Ndị Ikpe 18:1-31

  • Ebo Dan chọwara ala (1-31)

    • E buuru arụsị Maịka, kpọrọkwa onye nchụàjà ya (14-20)

    • E weghaara Leyish, kpọzie ya Dan (27-29)

    • E fewere arụsị na Dan (30, 31)

18  N’oge ahụ, e nweghị eze n’Izrel.+ N’oge ahụkwa, ebo Dan+ nọ na-achọ ala ha ga-eketa ka ha biri na ya, n’ihi na ruo mgbe ahụ, e nwebeghị ala ha ketara n’ebo niile e nwere n’Izrel.+  Ebo Dan si na Zora na Eshtaọl+ zipụ ụmụ nwoke ise dị ike, ndị si n’ezinụlọ ha, ka ha gaa nyopụta ala ahụ ma chọpụta otú ọ dị. Ha sịrị ha: “Gaanụ chọpụta otú ala ahụ dị.” Mgbe ha bịarutere n’ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu, n’ụlọ Maịka,+ ha rahụrụ n’ebe ahụ.  Mgbe ha nọ nso n’ụlọ Maịka, ha matara olu nwa okorobịa onye Livaị ahụ.* Ha wee gakwuru ya ma jụọ ya, sị: “Ònye kpọtara gị ebe a? Gịnị ka ị na-eme ebe a? Gịnị mere i ji nọrọ ebe a?”  Ọ zara ha, sị: “Lekwa lekwa ihe Maịka meere m. O goro m ka m bụrụ onye nchụàjà ya.”+  Ha wee sị ya: “Biko, jụọ Chineke ma ihe anyị na-aga ọ̀ ga-aga nke ọma.”  Onye nchụàjà ahụ sịrị ha: “Gaanụ n’udo. Jehova nọnyeere unu n’ihe unu na-aga.”  Ụmụ nwoke ise ahụ gawara ma bịarute Leyish.+ Ha hụrụ otú ndị bi na ya si nọọrọ onwe ha ka ndị Saịdọn. Obi ruru ha ala. Ha tụsaara ahụ́,+ e nweghịkwa onye ọchịchị na-abata enye ha nsogbu n’ala ahụ. Ha bi n’ebe dị anya n’ebe ndị Saịdọn bi, e nweghịkwa ndị ọzọ ha na ha na-emekọ ihe.  Mgbe ha laghachikwuuru ụmụnne ha na Zora na Eshtaọl,+ ụmụnne ha sịrị ha: “Olee otú ije unu si gaa?”  Ha zara, sị: “Ka anyị gaanụ lụso ha agha n’ihi na anyị ahụla na ala ahụ dị ezigbo mma. Gịnị mere unu ji egbu oge? Unu egbula oge ịbanye weghara ala ahụ. 10  Unu rute ebe ahụ, unu ga-ahụ ndị tụsaara ahụ́,+ ala ahụ sakwara mbara. Chineke enyefeela ya n’aka unu, e nweghịkwa ihe dị n’ụwa na-adịghị na ya.”+ 11  Narị ụmụ nwoke isii (600) ndị ji ngwá agha, ndị si n’ezinụlọ ebo Dan, wee si na Zora na Eshtaọl+ kwalie ije. 12  Ha gbagooro wee maa ụlọikwuu na Kiriat-jierim+ nke dị na Juda. Ọ bụ ya mere e ji akpọ ebe ahụ, nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ Kiriat-jierim, Mehane-dan*+ ruo taa. 13  Ha si n’ebe ahụ gaa n’ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu ma rute n’ụlọ Maịka.+ 14  Ụmụ nwoke ise ndị gara nyopụta otú ala Leyish+ dị wee sị ụmụnne ha: “Ùnu ma na e nwere efọd, arụsị ezinụlọ,* arụsị a pịrị apị, na arụsị a kpụrụ akpụ+ n’ụlọ ndị a? Kpebienụ ihe unu ga-eme.” 15  Ha wee kwụsị n’ebe ahụ ma banye n’ụlọ nwa okorobịa onye Livaị+ ahụ, n’ụlọ Maịka, wee jụọ ya otú o mere. 16  N’oge ahụ, narị ụmụ nwoke isii (600) ahụ ndị ji ngwá agha, bụ́ ndị si n’ebo Dan,+ guzo n’ọnụ ụzọ ámá. 17  Ụmụ nwoke ise ndị gara nyopụta otú ala ahụ dị+ banyere n’ime ka ha buru arụsị ahụ a pịrị apị, efọd+ ahụ, arụsị ezinụlọ*+ ahụ, na arụsị ahụ a kpụrụ akpụ.