Ndị Ikpe 17:1-13

  • Arụsị Maịka na onye nchụàjà ya (1-13)

17  E nwere otu nwoke si n’ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu.+ Aha ya bụ Maịka.  Ọ sịrị nne ya: “Ọ bụ m ji otu puku na otu narị (1,100) mkpụrụ ego ọlaọcha gị ahụ e zuru ezu, nke m nụrụ mgbe ị na-abụ onye zuru ya ọnụ. Ọ bụ m weere ya.” Nne ya wee sị: “Ka Jehova gọzie nwa m.”  O wee nyeghachi nne ya otu puku na otu narị (1,100) mkpụrụ ego ọlaọcha ahụ. Ma nne ya sịrị: “M ga-edo ọlaọcha a nsọ maka Jehova ka nwa m wee jiri ya mee arụsị a pịrị apị nakwa arụsị a kpụrụ akpụ.+ M na-enyeghachikwa gị ya.”  Mgbe o nyeghachiri nne ya ọlaọcha ahụ, nne ya weere narị mkpụrụ ọlaọcha abụọ (200) nye onye na-eji ọlaọcha akpụ ihe. O mere arụsị a pịrị apị na arụsị a kpụrụ akpụ. E wee dowe ha n’ụlọ Maịka.  Nwoke a bụ́ Maịka nwere ụlọ arụsị. O mere efọd+ na arụsị ezinụlọ*+ ma họpụta otu n’ime ụmụ ya ndị nwoke ka ọ bụrụ onye nchụàjà ya.+  N’oge ahụ, e nweghị eze n’Izrel.+ Onye ọ bụla na-eme ihe dị ya mma.*+  Ma e nwere otu nwa okorobịa onye Betlehem+ nke dị na Juda, onye si n’ezinụlọ Juda. Ọ bụ onye Livaị.+ O biteela aka n’ebe ahụ.  Nwoke ahụ hapụrụ obodo Betlehem nke dị na Juda gawa ịchọ ebe ọ ga-ebi. Mgbe ọ na-aga, o rutere n’ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu, n’ụlọ Maịka.+  Maịka wee sị ya: “Ebee ka i si bịa?” Ọ zara, sị: “Abụ m onye Livaị si na Betlehem nke dị na Juda. M na-aga ịchọ ebe m ga-ebi.” 10  Maịka wee sị ya: “Biri na nke m ka ị bụụrụ m nna* na onye nchụàjà. M ga na-enye gị mkpụrụ ọlaọcha iri kwa afọ, na-enyekwa gị uwe na nri.” Onye Livaị ahụ wee banye n’ụlọ ya. 11  Onye Livaị ahụ wee kweta ibi na nke Maịka. Maịka wee were ya ka otu n’ime ụmụ ya ndị nwoke. 12  Maịka họpụtakwara onye Livaị ahụ ka ọ bụrụ onye nchụàjà ya,+ ya ebiri n’ụlọ Maịka. 13  Maịka wee sị: “Amatala m na Jehova ga-emere m ihe ọma n’ihi na onye Livaị abụrụla onye nchụàjà m.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “terafim.”
Ma ọ bụ “ihe o chere na ọ dị mma.”
Ma ọ bụ “onye ndụmọdụ.”