Ndị Ikpe 7:1-25

  • Gidiọn na narị ụmụ nwoke atọ ya (1-8)

  • Ndị agha Gidiọn meriri ndị Midian (9-25)

    • “Mma agha Jehova na nke Gidiọn!” (20)

    • E nwere ọgba aghara n’ụlọikwuu ndị Midian (21, 22)

7  Jerubel, ya bụ, Gidiọn,+ na ndị niile so ya wee bilie n’isi ụtụtụ gaa maa ụlọikwuu n’akụkụ Iyi Herọd. Ma ụlọikwuu ndị Midian dị n’ebe ugwu, n’ugwu More, na ndagwurugwu.  Jehova wee sị Gidiọn: “Ndị gị na ha so karịrị akarị mụ inyefe ndị Midian n’aka ha.+ Ọ bụrụ na ha adị ọtụtụ otú a, Izrel nwere ike ịnyara m isi, sị, ‘Ọ bụ m zọpụtara onwe m.’+  Biko, maara ha ọkwa, sị, ‘Onye ọ bụla ụjọ na-atụ ma ọ bụ onye na-ama jijiji, ya lawa.’”+ Gidiọn wee nwalee ha. Puku mmadụ iri abụọ na puku abụọ (22,000) n’ime ha wee laa, ya afọdụ puku mmadụ iri (10,000).  Ma Jehova sịrị Gidiọn: “Ha ka karịrị akarị. Kpọrọ ha gbadaa na mmiri ka m nwaleere gị ha n’ebe ahụ. Ọ bụrụ na m sị gị, ‘Onye a ga-eso gị,’ ọ ga-eso gị. Ma, ọ bụrụ na mụ asị gị, ‘Onye a agaghị eso gị,’ ọ gaghị eso gị.”  O wee kpọrọ ha gbadaa na mmiri. Jehova wee sị Gidiọn: “Kpọpụta onye ọ bụla ji aka ya na-akwọrọ mmiri na-aṅụ* iche, kpọpụtakwa ndị gburu ikpere n’ala na-aṅụ mmiri iche.”  Ndị ji aka ha na-akwọrọ mmiri na-aṅụ dị narị ụmụ nwoke atọ (300). Ma ndị ọzọ niile gburu ikpere n’ala na-aṅụ mmiri.  Jehova wee sị Gidiọn: “M ga-eji narị ụmụ nwoke atọ (300) ahụ kwọọrọ mmiri ṅụọ zọpụta unu. M ga-enyefekwa ndị Midian n’aka gị.+ Ma, ka ndị ọzọ niile laa.”  N’ihi ya, mgbe a natachara ụmụ nwoke Izrel ndị ọzọ ahụ ihe oriri na opi, ọ gwara ha ka ha lawa. Ma, ọ hapụrụ naanị narị ụmụ nwoke atọ (300) ahụ. Ụlọikwuu ndị Midian dị ná mgbada, na ndagwurugwu.+  N’abalị ahụ, Jehova sịrị ya: “Bilie, lụso ndị agha ahụ agha n’ihi na enyefeela m ha n’aka gị.+ 10  Ma ọ bụrụ na ụjọ na-atụ gị ịlụso ha agha, gị na Pura onye na-ejere gị ozi gbadaa n’ebe ahụ ha mara ụlọikwuu. 11  Gee ntị n’ihe ha na-ekwu, e mechaa obi ga-esi gị ike* ịlụso ndị agha ahụ agha.” Ya na Pura onye na-ejere ya ozi wee gbadaruo n’ọnụ ọnụ ebe ndị agha ahụ mara ụlọikwuu. 12  Ndị Midian na ndị Amalek na ndị niile si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ+ juru na ndagwurugwu ahụ ka igurube, e nweghịkwa ike ịgụta kamel ha ọnụ.+ Ha dị ọtụtụ ka ájá dị n’ụsọ oké osimiri. 13  Gidiọn wee bịarute. E nwere otu nwoke nọ na-akọrọ onye ya na ya nọ nrọ ọ rọrọ, sị: “Ihe a bụ nrọ m rọrọ. E nwere ógbè achịcha ọka bali dị okirikiri nke kpọreere banye n’ebe ndị Midian mara ụlọikwuu. O rutere n’otu ụlọikwuu kụsie ụlọikwuu ahụ ike, ya adaa.