Ndị Ikpe 9:1-57

  • E chiri Abimelek eze na Shikem (1-6)

  • Ilu Jotam tụrụ (7-21)

  • Abimelek chịrị ọchịchị aka ike (22-33)

  • Abimelek lụsoro Shikem agha (34-49)

  • Otu nwaanyị kụriri Abimelek isi; ya anwụọ (50-57)

9  Ka oge na-aga, Abimelek+ nwa Jerubel gakwuuru ụmụnne nne ya na Shikem ma gwa ha na ndị niile si n’ezinụlọ nna nne ya, sị:  “Biko, jụọnụ ndị niile bụ́ ndị isi* Shikem, sị, ‘Olee nke kaara unu mma? Ọ̀ bụ ka ụmụ nwoke iri asaa niile Jerubel+ mụrụ chịwa unu, ka ọ̀ bụ ka otu onye chịwa unu? Chetakwanụ na mụ na unu bụ otu ọbara.’”*  Ụmụnne nne ya wee gwa ndị niile bụ́ ndị isi Shikem ihe a o kwuru. O wee masị ha iso Abimelek maka na ha sịrị: “Ọ bụ nwanne anyị nwoke.”  Ha wee si n’ụlọ* Bel-birit+ nye ya mkpụrụ ego ọlaọcha iri asaa. Abimelek ji ya goo ndị na-enweghị ihe ha na-arụ na ndị na-akparị mmadụ ka ha soro ya.  O mechara gaa n’ụlọ nna ya dị n’Ọfra+ gbuo ụmụnne ya,+ bụ́ ụmụ Jerubel, ụmụ nwoke iri asaa, n’elu otu nkume. Ọ bụ naanị Jotam, ọdụdụ nwa Jerubel, ka ọ na-egbughị maka na ọ gara zoo.  Ndị niile bụ́ ndị isi Shikem na ndị niile bi na Bet-milo wee zukọta chie Abimelek eze+ n’ebe dị nso ná nnukwu osisi, n’akụkụ ogidi dị na Shikem.  Mgbe ha kọọrọ ya Jotam, ọ gara ozugbo guzoro n’elu Ugwu Gerizim+ ma gwa ha n’oké olu, sị: “Unu ndị isi Shikem, geenụ m ntị, Chineke ga-egekwa unu ntị.  “E nwere mgbe osisi dị iche iche gara ịhọpụta eze ga-achị ha. Ha wee sị osisi oliv, ‘Chịwa anyị.’+  Ma osisi oliv sịrị ha, ‘M̀ ga-ahapụ mmanụ m na-agba, nke e ji enye Chineke na mmadụ otuto, gaa chịwa* osisi ndị ọzọ?’ 10  Osisi ndị ọzọ wee sị osisi fig, ‘Bịa chịwa anyị.’ 11  Ma osisi fig sịrị ha, ‘M̀ ga-ahapụ ịmị ezigbo mkpụrụ na-atọ ụtọ m na-amị gaa chịwa* osisi ndị ọzọ?’ 12  Osisi ndị ọzọ sịziri osisi vaịn, ‘Bịa chịwa anyị.’ 13  Osisi vaịn zara ha, sị, ‘M̀ ga-ahapụ mmanya ọhụrụ m, nke na-eme ka Chineke na mmadụ na-aṅụrị ọṅụ, gaa chịwa* osisi ndị ọzọ?’ 14  N’ikpeazụ, osisi ndị ọzọ niile sịrị osisi ogwu, ‘Bịa chịwa anyị.’+ 15  Osisi ogwu wee sị osisi ndị ọzọ, ‘Ọ bụrụ eziokwu na unu na-ahọpụta m ka m bụrụ eze unu, bịanụ gbaba na ndò m. Ọ bụrụ na ọ bụghị ya, ka ọkụ si n’osisi ogwu pụta repịa osisi sida ndị dị na Lebanọn.’ 16  “Ọ̀ dị mma na unu chiri Abimelek eze?+ Ọ̀ bụ ùgwù ka unu kwanyeere Jerubel? Ọ̀ bụ ihe ọma ka unu meere Jerubel na ezinụlọ ya? Ọ̀ bụ otú a ka unu kwesịrị isi mesoo ya? 17  Mgbe nna m lụụrụ unu agha,+ o mere ihe gaara ata isi ya ka ọ napụta unu n’aka ndị Midian.+ 18  Ma taa, unu agaala lụso ezinụlọ nna m ọgụ ma gbuo ụmụ ya ndị nwoke iri asaa n’elu otu nkume.+ Unu wee chie Abimelek, bụ́ nwa ohu ya nwaanyị,+ eze ka ọ chịwa ndị isi Shikem naanị maka na ọ bụ nwanne unu nwoke. 