Ndị Ikpe 6:1-40

  • Ndị Midian mesiri ndị Izrel ike (1-10)

  • Mmụọ ozi gwara Gidiọn na Jehova nọnyeere ya (11-24)

  • Gidiọn kwaturu ebe ịchụàjà Bel (25-32)

  • Chineke wụkwasịrị Gidiọn mmụọ ya (33-35)

  • Gidiọn ji ajị anụ mata ihe ga-eme (36-40)

6  Ma ndị Izrel malitekwara ime ihe dị njọ n’anya Jehova.+ Jehova wee nyefee ha n’aka ndị Midian ruo afọ asaa.+  Ndị Midian mesiri ndị Izrel ike.+ N’ihi ndị Midian, ndị Izrel gara n’ugwu, n’ọgba, nakwa n’ebe ndị siri ike mbanye rụọ ebe ha ga na-ezo.*+  Ọ bụrụ na ndị Izrel aghaa mkpụrụ, ndị Midian na ndị Amalek+ na ndị si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ+ na-abịa lụso ha agha.  Ha na-ama ụlọikwuu ka ha lụso ndị Izrel agha. Ha na-ebibi ihe ala ha mepụtara ruo na Gaza. Ha anaghịkwa ahapụrụ ndị Izrel ihe oriri ọ bụla ma ọ bụ atụrụ ma ọ bụ ehi ma ọ bụ jakị.+  N’ihi na ha na-achịrị anụ ụlọ ha, burukwa ụlọikwuu ha bịa n’ìgwè ka igurube.+ E nweghị ike ịgụta ha na kamel ha ọnụ,+ ha na-abatakwa n’ala ahụ ka ha bibie ya.  Ndị Izrel wee daa ogbenye nke ukwuu n’ihi ndị Midian. Ndị Izrel wee malite ịrịọ Jehova ka o nyere ha aka.+  Mgbe ndị Izrel rịọrọ Jehova ka o nyere ha aka n’ihi ndị Midian,+  Jehova zigaara ndị Izrel otu onye amụma. Onye amụma ahụ gwara ha, sị: “Ihe a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, ‘M kpọpụtara unu n’Ijipt, si otú ahụ kpọpụta unu n’ala unu nọ na-agba ohu.+  M wee napụta unu n’aka ndị Ijipt nakwa n’aka ndị niile na-emegbu unu, chụpụkwa ha n’ebe unu nọ ma nye unu ala ha.+ 10  M gwakwara unu, sị: “Abụ m Jehova Chineke unu.+ Unu atụla chi ndị Amọraịt unu bi n’ala ha+ egwu.” Ma unu erubereghị m isi.’”*+ 11  Mgbe e mechara, mmụọ ozi Jehova bịara+ nọrọ ọdụ n’okpuru nnukwu osisi dị n’Ọfra, bụ́ nke Joash onye Abi-iza.+ Gidiọn+ nwa ya nọ na-eticha ọka wit n’ebe a na-azọchapụta mmanya ka o zoo ọka ahụ ka ndị Midian ghara ịhụ ya. 12  Mmụọ ozi Jehova wee pụta n’ihu ya, sị ya: “Onye agha dị ike, Jehova nọnyeere gị.”+ 13  Gidiọn wee sị ya: “Ewela iwe, onyenwe m. Ọ bụrụ na Jehova nọnyeere anyị, gịnị mere ihe a niile ji na-eme anyị?+ Olee ọrụ ebube ya niile ndị nna nna anyị kọọrọ anyị akụkọ ha,+ sị, ‘Ọ̀ bụ na Jehova akpọpụtaghị anyị n’Ijipt?’+ Ugbu a, Jehova ahapụla anyị+ ma nyefee anyị n’aka ndị Midian.” 14  Jehova chere ya ihu ma sị ya: “Were ike i nwere gaa. Ị ga-azọpụta Izrel n’aka ndị Midian.