Ndị Ikpe 8:1-35

  • Ndị Ifrem sesara Gidiọn okwu (1-3)

  • A chụrụ ndị eze Midian ọsọ, gbuo ha (4-21)

  • Gidiọn ekweghị abụ eze (22-27)

  • Ihe a kọrọ gbasara Gidiọn na ezinụlọ ya (28-35)

8  Ndị Ifrem wee sị ya: “Gịnị bụ ihe a i mere anyị? Gịnị mere na ị kpọghị anyị mgbe ị gara ịlụso ndị Midian agha?”+ Ha wee sesa ya ezigbo okwu.+  Ma ọ sịrị ha: “Ihe m mere ò ruru ka ihe unu mere? Ọ̀ bụ na mkpụrụ Ifrem+ ghọfọrọ n’ubi akaghị mkpụrụ vaịn Abi-iza+ ghọtara n’ubi mma?  Ọ bụ n’aka unu ka Chineke nyefere ndị isi Midian bụ́ Oreb na Zieb.+ Ihe m mere ò ruru ka ihe unu mere?” Mgbe o kwuru ihe a, obi jụụrụ ha.  Gidiọn wee bịarute Osimiri Jọdan ma gafee ya. Ike gwụrụ ya na narị ụmụ nwoke atọ (300) so ya, ma ha nọ na-achụ ndị iro ha.  O wee sị ụmụ nwoke ndị Sọkọt: “Biko, nyenụ ndị so m achịcha n’ihi na ike gwụrụ ha. M na-achụ Ziba na Zalmọna, bụ́ ndị eze Midian.”  Ma ndị isi Sọkọt sịrị ya: “Ì jidela Ziba na Zalmọna, nke mere anyị ga-eji nye ndị agha gị achịcha?”  Gidiọn wee sị ha: “N’ihi ihe a unu kwuru, mgbe Jehova nyefere Ziba na Zalmọna n’aka m, m ga-eji osisi ogwu na uke si n’ala ịkpa pịakasịa unu ahụ́.”+  O wee si n’ebe ahụ garuo Penuel ma rịọ ha otu ihe ahụ, ma ụmụ nwoke ndị Penuel zara ya ihe ahụ ụmụ nwoke ndị Sọkọt zara.  O wee gwakwa ndị Penuel, sị: “Mgbe m lọtara n’udo, m ga-akwatu ụlọ elu a.”+ 10  Ma Ziba na Zalmọna na ndị agha ha ndị dị ihe dị ka puku ụmụ nwoke iri na ise (15,000) nọ na Kakọ. Ọ bụ ha fọrọ n’ime ndị agha niile si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ,+ n’ihi na e gbuola otu narị puku ụmụ nwoke na puku iri abụọ (120,000) ndị jicha mma agha. 11  Gidiọn sooro ụzọ ndị bi n’ụlọikwuu na-esikarị, nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Noba na Jọg-beha,+ gawa ma lụso ndị agha ahụ agha mgbe ha na-adịghị njikere. 12  Mgbe Ziba na Zalmọna gbawara ọsọ, ọ chụwara ha ma nwụde ndị eze Midian abụọ ahụ, ya bụ, Ziba na Zalmọna. Oké ụjọ wee jide ndị agha ahụ niile. 13  Gidiọn nwa Joash wee si n’ụzọ gara Hires lọtawa agha ahụ. 14  Mgbe ọ na-alọta, o jidere otu nwa okorobịa onye Sọkọt ma jụọ ya ajụjụ. Nwa okorobịa ahụ wee depụtara ya aha ndị isi na ndị okenye Sọkọt, ndị dị ụmụ nwoke iri asaa na asaa. 15  O wee gakwuru ụmụ nwoke ndị Sọkọt, sị: “Leenụ Ziba na Zalmọna ndị unu ji maka ha kparịa m, sị, ‘Ì jidela Ziba na Zalmọna, nke mere anyị ga-eji nye ndị agha gị ike gwụrụ achịcha?’”+ 16  O wee kpọrọ ndị okenye obodo Sọkọt, were osisi ogwu na uke si n’ala ịkpa nyụọ ụmụ nwoke a bụ́ ndị Sọkọt ịkpakwụ.