Ndị Ikpe 20:1-48

  • A lụsoro ndị ebo Benjamin agha (1-48)

20  N’ihi ya, ndị Izrel niile ndị si na Dan+ ruo Bia-shiba nakwa ndị si na Gilied+ pụtara ma jiri otu obi zukọta* na Mizpa+ n’ihu Jehova.  Ndị isi ha niile, bụ́ ndị isi ebo niile dị n’Izrel, wee kwụrụchaa n’ebe ha kwesịrị ịkwụ n’ọgbakọ ndị Chineke. Ndị agha ndị ji ụkwụ aga, ndị jicha mma agha, dị narị puku anọ (400,000).+  Ndị ebo Benjamin nụrụ na ndị Izrel agaala Mizpa. Ndị Izrel wee sị: “Gwanụ anyị, olee otú ụdị ihe ọjọọ a si mee?”+  Nwoke Livaị ahụ,+ di nwaanyị ahụ e gburu egbu, wee zaa, sị: “Mụ na iko m nwaanyị bịarutere Gibia+ nke dị n’ebo Benjamin ka anyị nọrọ ebe ahụ ka chi bọọ.  Ndị bi na* Gibia wee chọrọ m bịa ma gbaa ụlọ m nọ na ya gburugburu n’abalị. Ọ bụ m ka ha chọrọ igbu, ma ha dinara iko m nwaanyị n’ike, o wee nwụọ.+  M wee buru ozu iko m nwaanyị gburie ma ziga ha otu ibé otu ibé n’ala niile Izrel ketara,+ n’ihi na ha mere ihe na-eme ihere na ihe na-asọ oyi n’Izrel.  Unu ndị Izrel niile, tụọnụ aro, kwuokwanụ ihe a ga-eme.”+  Mmadụ niile wee bilie otu mgbe,* sị: “E nweghị onye ọ bụla n’ime anyị ga-ala n’ụlọikwuu ya ma ọ bụ laghachi n’ụlọ ya.  Ihe a bụ ihe anyị ga-eme Gibia: Anyị ga-efe nza+ ma gaa lụso ya agha. 10  Anyị ga-esi n’otu narị ụmụ nwoke n’ebo niile dị n’Izrel kpọrọ mmadụ iri, si n’otu puku (1,000) ụmụ nwoke kpọrọ otu narị (100), sikwa na puku ụmụ nwoke iri (10,000) kpọrọ otu puku (1,000) mmadụ ka ha na-ewetara ndị agha ihe oriri, ka ha wee lụso Gibia nke ebo Benjamin agha n’ihi ihe na-eme ihere ha mere n’Izrel.” 11  Ụmụ nwoke ndị Izrel niile wee jiri otu obi zukọta* ka ha lụso obodo ahụ agha ka otu ìgwè. 12  Ebo ndị dị n’Izrel wee dunye ụmụ nwoke ka ha gwa ụmụ nwoke niile bụ́ ndị ebo Benjamin, sị: “Gịnị bụ ihe ọjọọ a e mere n’ebo unu? 13  Ugbu a, kpọpụtanụ ụmụ nwoke ndị ahụ na-abaghị uru, bụ́ ndị Gibia,+ ka anyị gbuo ha wee wepụ ihe ọjọọ n’Izrel.”+ Ma ndị ebo Benjamin ekweghị ege ụmụnne ha bụ́ ndị Izrel ntị. 14  Ndị ebo Benjamin wee si n’obodo ndị dị na Gibia zukọta ka ha gaa lụso ndị Izrel agha. 15  N’ụbọchị ahụ, ndị ebo Benjamin si n’obodo ha dị iche iche kpọkọta puku ụmụ nwoke iri abụọ na puku isii ji mma agha (26,000), nakwa narị ụmụ nwoke asaa (700) e si na Gibia họrọ. 16  N’ime ndị agha a, e nwere narị ụmụ nwoke asaa (700) a họrọ ahọ bụ́ ndị na-eme aka ekpe. Onye ọ bụla n’ime ha na-eji nkume agbata ihe há ka otu ntutu isi, ha anaghịkwa agbajọ. 