Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Kọlọsi 3:1-25
3 Ma, ọ bụrụ na Chineke kpọlitere unu na Kraịst n’ọnwụ,+ na-achọnụ ihe ndị dị n’eluigwe, ebe Kraịst nọ ọdụ n’aka nri Chineke.+
2 Na-echenụ gbasara ihe ndị dị n’eluigwe,+ ọ bụghị ihe ndị dị n’ụwa.+
3 Unu anwụọla, ma, ndụ unu dị Kraịst n’aka n’ihi na ọ bụ ihe Chineke chọrọ.
4 Mgbe Kraịst, bụ́ ndụ anyị,+ mere ka a hụ ebube ya,* a ga-emekwa ka a hụ ebube unu na ya.+
5 N’ihi ya, meenụ ka ahụ́ unu nwụọ+ n’ihe gbasara ịkwa iko,* adịghị ọcha, ejideghị onwe unu ma agụụ mmekọahụ gụwa unu,+ ihe ọjọọ ịgụ unu agụụ, na anyaukwu, nke bụ́ ikpere arụsị.
6 Chineke ga-ewesa ndị na-eme ihe ndị a iwe.
7 Unu na-emebu ihe ndị a mgbe unu na-agbanwebeghị.+
8 Ma, ugbu a, unu kwesịrị ịkwụsị ihe ndị a: ọnụma, iwe, ihe ọjọọ,+ ịkparị mmadụ,+ na ikwu okwu rụrụ arụ.+
9 Unu agharala ibe unu ụgha.+ Yipụnụ àgwà ochie unu na-akpabu,*+
10 ma yirinụ àgwà* ọhụrụ,+ nke Chineke na-eme ka anyị na-akpa ma anyị mata ya nke ọma. Ọ bụ ya ga-eme ka àgwà anyị na-agbanwe, na-adị ka nke Chineke.+
11 Ihe a gbasara ma onye Grik ma onye Juu, ma onye e biri úgwù ma onye a na-ebighị úgwù, ma onye mba ọzọ ma onye Sitia,* ma ohu ma onye nweere onwe ya. Ma, Kraịst bụ ihe niile, anyị na ya dịkwa n’otu.+
12 Ebe ọ bụ na Chineke họọrọ unu,+ unu abụrụkwa ndị dị nsọ na ndị ọ hụrụ n’anya, yirinụ àgwà ndị a ka uwe: obi ebere,+ obiọma, obi umeala,+ ịdị nwayọọ,+ na ndidi.+
13 Na-edirinụ ibe unu ihe, na-agbagharakwanụ ibe unu kpamkpam+ ma e nwee onye ibe ya mejọrọ.+ Jehova* gbaghaara unu kpamkpam, unu kwesịkwara ịna-emere ibe unu otú ahụ.+
14 E wezụga ihe ndị a niile, yirinụ ịhụnanya ka uwe,+ n’ihi na ịhụnanya na-eme ka mmadụ niile dịrị n’otu.+
15 Kwenụ ka udo nke Kraịst na-achị obi unu,+ n’ihi na Chineke kpọrọ unu ka unu bụrụ otu ahụ́, nọrọkwa n’udo. Na-ekelekwanụ Chineke mgbe niile.
16 Kwenụ ka ihe Kraịst na-akụzi ju eju n’obi unu. Ọ ga-eme ka unu mara ihe. Jirinụ abụ ọma+ na abụ e ji eto Chineke, na nke e ji ekele ya, na-akụziri ibe unu ihe. Jirikwanụ ha na-agba ibe unu ume.* Jirinụ obi unu niile na-abụrụ Jehova* abụ.+
17 Ihe ọ bụla unu na-eme, ma n’okwu ọnụ ma n’omume, na-emenụ ya n’aha Onyenwe anyị Jizọs. Sikwanụ n’aha ya na-ekele Chineke bụ́ Nna.+
18 Ndị nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di unu.+ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị chọrọ.
19 Ndị bụ́ di, hụnụ nwunye unu n’anya mgbe niile.+ Unu ewesala ha iwe.*+
20 Ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi n’ihe niile,+ n’ihi na ọ na-amasị Onyenwe anyị.
21 Ndị nna, unu akpasula ụmụ unu iwe,+ ka ha ghara ịda mbà n’obi.
22 Ndị ohu, na-eruberenụ ndị nna unu ukwu* isi+ n’ihe niile. Unu erubela isi naanị ka ndị ọzọ hụ unu, ka obi dị ndị mmadụ ụtọ, kama jirinụ obi unu niile na-erubere ha isi iji gosi na unu na-akwanyere Jehova* ùgwù.
23 Jirinụ obi* unu niile na ike unu niile na-eme ihe ọ bụla unu na-eme, dị ka ùnu na-emere ya Jehova,*+ ọ bụghị mmadụ.
24 N’ihi na unu ma na ọ bụ Jehova* ga-akwụ unu ụgwọ ọrụ o kwere unu ná nkwa.+ Bụrụnụ ndị ohu Kraịst, bụ́ Nna unu ukwu.
25 N’eziokwu, a ga-akwụ onye na-eme ihe ọjọọ ụgwọ ihe ọjọọ ọ na-eme,+ n’ihi na Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Grik, “Mgbe a ga-eme ka Kraịst, bụ́ ndụ anyị, pụta ìhè.”
^ Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Na Grik, “mmadụ ochie na omume ya.”
^ Na Grik, “mmadụ.”
^ “Onye Sitia” pụtara onye ime ọhịa.
^ Ma ọ bụ “na-adụ ibe unu ọdụ.”
^ Ma ọ bụ “Unu emesila ha ike.”
^ Ndị nna ukwu a na-ekwu okwu ha ebe a bụ ndị mmadụ.
^ Gụọ Nkọwa Okwu, “mkpụrụ obi.”