19  Ọ bụrụ na ihe unu mere dị mma, ọ bụrụkwa na unu kwanyeere Jerubel na ezinụlọ ya ùgwù taa, ṅụrịanụ ọṅụ n’ihi Abimelek, ka ọ ṅụrịakwa ọṅụ n’ihi unu. 20  Ma ọ bụrụ na ọ bụghị ya, ka ọkụ si n’Abimelek pụta repịa ndị isi Shikem na ndị bi na Bet-milo, ka ọkụ sikwa ná ndị isi Shikem na ndị bi na Bet-milo+ pụta repịa Abimelek.”+ 21  Jotam+ wee gbaa ọsọ gbaga Bia ma biri n’ebe ahụ n’ihi Abimelek nwanne ya. 22  Abimelek chịrị Izrel afọ atọ. 23  Chineke wee kwe ka Abimelek na ndị isi Shikem see okwu,* ndị isi Shikem wee ghọọ Abimelek aghụghọ. 24  Ọ bụ ka e wee bọọ ọbọ maka ogbugbu e gburu ụmụ Jerubel iri asaa, ka ọbara ha wee dịrị n’isi Abimelek nwanne ha maka na o gburu ha+ nakwa n’isi ndị isi Shikem maka na ha nyeere ya aka gbuo ụmụnne ya. 25  Ndị isi Shikem wee dunye ụmụ nwoke ka ha chechie ya n’elu ugwu. Ha na-anapụ onye ọ bụla na-agafe ha n’ụzọ ihe o ji. Ka oge na-aga, a kọọrọ Abimelek ihe na-emenụ. 26  Geel nwa Ibed na ụmụnne ya ndị nwoke gafetara Shikem,+ ndị isi Shikem wee tụkwasị ya obi. 27  Ndị Shikem gara n’ubi ghọọ mkpụrụ vaịn ndị dị n’ubi vaịn ha, zọchaa ha, meekwa ememme. Mgbe ha mechara, ha banyere n’ụlọ chi ha,+ rie oriri, ṅụo mmanya, bụọkwa Abimelek ọnụ. 28  Geel nwa Ibed wee sị: “Ònye bụ Abimelek, ònyekwa bụ Shikem* nke mere anyị ga-eji jeere ya ozi? Ọ̀ bụ na ọ bụghị nwa Jerubel,+ ọ̀ bụkwa na ọ bụghị Zibọl ka o mere onyeisi? Jewerenụ ụmụ Hemọ, nna Shikem, ozi. Ma, gịnị mere anyị ga-eji ejere Abimelek ozi? 29  A sị na ndị a nọ n’okpuru m, m gaara akwatu Abimelek n’ọchịchị.” O wee maa Abimelek aka, sị: “Mee ka ndị agha gị dịkwuo ọtụtụ, chịrịkwa ha pụta.” 30  Mgbe Zibọl onyeisi obodo ahụ nụrụ ihe Geel nwa Ibed kwuru, ezigbo iwe were ya. 31  O wee zoro ezoro* zigara Abimelek ndị ozi ka ha zie ya, sị: “Geel nwa Ibed na ụmụnne ya abịala na Shikem. Ha na-emekwa ka ndị obodo a nupụwere gị isi. 32  Gbagote n’abalị, gị na ụmụ nwoke gị, zoo n’ọhịa chebiri ha. 33  Ozugbo anyanwụ wara n’ụtụtụ, bilie n’oge lụso obodo a agha. Ọ bụrụ na ya na ụmụ nwoke ya apụta ịlụso gị agha, mee ihe ọ bụla i nwere ike ime ka i merie ya.”* 34  Abimelek na ndị niile so ya wee bilie n’abalị. Ha kere onwe ha ụzọ anọ gaa zoo chebiri Shikem. 35  Mgbe Geel nwa Ibed pụrụ gaa guzoro n’ọnụ ụzọ ámá obodo, Abimelek na ndị so ya si n’ebe ha zoro pụta. 36  Mgbe Geel hụrụ ha, ọ gwara Zibọl, sị: “Lee, e nwere ndị si n’elu ugwu na-agbadata.” Ma Zibọl sịrị ya: “Ọ bụ onyinyo ugwu ka ị na-ahụ chee na ha bụ mmadụ.” 37  Geel mechara sị: “Lee, ndị mmadụ si n’etiti ala a na-agbadata. Otu ìgwè n’ime ha si n’ụzọ dị n’akụkụ osisi ukwu Meọnenim na-abịa.” 38  Zibọl zara ya, sị: “Oleezi ọnụ ahụ i turu, sị, ‘Ònye bụ Abimelek nke mere anyị ga-eji jeere ya ozi?’+ Ọ̀ bụ na ọ bụghị ndị a ka ị kparịrị? Ngwanụ, gaa lụso ha agha.” 39  Geel wee duru ndị isi Shikem gaa lụso Abimelek agha. 40  Abimelek chụwara Geel, ya agbafuo. E gbukwara ọtụtụ ndị ruo n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ. 