Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Rom 8:1-39

  • Mmụọ nsọ na-enye ndụ, na-emekwa ka mmadụ nwere onwe ya (1-11)

  • Mmụọ nke mere ka ha bụrụ ụmụ na-agbara ha àmà (12-17)

  • Ihe e kere eke na-atụ anya oge ụmụ Chineke ga-enwere onwe ha (18-25)

  • “Mmụọ nsọ na-arịọrọ anyị arịrịọ” (26, 27)

  • Ihe Chineke kpebiri tupu oge eruo (28-30)

  • Anyị na-emeri n’ihi na Chineke hụrụ anyị n’anya (31-39)

8  N’ihi ya, ikpe amaghị ndị ha na Kraịst Jizọs dị n’otu.  N’ihi na iwu nke mmụọ nsọ, nke na-enye ndị ha na Kraịst Jizọs dị n’otu ndụ, emeela ka unu nwere onwe unu+ n’iwu nke mmehie na iwu nke ọnwụ.  Ihe Iwu ahụ* na-enweghị ike ime+ maka na anụ ahụ́ adịghị ike+ ka Chineke mere. Otú o si mee ya bụ na o zitere Ọkpara ya+ ka ọ dịrị ka ụmụ mmadụ bụ́ ndị na-eme mmehie,+ ka o wee wepụ mmehie. O si otú a na-ama mmehie dị ụmụ mmadụ n’ahụ́ ikpe,  ka anyị wee na-eme ihe ndị Chineke kwuru e dere n’Iwu ahụ,*+ ghara ikwe ka anụ ahụ́ na-achị anyị, kama ka mmụọ nsọ na-edu anyị.+  Ndị na-ebi ndụ otú anụ ahụ́ chọrọ na-eche banyere ihe ga-adị anụ ahụ́ mma,+ ma ndị mmụọ nsọ na-edu na-eche banyere ihe ga-adị mmụọ nsọ mma.+  N’ihi na iche banyere ihe ga-adị anụ ahụ́ mma na-eweta ọnwụ,+ ma iche banyere ihe ga-adị mmụọ nsọ mma na-eweta ndụ na udo;+  n’ihi na iche banyere ihe ga-adị anụ ahụ́ mma na-eme ka mmadụ bụrụ onye iro Chineke,+ maka na anụ ahụ́ anaghị erubere iwu Chineke isi. N’eziokwu, ọ gaghị erubere ya isi.  N’ihi ya, ndị na-ebi ndụ otú anụ ahụ́ chọrọ agaghị emeli ihe dị Chineke mma.  Ma, ọ bụrụ n’eziokwu na mmụọ nsọ Chineke dị n’ime unu, unu agaghị na-eme ihe anụ ahụ́ chọrọ, kama mmụọ nsọ ga na-edu unu.+ Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla enweghị mmụọ nke Kraịst, onye ahụ abụghị onye nke ya. 10  Ma ọ bụrụ na unu na Kraịst dị n’otu,+ ahụ́ unu nwụrụ anwụ n’ihi mmehie, ma mmụọ nsọ na-enye unu ndụ n’ihi ezi omume. 11  Ọ bụrụ na mmụọ nke onye ahụ kpọlitere Jizọs n’ọnwụ dị n’ime unu, onye ahụ kpọlitere Kraịst Jizọs n’ọnwụ+ ga-ejikwa mmụọ ya nke dị n’ime unu mee ka ahụ́ unu nke na-anwụ anwụ dị ndụ.+ 12  N’ihi ya, ụmụnna m, anyị ji ụgwọ, ma ọ bụghị ụgwọ ibi ndụ otú anụ ahụ́ chọrọ.+ 13  N’ihi na ọ bụrụ na unu na-ebi ndụ otú anụ ahụ́ chọrọ, unu ga-anwụ. Ma ọ bụrụ na mmụọ nsọ enyere unu aka ka unu mee ka omume niile nke ahụ́ nwụọ,+ unu ga-adị ndụ.+ 14  N’ihi na ndị niile mmụọ Chineke na-edu bụ ụmụ Chineke n’eziokwu.+ 15  N’ihi na unu enwetaghị mmụọ nke na-eme ka unu gbawa ohu ma tụwa egwu, kama unu nwetara mmụọ nke mere ka unu bụrụ ụmụ. Mmụọ ahụ na-emekwa ka anyị na-eti mkpu, sị: “Aba,* Nna!”+ 16  Mmụọ nsọ na mmụọ anyị na-agbara anyị àmà+ na anyị bụ ụmụ Chineke.+ 17  Ma ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ Chineke, anyị ga-eketa ihe Chineke ga-ekenye anyị. Ọ ga-ekenye anyị ihe ahụ+ Kraịst ga-eketa ma ọ bụrụhaala na anyị na Kraịst atakọọ ahụhụ,+ ka e wee mee ka anyị na ya dịkọọ ebube.+ 18  N’ihi na m weere ya na ahụhụ ndị anyị na-ata n’oge a enweghị ihe ha bụ ma e jiri ha tụnyere ụgwọ ọrụ dị ebube anyị ga-enweta nke Chineke ga-eme ka a hụ.+ 19  N’ihi na ihe e kere eke* na-atụsi anya ike oge a ga-ekpughe ụmụ Chineke.