+ (Onye nchụàjà+ ahụ guzokwa n’ọnụ ụzọ ámá, ya na narị ụmụ nwoke isii (600) ahụ ndị ji ngwá agha.) 18  Ha banyere n’ụlọ Maịka buru arụsị ahụ a pịrị apị, efọd ahụ, arụsị ezinụlọ* ahụ, na arụsị ahụ a kpụrụ akpụ. Onye nchụàjà ahụ sịrị ha: “Gịnị ka unu na-eme?” 19  Ma ha sịrị ya: “Mechie ọnụ. Jide ọnụ gị aka. Soro anyị ka ị bụụrụ anyị nna* na onye nchụàjà. Olee nke kaara gị mma? Ọ̀ bụ ka ị bụụrụ ezinụlọ otu nwoke onye nchụàjà,+ ka ọ̀ bụ ka ị bụụrụ otu ebo na otu ezinụlọ n’Izrel onye nchụàjà?”+ 20  Obi wee tọọ onye nchụàjà ahụ ụtọ, ya eburu efọd ahụ, arụsị ezinụlọ ahụ,* na arụsị ahụ a pịrị apị+ soro ha. 21  Ha wee tụgharịa ka ha gawa ebe ha na-aga, ha dowekwara ụmụntakịrị ha, anụ ụlọ ha, na ihe ndị bara ezigbo uru ha nwere n’ihu ha. 22  Ha agaruola ebe dịtụ anya n’ụlọ Maịka mgbe ụmụ nwoke ndị bi nso n’ụlọ Maịka zukọtara ma chụkwuru ha. 23  Mgbe ha kpọwara ndị ebo Dan, ndị ebo Dan tụgharịrị jụọ Maịka, sị: “Ọ̀ bụ gịnị? Gịnị mere unu ji zukọta?” 24  O wee sị: “Unu eburula chi m ndị m rụrụ, kpọrọkwa onye nchụàjà m lawa. Olee ihe fọọrọ m? Gịnịzi mere unu ji ajụ m, ‘Ọ̀ bụ gịnị na-eme gị?’” 25  Ndị ebo Dan zara, sị: “Abakwarala anyị mba. Ma ọ́ bụghị ya, ụmụ nwoke iwe ji nwere ike ịlụso unu ọgụ, gbuo ma gị ma ndị ezinụlọ gị.” 26  Ndị ebo Dan wee gawa ebe ha na-aga. Maịka hụrụ na ha ka ya ike, ya atụgharịa laghachi n’ụlọ ya. 27  Mgbe ha buruchara ihe ahụ Maịka rụrụ, kpọrọkwa onye nchụàjà ya, ha gawara Leyish.+ Ndị bi na Leyish tụsaara ahụ́, obi rukwara ha ala.+ Ndị ebo Dan ji mma agha gbuo ha ma gbaa obodo ha ọkụ. 28  E nweghị onye ga-anapụta ha n’ihi na obodo ahụ dị anya na Saịdọn, e nweghịkwa ndị ọzọ ha na ha na-emekọ ihe. Ebe ahụ dịkwa na ndagwurugwu Bet-rihọb.+ Ndị ebo Dan wee rụghachi obodo ahụ ma biri na ya. 29  Ha kpọziri obodo ahụ Dan,+ bụ́ aha nna ha, ya bụ, Dan, nwa Izrel.+ Ma a na-akpọbu obodo ahụ Leyish.+ 30  Mgbe e mechara, ndị ebo Dan dowere arụsị ahụ a pịrị apị+ ka e fewe ya. Jonatan+ nwa Geshọm,+ nwa Mosis, na ụmụ ya wee bụụrụ ndị ebo Dan ndị nchụàjà ruo ụbọchị a dọọrọ ndị bi n’ala ahụ n’agha. 31  Ha dowere arụsị ahụ a pịrị apị Maịka rụrụ ka e fewe ya. Ọ dịkwa n’ebe ahụ n’ụbọchị niile ụlọ ezi Chineke dị na Shaịlo.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ha si n’otú nwa okorobịa ahụ si ekwu okwu mata ya.”
Mehane-dan pụtara “Ụlọikwuu Dan.”
Na Hibru, “terafim.”
Na Hibru, “terafim.”
Na Hibru, “terafim.”
Ma ọ bụ “onye ndụmọdụ.”
Na Hibru, “terafim.”