Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Rom 1:1-32
1 Abụ m Pọl, ohu Kraịst Jizọs. A kpọrọ m ka m bụrụ onyeozi, a họpụtakwara m ka m kwusaa ozi ọma Chineke.+
2 Chineke si n’ọnụ ndị amụma ya kwe nkwa ozi ọma a n’Akwụkwọ Nsọ n’oge dị anya gara aga.
3 Ozi ọma a bụ banyere Ọkpara ya, onye a mụrụ n’ụwa n’ezinụlọ Devid.*+
4 Ma e si n’ike mmụọ nsọ mee ka a mara na ọ bụ Ọkpara Chineke+ mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ.+ Ọ bụ ya bụ Jizọs Kraịst Onyenwe anyị.
5 Anyị si n’aka ya nweta amara na ọrụ ịbụ ndịozi,+ ka anyị wee kpọọ ndị mba ọzọ niile ka ha nwee okwukwe ma na-erube isi+ ka e wee too aha Jizọs.
6 Unu so ná mba ndị ahụ, Chineke kpọkwara unu ka unu bụrụ nke Jizọs Kraịst.
7 Ana m edetara unu niile nọ na Rom akwụkwọ ozi, unu ndị Chineke hụrụ n’anya, ndị a kpọrọ ịbụ ndị nsọ:
Ka Chineke Nna anyị na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu.
8 M si n’aka Jizọs Kraịst na-ekelegodị Chineke m maka unu niile, n’ihi na a na-ekwu banyere okwukwe unu n’ụwa niile.
9 Chineke, onye m ji obi m niile na-efe ma na-ekwusa ozi ọma banyere Ọkpara ya, bụ onye akaebe m na m na-echeta unu mgbe niile n’ekpere m.+
10 Ana m arịọ na ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume, ọ bụrụkwa na ọ bụ uche Chineke, ka m mechaa bịakwute unu.
11 N’ihi na ọ na-agụsi m agụụ ike ịhụ unu, ka m nye unu onyinye si n’aka Chineke ka unu wee guzosie ike,
12 ma ọ bụ, e kwuo ya otú ọzọ, ka unu jiri okwukwe unu gbaa m ume,+ mụnwa ejirikwa okwukwe nke m gbaa unu ume.
13 Ma ụmụnna m, achọrọ m ka unu mara na ọtụtụ mgbe, m chọrọ ịbịakwute unu ka ozi ọma m ziri unu mịa ezigbo mkpụrụ otú ọ na-amị ná mba ndị ọzọ. Ma mgbe ọ bụla m chọrọ ịbịa, a na-enwe ihe na-egbochi m.
14 Eji m ndị niile ụgwọ, ma ndị Grik ma ndị ala ọzọ, ma ndị ma ihe ma ndị na-amaghị ihe.
15 N’ihi ya, ọ na-agụsi m agụụ ike izisakwara unu ndị bi na Rom ozi ọma.+
16 N’ihi na ihere ozi ọma ahụ anaghị eme m.+ N’eziokwu, ọ bụ ike Chineke ji azọpụta ndị niile nwere okwukwe.+ O bu ụzọ ruo ndị Juu aka,+ mechazie ruo ndị Grik.+
17 Ndị nwere okwukwe na-esi n’ozi ọma ahụ amata ezi omume Chineke, ọ na-emekwa ka ha na-enwekwu okwukwe+ otú e dere ya, sị: “Ma onye ezi omume ga-adị ndụ maka na o nwere okwukwe.”+
18 Chineke si n’eluigwe eme ka a mata iwe ọ na-ewesa+ ndị niile na-anaghị asọpụrụ ya na ndị ajọ omume niile, ndị na-eme ihe ndị na-adịghị mma ka ndị mmadụ wee ghara ịmata eziokwu ahụ.+
19 Ha kwesịrị ịma banyere Chineke maka na Chineke emeela ka ọtụtụ ihe doo ha anya.+
20 N’ihi na e leruo otú e si kee ụwa anya, a na-ahụ àgwà ya ndị a na-anaghị ahụ anya. Ihe ndị o kere na-eme ka a ghọta ụdị onye ọ bụ.+ Ha na-eme ka a mata na ike ya na-adịru ebighị ebi+ nakwa na ọ bụ Chineke.+ Ndị na-eleghara ihe ndị a anya enweghị ihe mere ha ga-eji kwuo na Chineke adịghị.