+ 17  Ọ kwatukwara ụlọ elu dị na Penuel+ ma gbuo ụmụ nwoke ndị obodo ahụ. 18  Ọ jụrụ Ziba na Zalmọna, sị: “Olee otú ndị ahụ unu gburu na Tebọ dị?” Ha wee sị: “Otú a ị dị ka onye ọ bụla n’ime ha dị. Ha yiri ụmụ eze.” 19  O wee sị ha: “Ha bụ ụmụnne m. Nne ji mụ na ha. Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, aṅụ iyi na a sị na unu hapụrụ ha ndụ, agaghị m egbu unu.” 20  O wee gwa Jita ọkpara ya, sị: “Bilie, gbuo ha.” Ma nwa okorobịa a amịpụtaghị mma agha ya. Egwu na-atụ ya maka na ọ ka bụ nwata. 21  Ziba na Zalmọna wee sị: “Gịnwa bilie gbuo anyị, n’ihi na ihe e ji ama dimkpa bụ ike ya.” Gidiọn wee bilie gbuo Ziba na Zalmọna,+ werekwa ihe e ji achọ mma ndị yiri ọnwa na-apụta ọhụrụ bụ́ ndị dị n’olu kamel ha. 22  Mgbe e mechara, ndị Izrel sịrị Gidiọn: “Chịwa anyị, gị na nwa gị na nwa nwa gị n’ihi na ị zọpụtara anyị n’aka ndị Midian.”+ 23  Ma Gidiọn sịrị ha: “Agaghị m achị unu, nwa m agaghịkwa achị unu. Ọ bụ Jehova ga-achị unu.”+ 24  Gidiọn sịkwara ha: “Ka m rịọ unu otu ihe: ka onye ọ bụla si n’ihe ọ kwatara n’agha nye m otu ọla imi.” (N’ihi na ndị ha meriri nwere ọla imi ọlaedo maka na ha bụ ndị Ishmel.)+ 25  Ha wee sị ya: “Anyị ga-enye gị ha.” Ha wee gbasaa otu uwe mwụda, onye ọ bụla wee si n’ihe ọ kwatara n’agha tụnye otu ọla imi. 26  Ọla imi ọlaedo ọ natara ha dị otu puku shekel* ọlaedo na narị asaa (1,700) n’arọ, ma e wepụ ihe e ji achọ mma ndị yiri ọnwa na-apụta ọhụrụ, ihe olu, ákwà ajị anụ na-acha pọpụl nke ndị eze Midian yi, na ihe olu ndị a nyapụtara n’olu kamel ha.+ 27  Gidiọn ji ọlaedo ndị ahụ mee efọd,+ dowekwa ya n’ihu ọha n’obodo ya bụ́ Ọfra.+ Izrel niile wee kpaa àgwà ka ndị akwụna, hapụ Chineke gaa fewe efọd ahụ n’ebe ahụ.+ O wee bụụrụ Gidiọn na ezinụlọ ya ọnyà.+ 28  Otú a ka ndị Izrel si merie ndị Midian.+ Ha alụsoghịkwa ndị Izrel agha* ọzọ. Ala ahụ wee zuru ike* ruo afọ iri anọ n’oge Gidiọn dị ndụ.+ 29  Jerubel+ nwa Joash wee laa n’ụlọ ya ma nọrọ n’ebe ahụ. 30  Gidiọn mụrụ ụmụ nwoke iri asaa, n’ihi na ọ lụrụ ọtụtụ ụmụ nwaanyị. 31  Ma iko ya nwaanyị, onye bi na Shikem, mụụrụ ya otu nwa nwoke. Ọ gụrụ ya Abimelek.+ 32  Gidiọn nwa Joash nwụrụ mgbe o mere ezigbo agadi. E wee lie ya n’ebe e liri Joash nna ya n’Ọfra nke ndị Abi-iza.+ 33  Ozugbo Gidiọn nwụrụ, ndị Izrel kpara àgwà ọzọ ka ndị akwụna, hapụ Chineke gaa fewe Bel.+ Ha wee jiri Bel-birit mere chi ha.+ 34  Ndị Izrel echetaghị Jehova Chineke ha,+ onye napụtara ha n’aka ndị iro ha niile gbara ha gburugburu.+ 35  Ha emereghị* ezinụlọ Jerubel, ya bụ, Gidiọn, ihe ọma* n’agbanyeghị ihe ọma niile o meere Izrel.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.
Na Hibru, “eseliteghịkwa isi ha.”
Ma ọ bụ “Udo wee dị n’ala ahụ.”
Ma ọ bụ “egosighị.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya pụrụ iche.”