Nehọm 2:1-13

  • A ga-ala Ninive n’iyi (1-13)

    • “A ga-emeghe ọnụ ụzọ ámá osimiri” (6)

2  Onye na-achụsasị ndị mmadụ abịala ịlụso gị* agha.+ Cheenụ ebe ndị a rụsiri ike nche. Cheenụ ụzọ nche. Keenụ ájị̀ n’ume.* Gbaakwanụ mbọ ka unu sikwuo ike.   N’ihi na Jehova ga-eme ka Jekọb maa mma ọzọ,Meekwa ka Izrel maa mma ọzọ,N’ihi na ndị na-ebibi ihe ebibiela ha.+ Ha alaakwala alaka ha n’iyi.   E sijiri ọta ndị dike ya ka ha chawa ọbara ọbara. Ndị agha ya yi uwe na-acha uhie uhie.* Ígwè a rụnyere n’ụgbọ ịnyịnya agha ya na-egbuke ka ọkụN’ụbọchị ọ na-ejikere agha. A na-efegharịkwa ube ndị e ji osisi junipa pịa.   Ụgbọ ịnyịnya agha na-agba ara ara n’okporo ámá. Ha na-agbagharị n’ámá obodo. Ha na-enwu ka ọkụ, na-egbukekwa ka àmụ̀mà.   Ọ ga-akpọkọta ndị agha ya dị ike. Ha ga na-akpọ ihe ụkwụ ka ha na-aga. Ha ga-agaru ná mgbidi ya ọsọ ọsọ. Ha ga-arụ ihe ga-echebe ha.   A ga-emeghe ọnụ ụzọ ámá osimiri,Obí eze ya ga-adakwa.*   E kpebiela ya: A gbaala ya ọtọ. A kpụrụla ya laa. Ndị ohu ya nwaanyị na-ebe ákwá,Ka ha na-eti aka n’obi. Ákwá ha na-ada ka ubé nduru.   Ninive dị ka ọdọ mmiri malite n’ụbọchị o bidoro ịdị.+ Ma ndị mmadụ na-agbazi ọsọ. “Kwụsịnụ! Kwụsịnụ!” Ma o nweghị onye na-ele anya n’azụ.+   Bukọrọnụ ọlaọcha, bukọrọkwanụ ọlaedo. Akụ̀ ya enweghị ọgwụgwụ. O nwere ụdị akụ̀ niile bara ezigbo uru. 10  Obodo tọgbọ nkịtị, tọgbọrọkwa chakoo, e bibiekwala ya.+ Ezigbo ụjọ ji ha. Ikpere ha na-ama jijiji, úkwù ha na-amakwa jijiji. Ihu ha niile achagharịala. 11  Olee ebe ọgba ọdụm dị,+ ebe ọdụm na-anọ eri nri,Ebe ọdụm na-edu ụmụ ya agaN’enweghị onye na-emenye ha ụjọ? 12  Oké ọdụm na-adọrisịrị ụmụ ya anụ ga-ezuru ha. Ọ na-adọgbutere nne ọdụm anụ. Ọ na-eme ka anụ ọ dọgburu ju n’ọgba ya,Ọ na-eme ka anụ ọ dọrisịrị adọrisị ju n’ọgba ya. 13  Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị: “Ana m emegide gị.+ M ga-agba ụgbọ ịnyịnya agha gị ọkụ, ha akwụọ anwụrụ.+ Mma agha ga-egbuchapụ ọdụm gị niile. M ga-eme ka a gharazie inwe ndị ga-abụrụ gị anụ oriri n’ụwa. A gaghịkwa anụ olu ndị ozi gị ọzọ.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, Ninive.
Na Hibru, “Mee ka úkwù dị ike.”
Ma ọ bụ “ọbara ọbara.”
Ma ọ bụ “A ga-agbazekwa obí eze ya.”