21 N’agbanyeghị na ha ma Chineke, ha etoghị ya otú e kwesịrị ito Chineke, ha ekeleghịkwa ya, kama ha chewere echiche ka ndị na-anaghị aghọta ihe, obi ha nke kpọchiri akpọchi gbakwara ọchịchịrị.+
22 Ọ bụ eziokwu na ha na-ekwu na ha ma ihe, ha ghọrọ ndị nzuzu
23 ma were otuto ha kwesịrị inye Chineke onye na-anaghị anwụ anwụ na-enye arụsị ndị yiri mmadụ na-anwụ anwụ, ndị yikwara nnụnụ, na anụ ndị nwere ụkwụ anọ, nakwa ihe ndị na-arị arị.*+
24 N’ihi ya, ebe ọ bụ na ha chọrọ ime ihe dị ha n’obi, Chineke hapụrụ ha ka ha mewe omume rụrụ arụ, ka ha wee merụọ onwe ha.
25 Ha ji eziokwu nke Chineke gbanwere okwu ụgha, na-efe ihe e kere eke, na-ejekwara ya ozi dị nsọ kama ijere Onye kere ihe niile ozi, onye a na-enye otuto ruo mgbe ebighị ebi. Amen.
26 Ọ bụ ya mere Chineke ji hapụ ha ka agụụ mmekọahụ na-eme ihere na-agụ ha.+ Ụmụ nwaanyị ha hapụrụ mmekọahụ nwoke na nwaanyị, ha na ụmụ nwaanyị ibe ha ana-enwezi mmekọahụ.+
27 Ụmụ nwoke hapụkwara mmekọahụ nwoke na nwaanyị, ahụ́ wee na-ere ha ọkụ ka ha na ụmụ nwoke ibe ha na-enwe mmekọahụ.+ Ụmụ nwoke na ụmụ nwoke wee na-eme ihe rụrụ arụ ma na-enweta ụgwọ ọrụ zuru ezu kwesịrị mmehie ha.+
28 Ebe ọ bụ na ha achọghị ịmata Chineke nke ọma, Chineke hapụrụ ha ka ha na-eche echiche na-adịghị mma, ka ha na-eme ihe na-ekwesịghị ekwesị.+
29 Ihe jukwara ha n’obi bụ omume niile na-ezighị ezi,+ ajọ omume, anyaukwu,+ ihe ọjọọ, na anyaụfụ.+ Ha na-egbukwa mmadụ,*+ na-ese okwu, na-aghọ aghụghọ,+ na-ebu iwe n’obi.+ Ha bụkwa ndị asịrị,
30 ndị na-ekwu okwu azụ,+ ndị kpọrọ Chineke asị, ndị na-akparị mmadụ, ndị mpako, ndị na-anya isi, ndị na-echepụta ihe ọjọọ, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi,+
31 ndị na-anaghị aghọta ihe,+ ndị na-anaghị emezu nkwa ha, ndị na-enweghị obi mmadụ, na ndị na-anaghị eme ebere.
32 Ha ma nke ọma na iwu ziri ezi Chineke nyere kwuru na ndị na-eme ihe ndị ahụ kwesịrị ọnwụ,+ ma ọ bụghị naanị na ha na-eme ha, kama ha na-akwado ndị na-eme ha.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Grik, “onye si ná mkpụrụ Devid.”
^ Ma ọ bụ “ihe ndị na-akpụ akpụ.”
^ Ma ọ bụ “na-egbukwa ọchụ.”