Ndị Ikpe 21:1-25

  • Ndị Izrel ekweghị ka ebo Benjamin chie (1-25)

21  Ndị Izrel ṅụrụ iyi na Mizpa,+ sị: “E nweghị onye ọ bụla n’ime anyị ga-akpọnye nwoke ọ bụla si n’ebo Benjamin nwa ya nwaanyị ka ọ lụwa.”+  N’ihi ya, ndị Izrel bịara na Betel+ ma nọrọ ọdụ n’ebe ahụ n’ihu ezi Chineke ruo ná mgbede, na-ebesi ákwà ike ma na-akwa ákwà arịrị.  Ha nọkwa na-asị: “Jehova bụ́ Chineke Izrel, gịnị mere ihe a ji mee n’Izrel? Gịnị mere na otu ebo adịghịzi n’Izrel taa?”  N’echi ya, ha biliri n’isi ụtụtụ rụọ ebe ịchụàjà n’ebe ahụ ma chụọ àjà a na-esu ọkụ nakwa àjà udo.+  Ndị Izrel wee sị: “N’ebo niile e nwere n’Izrel, olee onye na-esoghị zukọta n’ihu Jehova?” n’ihi na ha ṅụrụ iyi na onye ọ bụla na-abịaghị na Mizpa n’ihu Jehova, a ga-egbu ya.  Ihe mere Benjamin nwanne ha wee wute ha. Ha sịrị: “Taa, e bibiela otu ebo n’Izrel.  Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị chọtara ụmụ nwoke ha fọrọ afọ ụmụ nwaanyị ha ga-alụ, ebe ọ bụ na anyị ejirila aha Jehova ṅụọ iyi+ na anyị agaghị akpọnye ha ụmụ anyị ndị nwaanyị ka ha lụwa?”+  Ha jụrụ, sị: “N’ebo niile e nwere n’Izrel, olee onye na-abịaghị na Mizpa+ n’ihu Jehova?” Ha chọpụtara na e nweghị onye si Jebesh-gilied bịa n’ebe ọgbakọ ahụ zukọrọ.  Mgbe a gụrụ ndị mmadụ ọnụ, ha chọpụtara na e nweghị onye ọ bụla bi na Jebesh-gilied nọ n’ebe ahụ. 10  N’ihi ya, nzukọ ahụ dunyere puku ụmụ nwoke iri na abụọ (12,000), ndị kacha bụrụ dike, ka ha gaa n’ebe ahụ. Ha nyere ha iwu, sị: “Gaanụ jiri mma agha gbuo ndị bi na Jebesh-gilied, ma ụmụ nwaanyị ma ụmụntakịrị.+ 11  Ihe a ka unu ga-eme: Gbuonụ ụmụ nwoke niile nakwa nwaanyị ọ bụla ya na nwoke nwetụrụla mmekọahụ.” 12  N’ime ndị bi na Jebesh-gilied, ha chọtara narị ụmụ agbọghọ anọ (400) na-amaghị nwoke, ndị ha na nwoke na-enwetụbeghị mmekọahụ. Ha wee kpọta ha n’ụlọikwuu dị na Shaịlo,+ nke dị na Kenan. 13  Nzukọ ahụ niile wee zigara ndị ebo Benjamin nọ ná nnukwu nkume Rimọn+ ozi ma gwa ha ka ha na ha mee udo. 14  Ndị ebo Benjamin wee lọta n’oge ahụ. Ndị Izrel kpọnyere ha ụmụ nwaanyị ndị ha hapụrụ ndụ n’ime ụmụ nwaanyị Jebesh-gilied.+ Ma ha achọtaghị ụmụ nwaanyị ole ga-ezu ha. 15  Ihe mere ebo Benjamin wutere ndị Izrel+ n’ihi na Jehova ekewaala ebo ndị e nwere n’Izrel. 16  Ndị okenye nzukọ ahụ sịrị: “Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị chọtara ụmụ nwoke fọrọ afọ ụmụ nwaanyị ha ga-alụ, ebe ọ bụ na e gbuchaala ụmụ nwaanyị niile bụ́ ndị ebo Benjamin?” 17  Ha zara, sị: “Ndị Benjamin fọrọ ndụ kwesịrị ịnọgide n’ala ha ketara, ka a ghara ikpochapụ otu ebo n’Izrel. 18  Ma anyị agaghị akpọnyeli ha ụmụ anyị ndị nwaanyị ka ha lụwa, n’ihi na ndị Izrel aṅụọla iyi, sị: ‘Onye ọ bụla kpọnyere onye ebo Benjamin nwa ya nwaanyị ka ọ lụwa, a ga-abụ ya ọnụ.’”+ 19  Ha wee sị: “E nwere ememme a na-emere Jehova kwa afọ na Shaịlo.+ Shaịlo a dị n’ebe ugwu Betel, n’ebe ọwụwa anyanwụ nke okporo ụzọ si Betel gaa Shikem, n’ebe ndịda Lebona.” 20  Ha wee gwa ụmụ nwoke ebo Benjamin, sị: “Gaanụ zoo n’ubi vaịn. 21  Mgbe ọ bụla unu hụrụ ụmụ agbọghọ Shaịlo ka ha pụtara ịgba egwú ha na-agba gburugburu gburugburu, ka onye ọ bụla n’ime unu si n’ubi vaịn mapụta nwụde otu n’ime ụmụ agbọghọ Shaịlo ọ ga-alụ. Unu ga-alaghachikwa n’ala ndị ebo Benjamin. 22  Ọ bụrụkwa na nna ha ma ọ bụ ụmụnne ha ndị nwoke abịa ikpesara anyị ihe merenụ, anyị ga-asị ha, ‘Meerenụ anyị ebere n’ihi ha, maka na anyị enweghị ike ịchọtara onye ọ bụla n’ime ha nwaanyị ọ ga-alụ mgbe anyị gara agha,+ ọ bụrụkwa na unu ejiri aka unu kpọnye ha nwaanyị ha ga-alụ, ikpe ga-ama unu.’”+ 23  Ụmụ nwoke ebo Benjamin mere otú ahụ. Onye ọ bụla n’ime ha si n’ụmụ nwaanyị ndị nọ na-agba egwú nwụde onye ọ ga-alụ. Mgbe e mechara, ha laghachiri n’ala ha ketara, rụghachi obodo ndị dị na ya+ ma biri n’obodo ndị ahụ. 24  N’oge ahụ, ndị Izrel si n’ebe ahụ lasasịa, onye nke ọ bụla lara n’ebo ya nakwa n’ezinụlọ ya. Ha si n’ebe ahụ laa, onye nke ọ bụla n’ala o ketara. 25  N’oge ahụ, e nweghị eze n’Izrel.+ Onye ọ bụla na-eme ihe dị ya mma.*

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ihe o chere na ọ dị mma.”