41  Abimelek wee biri n’Aruma. Zibọl+ sikwa na Shikem chụpụ Geel na ụmụnne ya. 42  N’echi ya, ndị Shikem si n’obodo ha pụta gawa n’ọhịa. E wee kọọrọ ya Abimelek. 43  O wee kpọrọ ndị agha ya, kee ha ụzọ atọ ma zoo chebiri ha n’ọhịa. Mgbe ọ hụrụ ka ndị mmadụ si n’obodo ahụ na-apụta, ọ lụsoro ha agha ma gbuo ha. 44  Abimelek na ndị agha so ya gbaara ọsọ gaa guzoro n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ. Ma ìgwè abụọ n’ime ndị agha ya lụsoro ndị niile nọ n’ọhịa agha ma gbuo ha. 45  Abimelek lụsoro obodo ahụ agha ụbọchị ahụ niile ma merie ya. O gburu ndị bi n’obodo ahụ, kwatuokwa ya+ ma wụọ ya nnu. 46  Mgbe ndị isi niile, bụ́ ndị bi n’ụlọ elu dị na Shikem, nụrụ ya, ha gara ozugbo n’ebe a rụsiri ike n’ụlọ* El-birit.+ 47  Ozugbo a kọọrọ Abimelek na ndị isi niile, bụ́ ndị bi n’ụlọ elu dị na Shikem, ezukọtala, 48  Abimelek na ndị niile so ya gbagooro n’Ugwu Zalmọn. Abimelek ji anyụike o ji n’aka gbutuo otu alaka osisi, tụkwasị ya n’ubu ya ma gwa ndị ahụ so ya, sị: “Ihe unu hụrụ m mere, meenụ ya ngwa ngwa.” 49  Ha niile wee gbutechaa otu alaka osisi ma soro Abimelek. Ha wee tụkwasị alaka osisi ndị ahụ n’ebe ahụ a rụsiri ike ma gbaa ebe ahụ a rụsiri ike ọkụ. Ndị niile bi n’ụlọ elu dị na Shikem wee nwụọ. Ha dị ihe dị ka otu puku (1,000) mmadụ, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị. 50  Abimelek wee gaa Tibez. Ọ lụsoro Tibez agha ma merie ya. 51  E nwere otu ụlọ elu siri ike dị n’etiti obodo ahụ, ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị niile na ndị niile bụ́ ndị isi obodo ahụ wee gbaba n’ime ya. Ha mechibidoro onwe ha ụzọ ma rịgoro n’elu ụlọ elu ahụ. 52  Abimelek gara n’ụlọ elu ahụ ka o bibie ya. O ruru nso n’ọnụ ụzọ ụlọ elu ahụ ka ọ gbaa ya ọkụ. 53  Otu nwaanyị wee tụọ Abimelek nkume e ji egwe nri n’isi, nkume ahụ akụrie ya isi.+ 54  Ọ kpọrọ onye na-eburu ya ngwá agha ozugbo, sị ya: “Mịrị mma agha gị gbuo m, ka ha ghara ikwu banyere m, sị, ‘Ọ bụ nwaanyị gburu ya.’” Onye na-ejere ya ozi wee magbuo ya. 55  Mgbe ndị Izrel hụrụ na Abimelek anwụọla, ha niile lara n’ụlọ ha. 56  Chineke si otú a kwụọ Abimelek ụgwọ ihe ọjọọ o mere nna ya, ya bụ, igbu ụmụnne ya iri asaa.+ 57  Chineke mekwara ka ndị Shikem jiri isi ha buru ihe ọjọọ niile ha mere. Ọnụ Jotam+ nwa Jerubel+ bụrụ ha wee mezuo n’isi ha.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “ndị nwe ala.”
Ma ọ bụ “otu ọkpụkpụ na otu anụ ahụ́.”
Ma ọ bụ “n’ụlọ arụsị.”
Na Hibru, “na-aṅagharị n’elu.”
Na Hibru, “na-aṅagharị n’elu.”
Na Hibru, “na-aṅagharị n’elu.”
Na Hibru, “ziga mmụọ na-adịghị mma n’etiti Abimelek na ndị isi Shikem.”
O nwere ike ịbụ Zibọl, onyeisi Shikem, ka a na-ekwu.
Ma ọ bụ “jiri aghụghọ.”
Ma ọ bụ “mee ya ihe ọ bụla ruru gị aka.”
Ma ọ bụ “n’ụlọ arụsị.”