+ O mere ka ụlọikwuu ahụ kpuo ihu n’ala ma daruo ala.” 14  Onye ahụ ya na ya nọ wee sị: “Ihe a ga-abụrịrị mma agha Gidiọn+ nwa Joash, nwoke Izrel. Chineke enyefeela Midian na ndị agha ya niile n’aka ya.”+ 15  Ozugbo Gidiọn nụrụ ka ọ na-akọ nrọ ahụ, nụkwa nkọwa ya,+ ọ kpọọrọ Chineke isiala. Ọ gaghachiziri n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu ma sị ha: “Bilienụ, n’ihi na Jehova enyefeela ndị agha Midian n’aka unu.” 16  O wee kee narị ụmụ nwoke atọ (300) ahụ ụzọ atọ, nye ha niile opi,+ bunyekwa ha nnukwu ite ndị e tinyere ọwa ọkụ n’ime ha. 17  Ọ gwaziri ha, sị: “Na-elenụ m anya, meekwanụ ihe m mere. M rute n’ọnụ ọnụ ebe ha mara ụlọikwuu, meenụ ihe ọ bụla m mere. 18  Mgbe mụ na ndị mụ na ha so fụrụ opi, fụọkwanụ opi unu gburugburu ebe ha mara ụlọikwuu, tiekwanụ mkpụ, sị, ‘Ọ bụ agha Jehova na nke Gidiọn!’” 19  Gidiọn na otu narị (100) ụmụ nwoke ya na ha so rutere n’ọnụ ọnụ ebe ndị ahụ mara ụlọikwuu ná mmalite oge nche nke etiti abalị,* n’oge a ka gbanwechara ndị nche. Ha fụrụ opi,+ kụriekwa nnukwu ite mmiri ndị ahụ ha bu.+ 20  Ìgwè atọ ahụ wee fụọ opi ha ma kụrie nnukwu ite ha. Ha jidere ọwa ọkụ n’aka ekpe ha ma fụọ opi ha ji n’aka nri ha. Ha tiziri mkpu, sị: “Mma agha Jehova na nke Gidiọn!” 21  Mgbe ihe a na-eme, onye nke ọ bụla kwụ n’ebe ọ kwụ gburugburu ebe ndị agha ahụ mara ụlọikwuu. Ndị agha ahụ niile wee gbawa ọsọ, na-eti mkpu ka ha na-agba ọsọ.+ 22  Narị mmadụ atọ (300) ahụ nọ na-afụ opi ha. Jehova wee mee ka onye agha nke ọ bụla jiri mma agha ya na-egbu onye agha ibe ya.+ Ndị agha ahụ gbagidere ọsọ ruo Bet-shita, ruo Zerira, ruokwa ná ngwụcha Ebel-mehola,+ n’akụkụ Tabat. 23  E si na Naftalaị, Asha, na Manase+ niile kpọkọta ụmụ nwoke Izrel, ha wee chụwa ndị Midian. 24  Gidiọn dunyere ndị ozi ka ha gaa n’ala Ifrem niile bụ́ ugwu ugwu zie ha, sị: “Gbadaanụ lụso ndị Midian agha, nọchiekwanụ mmiri ndị dị n’ebe ahụ ruo Bet-bara nakwa Osimiri Jọdan tupu ha erute.” E wee kpọkọta ndị Ifrem niile, ha anọchie mmiri ndị ahụ ruo Bet-bara nakwa Osimiri Jọdan. 25  Ha jidekwara mmadụ abụọ bụ́ ndị isi ndị Midian, ya bụ, Oreb na Zieb. Ha gburu Oreb n’elu oké nkume e mechara kpọwa oké nkume Oreb,+ gbuokwa Zieb n’ebe a na-azọchapụta mmanya e mechara kpọwa ebe a na-azọchapụta mmanya Zieb. Ha chụụrụ ndị Midian na-aga.+ Ha butekwaara Gidiọn isi Oreb na isi Zieb ná mpaghara Osimiri Jọdan.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “onye ọ bụla ji ire na-arara mmiri ka nkịta.”
Na Hibru, “aka ga-esi gị ike.”
Malite n’ihe dị ka elekere iri nke abalị ruo n’elekere abụọ n’ime abalị.