+ 20  N’ihi na e mere ka ihe e kere eke* bụrụ ihe efu,+ ọ bụghị maka na ọ bụ uche ya, kama ọ bụ maka na ọ bụ uche onye mere ka ọ bụrụ ihe efu, ebe ọ bụ na e nwere olileanya 21  na a ga-emekwa ka ihe e kere eke* nwere onwe ya+ n’ohu ọ na-agbara ire ure. Ọ ga-enwere onwe ya n’ụzọ dị ebube ka ụmụ Chineke. 22  N’ihi na anyị ma na ihe niile e kere eke* na-asụkọ ude ọnụ, nọrọkwa n’ihe mgbu ruo ugbu a. 23  Ọ bụghị naanị nke ahụ, kama anyịnwa bụ́ ndị nwetara mkpụrụ mbụ ahụ, ya bụ, mmụọ ahụ, anyị na-asụkwa ude n’ime onwe anyị+ ka anyị na-echeresi ike ka e mee ka anyị bụrụ ụmụ,+ ka e jiri ihe mgbapụta tọhapụ ahụ́ anyị. 24  N’ihi na anyị nwere olileanya a mgbe a zọpụtara anyị. Ma ọ bụrụ na mmadụ ahụ ihe ọ na-ele anya ya, ọ naghịzi enwe olileanya ihe ahụ. N’ihi na ọ bụrụ na mmadụ ahụ ihe anya, ọ̀ ka ga na-atụ anya ya? 25  Ma ọ bụrụ na anyị na-ele anya+ ihe anyị na-anaghị ahụ anya,+ anyị na-eji ntachi obi echeresi ya ike.+ 26  Mmụọ nsọ na-enyekwara anyị aka mgbe anyị na-adịghị ike;+ n’ihi na e nwere mgbe anyị na-anaghị ama ihe anyị ga-ekpe n’ekpere. N’oge ndị ahụ, n’agbanyeghị na anyị amaghị otú anyị ga-esi ekwupụta ihe anyị na-asụrụ ude, mmụọ nsọ na-arịọrọ anyị arịrịọ. 27  Ma onye ahụ nke na-enyocha obi+ na-aghọta ihe mmụọ nsọ na-arịọ, n’ihi na ọ na-arịọrọ ya ndị nsọ otú Chineke si chọọ. 28  Anyị ma na Chineke na-eme ka ọrụ ya niile na-agakọ ọnụ ka ihe wee gaziere ndị hụrụ ya n’anya, ndị a kpọrọ otú bụ́ uche ya;+ 29  n’ihi na ọ bụ ndị mbụ ọ matara ka o kpebikwara tupu oge eruo na a ga-eme ka ha dịrị otú Ọkpara ya dị,+ ka Ọkpara ya wee bụrụ onye e bu ụzọ mụọ+ n’ime ọtụtụ ụmụnna.+ 30  Ndị o kpebiri tupu oge eruo+ bụkwa ndị ọ kpọrọ.+ Ndị ọ kpọrọ bụkwa ndị ọ kpọrọ ndị ezi omume.+ Ndị ọ kpọrọ ndị ezi omume bụ ndị o mekwara ka ha dị ebube.+ 31  Gịnịzi ka anyị ga-ekwu banyere ihe ndị a? Ọ bụrụ na Chineke nọnyeere anyị, ònye ga-emegide anyị?+ 32  Ebe ọ bụ na ọ zọghịdị Ọkpara ya, kama o nyefere ya maka anyị niile,+ ọ̀ bụ na ya na Ọkpara ya agaghịkwa eji obiọma nye anyị ihe niile ọzọ? 33  Ònye ga-ebo ndị Chineke họọrọ ebubo?+ E nweghị, n’ihi na ọ bụ Chineke bụ Onye na-akpọ ha ndị ezi omume.+ 34  Ònye ga-ama ha ikpe? E nweghị, n’ihi na ọ bụ Kraịst Jizọs bụ onye ahụ nwụrụnụ. Ọ bụghị naanị na ọ nwụrụ, kama a kpọlitekwara ya. Ọ nọ n’aka nri Chineke,+ ọ na-arịọkwara anyị arịrịọ.+ 35  Gịnị* ga-eme ka Kraịst kwụsị ịhụ anyị n’anya?+ Ọ̀ bụ ahụhụ, ka ọ̀ bụ nsogbu, ka ọ̀ bụ mkpagbu, ka ọ̀ bụ agụụ, ka ọ̀ bụ ịgba ọtọ, ka ọ̀ bụ ịnọ n’ọnụ ọnwụ, ka ọ̀ bụ mma agha?+ 36  Otú ahụ ka e dere ya, sị: “Ọ bụ n’ihi gị ka e ji na-egbu anyị mgbe niile. E werela anyị ka atụrụ a ga-egbu egbu.”+ 37  Ma n’ihe ndị a niile, anyị na-emeri+ n’ihi na onye ahụ hụrụ anyị n’anya na-enyere anyị aka. 38  N’ihi na ekwetara m na ọnwụ ma ọ bụ ndụ ma ọ bụ ndị mmụọ ozi ma ọ bụ ọchịchị ma ọ bụ ihe ndị dị ugbu a ma ọ bụ ihe ndị ga-abịa abịa ma ọ bụ ike+ 39  ma ọ bụ ihe ndị dị n’elu ma ọ bụ ihe ndị dị n’okpuru ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kere eke agaghị enwe ike ime ka Chineke kwụsị ịhụ anyị n’anya, bụ́ ịhụnanya Kraịst Jizọs Onyenwe anyị nwekwara.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, Iwu Mosis.
Ya bụ, Iwu Mosis.
Aba bụ okwu Hibru ma ọ bụ Arameik. Ọ pụtara “Nna!”
Ọ bụ ụmụ mmadụ ka a na-ekwu maka ha.
Ọ bụ ụmụ mmadụ ka a na-ekwu maka ha.
Ọ bụ ụmụ mmadụ ka a na-ekwu maka ha.
Ọ bụ ụmụ mmadụ ka a na-ekwu maka ha.
Ma ọ bụ “Ònye.”