+ Ọ̀ bụ na ọ bụghị m na-eziga gị?” 15  Gidiọn zara ya, sị: “Biko, Jehova. Olee otú m ga-esi azọpụta Izrel? Lee, ọ bụ ọnụmara* anyị kacha nta n’ebo Manase, ọ bụkwa m kacha nta n’ụlọ nna m.” 16  Ma Jehova sịrị ya: “Ebe ọ bụ na m ga-anọnyere gị,+ ị ga-emeri ndị Midian ka à ga-asị na ha bụ otu onye.” 17  O wee sị ya: “Ọ bụrụ na ihe m masịrị gị, gosi m ihe àmà m ga-eji amata na ọ bụ gị na-agwa m okwu. 18  Biko, esila n’ebe a pụọ ruo mgbe m ga-abịaghachi ma dowe onyinye m ga-ewetara gị n’ihu gị.”+ O wee sị ya: “M ga-anọ ebe a ruo mgbe ị ga-abịaghachi.” 19  Gidiọn wee gaa sie nwa ewu, jirikwa ntụ ọka dị otu efa* mee achịcha na-ekoghị eko.+ O tinyere anụ ahụ na nkata, tinyekwa mmiri anụ ahụ n’ite e ji esi nri. O wee buru ha bupụtara ya ma busara ya ha n’okpuru nnukwu osisi ahụ. 20  Mmụọ ozi nke ezi Chineke wee sị ya: “Buru anụ ahụ na achịcha ahụ na-ekoghị eko dọkwasị n’elu nnukwu nkume dị n’ebe ahụ, wụsakwa mmiri anụ ahụ n’elu ya.” O wee mee otú ahụ. 21  Mmụọ ozi Jehova wee setịa ọnụ mkpara o ji n’aka metụ anụ ahụ na achịcha ahụ na-ekoghị eko, ọkụ wee si na nkume ahụ pụta rechapụ anụ ahụ na achịcha ahụ na-ekoghị eko.+ Mmụọ ozi Jehova wee pụọ, ọ hụghịzi ya. 22  Gidiọn mataziri na ọ bụ mmụọ ozi Jehova.+ Gidiọn sịrị ozugbo: “Ewoo, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, ahụla m mmụọ ozi Jehova ihu na ihu!”+ 23  Ma Jehova sịrị ya: “Udo dịrị gị. Atụla egwu.+ Ị gaghị anwụ.” 24  Gidiọn wee rụọrọ Jehova ebe ịchụàjà n’ebe ahụ, e wee na-akpọ ebe ịchụàjà ahụ Jehova-shalọm*+ ruo taa. Ọ ka dị n’Ọfra nke ndị Abi-iza. 25  N’abalị ahụ, Jehova gwara ya, sị: “Kpụrụ oké ehi nna gị, oké ehi nke abụọ nke dị afọ asaa. Kwatuo ebe ịchụàjà Bel nke nna gị, gbutuokwa ogwe osisi arụsị* dị ya n’akụkụ.+ 26  Jiri nkume ndị ị ga-edo n’ahịrị n’ahịrị rụọrọ Jehova Chineke gị ebe ịchụàjà n’elu ebe a a rụsiri ike. Ị rụchaa ya, were oké ehi nke abụọ ahụ chụọ àjà a na-esu ọkụ n’elu nkụ si n’ogwe osisi arụsị* ahụ ị ga-egbutu.” 27  Gidiọn wee kpọrọ ụmụ nwoke iri n’ime ndị na-ejere ya ozi ma mee nnọọ ihe Jehova gwara ya. Ma ebe ọ bụ na ọ tụrụ ezinụlọ nna ya na ndị obodo ya ezigbo ụjọ, o meghị ya n’ehihie, kama o mere ya n’abalị. 