Ndị Ikpe 4:1-24

  • Eze ndị Kenan bụ́ Jebin mesiri ndị Izrel ike (1-3)

  • Debora onye amụma nwaanyị na Berak (4-16)

  • Jeel gburu ọchịagha aha ya bụ Sisera (17-24)

4  Ma mgbe Ehud nwụrụ, ndị Izrel mekwara ihe dị njọ n’anya Jehova.+  N’ihi ya, Jehova nyefere ha n’aka* Jebin eze Kenan,+ onye chịrị na Hezọ. Onyeisi ndị agha ya bụ Sisera, onye bi na Haroshet.*+  Ndị Izrel besaara Jehova ákwá+ n’ihi na Jebin* nwere narị ụgbọ ịnyịnya agha itoolu (900) ndị a rụnyere ogologo mma n’ụkwụ ha.*+ O chikwara ndị Izrel ọnụ n’ala+ ruo afọ iri abụọ.  Debora, onye amụma nwaanyị,+ nwunye Lapidọt, bụ onyeikpe Izrel n’oge ahụ.  Ọ na-anọkarị n’okpuru nkwụ Debora, n’agbata Rema+ na Betel,+ n’ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu. Ndị Izrel na-agakwuru ya ka o kpeere ha ikpe.  O ziri ozi ka a gaa Kidesh-naftalaị+ kpọọ Berak+ nwa Abinoam. Ọ sịrị ya: “Ọ̀ bụ na Jehova bụ́ Chineke Izrel enyebeghị gị iwu? ‘Gawa, kpọrọ puku ụmụ nwoke iri (10,000) bụ́ ndị Naftalaị na Zebulọn gaa n’Ugwu Tebọ.  M ga-akpọtara gị Sisera, onyeisi ndị agha Jebin, nakwa ndị na-agba ụgbọ ịnyịnya agha ya na ìgwè ndị agha ya n’iyi* Kaịshọn.+ M ga-enyefekwa ya n’aka gị.’”+  Berak wee sị ya: “Ọ bụrụ na ị ga-eso m gaa, m ga-aga, ma ọ bụrụ na ị gaghị eso m, agaghị m aga.”  O wee sị: “M ga-eso gị gaa. Ma, ọ bụghị gị ka a ga-eto n’agha a ị na-aga n’ihi na ọ bụ n’aka nwaanyị ka Jehova ga-enyefe Sisera.”+ Debora wee bilie soro Berak gaa Kidesh.+ 10  Berak kpọkọtara ndị Zebulọn na ndị Naftalaị,+ ha ezukọta na Kidesh, puku ụmụ nwoke iri (10,000) wee soro ya. Debora sokwa ha gbagoo. 11  Ọ dabara na Hiba onye Kenaịt hapụrụ ndị Kenaịt,+ bụ́ ụmụ ụmụ Hobab, ọgọ Mosis,+ gaa biri ebe ọzọ. Ọ mara ụlọikwuu ya n’akụkụ nnukwu osisi dị na Zeananim, nke dị na Kidesh. 12  Ha kọọrọ Sisera na Berak nwa Abinoam agbagorola n’Ugwu Tebọ.+ 13  Ozugbo ahụ, Sisera kpọkọtara ndị na-agba ụgbọ ịnyịnya agha ya, ha ejiri ụgbọ ịnyịnya agha ya niile zukọta, ya bụ, narị ụgbọ ịnyịnya agha itoolu (900) ndị a rụnyere ogologo mma n’ụkwụ ha,* ha na ndị agha ya niile, ka ha wee si Haroshet* gawa n’iyi* Kaịshọn.+ 14  Debora wee sị Berak: “Bilie, n’ihi na ọ bụ taa ka Jehova ga-enyefe Sisera n’aka gị. Ọ̀ bụ na Jehova ebutereghị gị ụzọ?” Berak wee si n’Ugwu Tebọ gbadaa, ya na puku ụmụ nwoke iri (10,000) ndị so ya. 15  Jehova wee tinye Sisera na ụgbọ ịnyịnya agha ya niile na ndị agha ya niile n’ọgba aghara.+ O jikwa mma agha Berak bibie ha. N’ikpeazụ, Sisera si n’ụgbọ ịnyịnya ya wụtuo, jiri ụkwụ gbawa ọsọ. 16  Berak chụụrụ ndị ahụ na-agba ụgbọ ịnyịnya agha na ndị agha ahụ ruo Haroshet.* E wee jiri mma agha gbuo ndị agha Sisera niile. E nweghị otu onye fọrọ n’ime ha.+ 17  Ma Sisera ji ụkwụ gbaga n’ụlọikwuu Jeel+ nwunye Hiba+ onye Kenaịt, n’ihi na Jebin+ eze Hezọ na ezinụlọ Hiba onye Kenaịt dị n’udo. 18  Jeel wee pụta izute Sisera ma sị ya: “Batawa, onyenwe m, batawa ebe a. Atụla egwu.” O wee banye n’ụlọikwuu ya, ya ejiri ákwà e ji achụ oyi kpuchie ya. 19  Sisera wee sị ya: “Biko, nyetụ m mmiri n’ihi na mmiri na-agụ m.” O wee meghee karama akpụkpọ nke mmiri ara ehi dị na ya, gbanyere ya mmiri ara ehi, ya aṅụọ.+ O wee kpuchiekwa ya ákwà. 20  Sisera sịrị ya: “Kwụrụ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu a. Ọ bụrụ na onye ọ bụla abịa jụọ gị, sị, ‘È nwere nwoke nọ n’ebe a?’ sị ya, ‘Mba.’” 21  Ma Jeel nwunye Hiba weere mkpọ́ e ji ejide ụlọikwuu, werekwa hama. Ka Sisera na-ehi ezigbo ụra maka na ike gwụrụ ya, o heere ehere gakwuru ya ma kụnye mkpọ́ ahụ n’akụkụ ntị ya, kụgide ya n’ala. Sisera wee nwụọ.+ 22  Berak chụụrụ Sisera bịa n’ebe ahụ. Jeel wee pụta ka o zute ya. Ọ sịrị ya: “Bịa, m ga-egosi gị nwoke ị na-achọ.” O wee soro ya banye ma hụ na Sisera anwụọla n’ebe o dina, mkpọ́ ahụ ka dịkwa n’akụkụ ntị ya. 23  Chineke wee merie Jebin eze Kenan n’ihu ndị Izrel+ n’ụbọchị ahụ. 24  Aka nọ na-esikwu ndị Izrel ike n’ịlụso Jebin eze Kenan+ agha ruo mgbe ha bibiri Jebin eze Kenan.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “resịrị ha.”
Ma ọ bụ “Haroshet nke ndị mba ọzọ”; “Haroshet-ha-goim.”
Na Hibru, “o.”
Na Hibru, “ụgbọ ịnyịnya agha ígwè.”
Ma ọ bụ “na ndagwurugwu.”
Na Hibru, “ụgbọ ịnyịnya agha ígwè.”
Ma ọ bụ “Haroshet nke ndị mba ọzọ”; “Haroshet-ha-goim.”
Ma ọ bụ “na ndagwurugwu.”
Ma ọ bụ “Haroshet nke ndị mba ọzọ”; “Haroshet-ha-goim.”