Ndị Ikpe 3:1-31

  • Jehova nwalere ndị Izrel (1-6)

  • Ọtniel bụ onye mbụ kpere ndị Izrel ikpe (7-11)

  • Onyeikpe aha ya bụ Ehud gburu Eze Eglọn (12-30)

  • Onyeikpe aha ya bụ Shamga (31)

3  Ndị a bụ mba ndị Jehova hapụrụ ka ha nwalee ndị Izrel niile, bụ́ ndị na-ahụghị nke ọ bụla n’agha ndị a lụrụ na Kenan+  (ihe mere o ji hapụ ha bụ ka ọgbọ ndị Izrel na-alụtụbeghị agha hụ otú agha na-adị):  ndị isi ise ndị na-achị ndị Filistia,+ na ndị Kenan niile, na ndị Saịdọn,+ nakwa ndị Haịvaịt,+ bụ́ ndị bi n’Ugwu Lebanọn,+ malite n’Ugwu Bel-hemọn ruo na Libo-hemat.*+  E ji ha nwalee Izrel iji mara ma hà ga-erube isi n’iwu Jehova si n’aka Mosis nye ndị nna nna ha.+  Ndị Izrel na ndị Kenan,+ ndị Het, ndị Amọraịt, ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt, na ndị Jebus wee bikọta.  Ndị Izrel wee na-alụrụ ụmụ ha ndị nwaanyị, na-akpọnyekwa ụmụ nwoke mba ndị ahụ ụmụ ha ndị nwaanyị. Ha wee malite ife chi mba ndị ahụ.+  N’ihi ya, ndị Izrel mere ihe dị njọ n’anya Jehova. Ha chefukwara Jehova Chineke ha ma fewe Bel+ na ogwe osisi arụsị.*+  Jehova wee wesa Izrel ezigbo iwe ma nyefee ha n’aka* Kushan-rishateyim eze Mesopotemia.* Ndị Izrel wee jeere Kushan-rishateyim ozi afọ asatọ.  Mgbe ndị Izrel rịọrọ Jehova ka o nyere ha aka,+ Jehova nyere ndị Izrel onye nzọpụta ka ọ napụta ha,+ ya bụ, Ọtniel+ nwa Kinaz, nwanne Keleb nke Keleb tọrọ. 10  Jehova wụkwasịrị ya mmụọ ya,+ o wee bụrụ onyeikpe Izrel. Mgbe ọ gara agha, Jehova nyefere Kushan-rishateyim eze Mesopotemia* n’aka ya, ya emerie Kushan-rishateyim. 11  Ala ahụ wee zuru ike* ruo afọ iri anọ. Ọtniel nwa Kinaz wee nwụọ. 12  Ndị Izrel malitekwara ime ihe dị njọ n’anya Jehova.+ Jehova wee kwe ka Eglọn eze Moab+ ka Izrel ike maka na ha mere ihe dị njọ n’anya Jehova. 13  Ọ kpọtakwara ndị Amọn+ na ndị Amalek+ ka ha lụso ha agha. Ha wee lụso Izrel agha ma weghara obodo nkwụ.+ 14  Ndị Izrel jeere Eglọn eze Moab ozi ruo afọ iri na asatọ.+ 15  Ndị Izrel wee rịọ Jehova ka o nyere ha aka.+ Jehova wee nye ha onye nzọpụta,+ ya bụ, Ehud+ nwa Gira, onye ebo Benjamin,+ onye na-eme aka ekpe.+ Ka oge na-aga, ndị Izrel bunyere ya ụtụ ha tụkọtara ka ọ gaa bunye Eglọn eze Moab. 16  Ma, Ehud rụrụ otu mma agha nwere ihu abụọ, nke dị otu kubit* n’ogologo. O wee kegide ya n’apata ụkwụ aka nri ya, yichie ya uwe. 17  O wee butere Eglọn eze Moab ụtụ ahụ. Eglọn buru ezigbo ibu. 18  Mgbe Ehud bunyechara ya ụtụ ahụ, ọ gwara ndị butere ụtụ ahụ ka ha lawa. 19  Ma mgbe o rutechara n’ebe e nwere arụsị ndị a pịrị apị* na Gilgal,+ ọ laghachiri gwa eze, sị: “Eze, e nwere ihe m chọrọ ịgwa gị onye ọzọ na-ekwesịghị ịnụ.” Eze wee sị: “Pụọnụ!”