17  Ndị Izrel wee kpọkọta narị puku ụmụ nwoke anọ (400,000) ndị ji mma agha,+ ndị ịlụ agha doro anya. Ma, ndị ebo Benjamin esoghị ná ndị a. 18  Ndị Izrel biliri gaa Betel ka ha jụọ Chineke ase.+ Ha wee sị: “Ònye n’ime anyị ga-ebute ụzọ gaa lụso ndị ebo Benjamin agha?” Jehova zara, sị: “Juda ga-ebute ụzọ.” 19  Mgbe e mechara, ndị Izrel biliri n’ụtụtụ maa ụlọikwuu ka ha lụso Gibia agha. 20  Ndị Izrel gawara ịlụso ebo Benjamin agha. Ha haziri onwe ha ka ha lụso ha agha na Gibia. 21  Ndị ebo Benjamin wee si na Gibia pụta gbuo puku ụmụ nwoke Izrel iri abụọ na puku abụọ (22,000) n’ụbọchị ahụ. 22  Ma, ndị agha Izrel katara obi ma hazie onwe ha ọzọ ka ha lụọ agha n’ebe ahụ ha lụrụ agha n’ụbọchị mbụ. 23  Ndị Izrel wee gaa bee ákwá n’ihu Jehova ruo mgbede. Ha jụkwara Jehova ase, sị: “Ọ̀ bụ anyị gaa ọzọ lụso ụmụnne anyị ndị ebo Benjamin agha?”+ Jehova wee sị: “Gaanụ lụso ha agha.” 24  Ndị Izrel wee bịa nso ka ha lụso ndị ebo Benjamin agha n’ụbọchị nke abụọ. 25  Ndị ebo Benjamin sikwa na Gibia pụta ka ha zute ha n’ụbọchị nke abụọ ahụ. Ha wee gbuo puku ndị Izrel iri na asatọ (18,000) ọzọ,+ bụ́ ndị jicha mma agha. 26  Ndị Izrel niile wee gaa Betel. Ha bere ákwá ma nọrọ ọdụ n’ebe ahụ n’ihu Jehova.+ Ha buru ọnụ+ n’ụbọchị ahụ ruo mgbede, chụọkwa àjà a na-esu ọkụ+ na àjà udo+ n’ihu Jehova. 27  Ndị Izrel jụziri Jehova ase+ n’ihi na igbe ọgbụgba ndụ ezi Chineke dị n’ebe ahụ n’oge ahụ. 28  Finihas+ nwa Elieza, nwa Erọn, na-eje ozi* n’ihu igbe ọgbụgba ndụ ahụ n’oge ahụ. Ha jụrụ, sị: “Ọ̀ bụ anyị gaa ọzọ lụso ụmụnne anyị ndị ebo Benjamin agha, ka ọ̀ bụ anyị kwụsị?”+ Jehova zara, sị: “Gaanụ, n’ihi na echi ka m ga-enyefe ha n’aka unu.” 29  Ndị Izrel wee zoo+ ndị agha gburugburu Gibia. 30  Ndị Izrel gara ịlụso ndị ebo Benjamin agha n’ụbọchị nke atọ. Ha haziri onwe ha ka ha lụso Gibia agha otú ha mere n’oge ndị ọzọ.+ 31  Mgbe ndị ebo Benjamin pụtara ka ha zute ndị agha ahụ, e si n’obodo ha rapụta ha.+ Ha wee malite igbu ụfọdụ ndị Izrel n’okporo ụzọ otú ha mere n’oge ndị ọzọ, n’okporo ụzọ gara Betel na nke gara Gibia. Ha gburu ihe dị ka ụmụ nwoke Izrel iri atọ n’ebe ahụ.+ 32  Ndị ebo Benjamin wee sị: “Anyị na-emeri ha otú anyị si merie ha na mbụ.”+ Ma ndị Izrel sịrị: “Anyị ga-agba ọsọ ka anyị wee si n’obodo ha rapụta ha n’okporo ụzọ.” 33  Ndị Izrel niile wee si n’ebe niile ha nọ bilie ma hazie onwe ha na Bel-tema. Ndị Izrel ndị nke zoro ezo sikwa n’ebe niile ha zoro gburugburu Gibia mapụtachaa. 34  Puku ụmụ nwoke iri (10,000) e si n’Izrel niile họrọ wee bịarute n’ihu Gibia, ọgụ ahụ kpụkwa ọkụ n’ọnụ. Ma ndị Benjamin amaghị na ọdachi abịawala ịdakwasị ha. 35  Jehova mere ka ndị Izrel merie ebo Benjamin.