kpọọ ebe ahụ En-hakọre.* Ebe ahụ dị na Lihaị ruo taa. 20  O wee kpee Izrel ikpe ruo afọ iri abụọ n’oge ndị Filistia na-achị ndị Izrel.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ma ọ bụ “ike Samsịn agbụ.”
Ma ọ bụ “kee gị agbụ.”
Remat-lihaị pụtara “Ugwu Ọkpụkpụ Agba.”
Na Hibru, “mmụọ.”
En-hakọre pụtara “Iyi Onye Na-akpọ Òkù.”