28  Mgbe ndị obodo ya biliri n’isi ụtụtụ, ha hụrụ na a kwatuola ebe ịchụàjà Bel, gbutuo ogwe osisi arụsị* dị n’akụkụ ya, chụọkwa oké ehi nke abụọ n’àjà n’ebe ịchụàjà a rụrụ. 29  Ha jụrụ ibe ha, sị: “Ònye mere ihe a?” Mgbe ha chọpụtara onye mere ya, ha sịrị: “Ọ bụ Gidiọn nwa Joash mere ihe a.” 30  Ndị obodo ahụ wee gwa Joash, sị: “Kpọpụta nwa gị ka e gbuo ya, n’ihi na ọ kwaturu ebe ịchụàjà Bel, gbutuokwa ogwe osisi* dị n’akụkụ ya.” 31  Joash+ wee gwa ndị ahụ niile bịakwutere ya, sị: “Ọ̀ bụ unu ga-ekwuchitere Bel ọnụ ya? Ọ̀ bụ unu ga-azọpụta ya? Onye ọ bụla kwuchiteere ya ọnụ ya, e kwesịrị igbu ya n’ụtụtụ a.+ Ọ bụrụ na ọ bụ chi, ya zara ọnụ ya,+ ebe ọ bụ na mmadụ akwatuola ebe ịchụàjà ya.” 32  O wee kpọọ Gidiọn Jerubel* n’ụbọchị ahụ, sị: “Ka Bel zara ọnụ ya, n’ihi na mmadụ akwatuola ebe ịchụàjà ya.” 33  Ndị Midian+ na ndị Amalek+ niile na ndị si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ gbakọtara aka bịa ọgụ.+ Ha gafere* banye na Ndagwurugwu Jezril ma maa ụlọikwuu. 34  Jehova wee wụkwasị Gidiọn mmụọ ya,+ ya afụọ opi.+ Ndị Abi-iza+ wee zukọta n’ebe ọ nọ ka ha nyere ya aka. 35  O zipụrụ ndị ozi ka ha gaa kpọọ ndị niile ọzọ si n’ebo Manase, ha zukọtakwara n’ebe ọ nọ ka ha nyere ya aka. O zipụkwara ndị ozi ka ha gaa Asha, Zebulọn, na Naftalaị, ha wee bịa izute ya. 36  Gidiọn wee gwa ezi Chineke, sị: “Ọ bụrụ na ị ga-esi n’aka m zọpụta Izrel otú i kwere ná nkwa,+ 37  m ga-edowe ajị anụ n’ebe a na-azọcha ọka.* Ọ bụrụ na igirigi adaa naanị n’ajị anụ a, ma ghara ịda n’ala a niile, m ga-amata na ị ga-esi n’aka m zọpụta Izrel, otú i kwere ná nkwa.” 38  Ihe a mere. Mgbe o biliri n’isi ụtụtụ echi ya gaa pịa ajị anụ ahụ aka, ọ pịpụtara mmiri ga-eju otu nnukwu efere. 39  Ma, Gidiọn gwara ezi Chineke, sị: “Ewerela m oké iwe, kama ka m rịọ naanị otu arịrịọ ọzọ. Biko, ka m jiri ajị anụ a nwalee naanị otu ugboro ọzọ. Biko, ka igirigi daa n’ala a niile, ma ka ọ bụrụ naanị n’ajị anụ a ka ọ na-agaghị adasa.” 40  Chineke wee mee otú ahụ n’abalị ahụ. Ọ bụ naanị ajị anụ ahụ ka igirigi na-adasaghị, ma igirigi dara n’ala ahụ niile.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “ebe ha ga na-akwasa ihe n’ime ala.”
Na Hibru, “egeghị ntị n’olu m.”
Na Hibru, “otu puku.”
Ihe dị ka lita 22. Gụọ B14.
Jehova-shalọm pụtara “Jehova Bụ Udo.”
Jerubel pụtara “Ka Bel Zara (Kpere) Ọnụ Ya.”
Ma ọ bụ “gafere osimiri.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.