Nehọm 1:1-15
1 Ihe Chineke kpebiri ime Ninive:+ Akwụkwọ e dere ọhụụ Nehọm,* onye Elkọsh:
2 Jehova bụ Chineke nke chọrọ ka a na-efe naanị ya ofufe.+ Ọ na-abọkwa ọbọ.
Jehova na-abọ ọbọ, na-ewekwa iwe.+
Jehova na-ata ndị iro ya ahụhụ.
Ọ na-ewesokwa ndị iro ya iwe.
3 Jehova anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ,+ ike ya dịkwa ukwuu.+
Ma Jehova agaghị ahapụ ịta onye mere mmehie ahụhụ kwesịịrị ya.+
Ụzọ ya dị n’ifufe nke na-ebibi ihe nakwa n’oké ifufe mmiri.
Ígwé ojii dịkwa ka uzuzu nke ụkwụ ya bọliri.+
4 Ọ na-abara oké osimiri mba,+ meekwa ka ọ taa.
Ọ na-eme ka osimiri niile taa.+
Beshan na Kamel na-akpọnwụ,+Okooko Lebanọn na-akpọnwụkwa.
5 Ugwu ukwu na-ama jijiji n’ihi ya.
Ugwu nta na-agbazekwa.+
Ụwa ga-ama jijiji n’ihi ihu ya.
Ala na ndị niile bi na ya ga-amakwa jijiji.+
6 Ònye ga-eguzoli ma iwe wee ya?+
Ònyekwa ga-eguzoli ma o bido iwe iwe?+
Ọnụma ya ga-enwu ka ọkụ.
A ga-akwatusịkwa oké nkume n’ihi ya.
7 Jehova dị mma.+ Ọ bụ ebe mgbaba n’ụbọchị nsogbu.+
Ọ ma* ndị na-agbaba n’ime ya.+
8 Ọ ga-eji idei mmiri nke na-asọ asọ kpochapụ Ninive.*
Ọchịchịrị ga-achụkwa ndị iro ya ọsọ.
9 Gịnị ka unu ga-agba izu ka unu mee Jehova?
Ọ ga-ebibi unu kpamkpam.
Ahụhụ agaghị adị nke ugboro abụọ.*+
10 N’ihi na ha na-agbakụ onwe ha dị ka osisi ogwu.
Ha dịkwa ka ndị mmanya* na-egbu.
Ma a ga-akpọ ha ọkụ dị ka okporo ọka kpọnwụrụ akpọnwụ.
11 Onye na-agba izu ka o mee Jehova ihe ọjọọ ga-esi n’ime gị pụta,Ọ ga-enyekwa ndụmọdụ na-abaghị uru.
12 Jehova kwuru, sị:
“N’agbanyeghị na ha siri ezigbo ike, dịkwa ọtụtụ,A ga-egbutu ha. Ha agaghịzikwa adị.*
Ataala m gị* ahụhụ, ma, agaghị m ata gị ahụhụ ọzọ.
13 M ga-agbaji osisi o ji ebu ihe nke dị n’ubu gị.+
M ga-adọbikwa agbụ e kere gị.
14 Jehova enyela iwu banyere gị,* sị,‘Ị gaghịzi enwe ụmụ ụmụ ndị ga-aza aha gị.
M ga-ebibi arụsị ndị a pịrị apị na ndị nke a kpụrụ akpụ n’ụlọ* chi gị niile.
M ga-egwu ili gị, n’ihi na ị baghị uru ọ bụla.’
15 Onye na-ezi ozi ọma si n’ugwu na-abịa.
Onye ahụ na-ekwu na udo adịla.+
Juda, mee ememme gị dị iche iche.+ Kwụọ ihe i kwere ná nkwa,N’ihi na onye na-abaghị uru agaghị alụso gị agha ọzọ.
A ga-ebibi ya kpamkpam.”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Nehọm pụtara “Onye Na-akasi Obi.”
^ Ma ọ bụ “na-elekọta.”
^ Na Hibru, “obodo ya.”
^ Ma ọ bụ “Naanị otu ugboro ezuorola ya ibibi unu.”
^ Ma ọ bụ “mmanya ọka wit.”
^ O nwere ike ịbụ, “A ga-alụsokwa ha agha.”
^ Ya bụ, Juda.
^ Ya bụ, Asiria.
^ Ma ọ bụ “n’ụlọikwuu.”