+ N’ụbọchị ahụ, ndị Izrel gburu puku ụmụ nwoke iri abụọ na ise na otu narị (25,100) n’ebo Benjamin, bụ́ ndị jicha mma agha.+ 36  Ma, ndị ebo Benjamin chere na ha ga-emeri ndị Izrel mgbe ndị Izrel nọ na-agbara ha ọsọ.+ Ma ihe mere ha ji gbaa ọsọ bụ na ha tụkwasịrị ndị agha ha zoro ezo obi, bụ́ ndị zoro ka ha lụso Gibia agha.+ 37  Ndị agha ahụ zoro ezo mere ọsọ ọsọ gawa ịlụso Gibia agha. Ha wee banye n’ebe niile n’obodo ahụ ma jiri mma agha gbuo ndị niile bi na ya. 38  Ndị Izrel kpebiri na ndị ahụ zoro gburugburu obodo ahụ ga-eme ka anwụrụ ọkụ si n’obodo ahụ kwụgoo elu iji gbaara ha àmà. 39  Mgbe ndị Izrel si n’ọgbọ agha ahụ gbawa ọsọ, ndị ebo Benjamin malitere ịchụ ha ma gbuo ihe dị ka ụmụ nwoke Izrel iri atọ.+ Ha sịkwara: “O doro anya na anyị emeriwela ha ọzọ otú anyị meriri ha n’agha nke mbụ.”+ 40  Ma, anwụrụ ọkụ ahụ ha ji agbara ha àmà malitere isi n’obodo ahụ na-akwụgo elu ka ogidi. Mgbe ndị ebo Benjamin lere anya n’azụ, ha hụrụ ka anwụrụ ọkụ si n’obodo ahụ niile na-akwụgo elu. 41  Ndị Izrel wee tụgharịa lụsowe ndị ebo Benjamin agha. Ike ịlụ agha gwụziri ndị ebo Benjamin n’ihi na ha hụrụ na ọdachi adakwasịla ha. 42  Ha wee gbawara ndị Izrel ọsọ, gbara gawa n’ala ịkpa, ma ndị agha ahụ chụụrụ ha gawa. Ụmụ nwoke ndị sikwa n’obodo ahụ na-apụta tinyere aka na-egbu ha. 43  Ha gbara ndị ebo Benjamin gburugburu, chụrụ ha na-aga, ha ezughịkwa ike. Ha meriri ha n’ihu Gibia n’ebe ọwụwa anyanwụ. 44  N’ikpeazụ, puku ụmụ nwoke iri na asatọ (18,000) n’ime ndị ebo Benjamin nwụrụ. Ha niile bụcha ndị agha dị ike.+ 45  Ndị ebo Benjamin tụgharịrị gbaga n’ala ịkpa, ná nnukwu nkume Rimọn.+ Ndị Izrel gburu puku mmadụ ise (5,000) n’ime ha n’okporo ụzọ. Ha nọkwa na-achụ ha ruo Gaịdọm. Ha wee gbukwuo puku ụmụ nwoke abụọ (2,000). 46  Ndị ebo Benjamin niile ndị nwụrụ n’ụbọchị ahụ dị puku ụmụ nwoke iri abụọ na puku ise (25,000) ndị ji mma agha.+ Ha niile bụcha ndị agha dị ike. 47  Ma narị ụmụ nwoke isii (600) gbagara n’ala ịkpa, ná nnukwu nkume Rimọn. Ha nọrọ ọnwa anọ ná nnukwu nkume Rimọn. 48  Ndị Izrel wee laghachi gaa lụso ndị ebo Benjamin agha ma jiri mma agha gbuo ndị obodo ahụ, malite na mmadụ ruo n’anụ ụlọ, ya bụ, ihe niile fọdụrụ. Ha gbakwara obodo niile dị n’ụzọ ha si gafee ọkụ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “zukọtara ka otu onye.”
O nwere ike ịbụ, “ndị nwe ala.”
Na Hibru, “bilie ka otu onye.”
Na Hibru, “zukọta ka otu onye.”
Na Hibru, “na-eguzo.”