* Ndị niile na-ejere ya ozi wee hapụ ya pụọ. 20  Ehud wee bịakwute ya ka ọ nọ ọdụ naanị ya n’ụlọ ya jụrụ oyi nke dị n’elu ụlọ. Ehud wee sị: “E nwere ozi Chineke ziri m ka m zie gị.” O wee bilie n’ocheeze* ya. 21  Ehud wee jiri aka ekpe mịrị mma agha ahụ dị n’apata ụkwụ aka nri ya, manye ya eze ahụ n’afọ. 22  Mma ahụ na isi ya banyechara ya n’afọ, abụba kpuchikwara mma ahụ, n’ihi na ọ mịpụtaghị ya n’afọ ya. Nsị wee si ya n’afọ wụpụta. 23  Ehud wee si n’ebe e si abata n’ụlọ ahụ* pụọ. O mechiri ọnụ ụzọ ndị dị n’ụlọ ahụ dị n’elu mgbe ọ na-apụ, kpọchiekwa ha. 24  Mgbe ọ pụchara, ndị na-ejere eze ozi bịaghachiri ma hụ na a kpọchichara ọnụ ụzọ ndị dị n’ụlọ ahụ dị n’elu akpọchi. Ha wee sị: “Ọ ga-abụ na ọ na-aga mposi n’ọnụ ụlọ jụrụ oyi nke dị n’ime.” 25  Ha chegidere ruo mgbe ihere onwe ha mewere ha. Ma mgbe ha hụrụ na o megheghị ọnụ ụzọ ndị dị n’ụlọ ahụ dị n’elu, ha weere mkpịsị ugodi meghee ha ma hụ na nna ha ukwu anwụọla, tọgbọrọ n’ala. 26  Ehud gbalara mgbe ha nọ na-egbu oge. O si n’ebe e nwere arụsị ndị a pịrị apị*+ gafere ma rute Si-aịra n’udo. 27  Mgbe o rutere, ọ fụrụ opi+ n’ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu.+ Ndị Izrel wee soro ya si n’obodo ahụ bụ́ ugwu ugwu gbadaa, ya abụrụ onyeisi ha. 28  O wee sị ha: “Soronụ m, n’ihi na Jehova enyefeela ndị iro unu, bụ́ ndị Moab, n’aka unu.” Ha wee soro ya gaa nọchie ebe ndị e ji ụkwụ agafe n’Osimiri Jọdan ka ndị Moab ghara ịgafe, ha ekweghịkwa ka onye ọ bụla gafere. 29  N’oge ahụ, ha gburu ihe dị ka puku ndị Moab iri (10,000).+ Ha niile bụ ndị dike gbasiri ike. E nweghị otu n’ime ha gbapụrụnụ.+ 30  Izrel meriri Moab n’ụbọchị ahụ. Ala ahụ wee zuru ike* ruo afọ iri asatọ.+ 31  Onyeikpe ọzọ e nwere bụ Shamga+ nwa Enat, onye ji ndụdụ e ji achị ehi+ gbuo narị ụmụ nwoke isii (600) bụ́ ndị Filistia.+ Ọ zọpụtakwara Izrel.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “n’ebe e si abanye Hemat.”
Na Hibru, “resị ha.”
Na Hibru, “Eram-nehareyim.”
Na Hibru, “Eram.”
Ma ọ bụ “Udo wee dị n’ala ahụ.”
O nwere ike ịbụ obere kubit nke dị ihe dị ka sentimita 38. Gụọ B14.
O nwere ike ịbụ, “n’ebe a na-awa nkume.”
Na Hibru, “Nọrọnụ jụụ.”
Ma ọ bụ “n’oche.”
O nwere ike ịbụ, “n’ebe ikuku si abata.”
O nwere ike ịbụ, “n’ebe a na-awa nkume.”
Ma ọ bụ “Udo wee dị n’ala ahụ.”