Nehọm 3:1-19

  • “Obodo na-egbu mmadụ ga-ata ahụhụ” (1-19)

    • Ihe mere e ji ma Ninive ikpe (1-7)

    • A ga-ebibi Ninive otú e bibiri No-emọn (8-12)

    • O nweghị ihe ga-eme ka a ghara ibibi Ninive (13-19)

3  Obodo na-egbu mmadụ* ga-ata ahụhụ. Aghụghọ na ohi juru na ya. O nweghị mgbe ọ na-enweghị ndị o ji mere anụ oriri.   A na-anụ ụda ụtarị na mkpọtụ ụkwụ ụgbọ ịnyịnya na-eme. E nwekwara ịnyịnya na-awụ ọsọ na ụgbọ ya na-amali amali.   E nwere onye na-agba ịnyịnya nke nọ n’elu ịnyịnya, nweekwa mma agha nke na-egbuke egbuke na ube nke na-egbu maramara. Ìgwè ndị e gburu egbu na ozu juru ebe niile. E nweghị ike ịgụta ozu ndị mmadụ ọnụ. Ha na-akpọ ụkwụ n’ozu ndị nwụrụ anwụ wee daa.   Nke a bụ n’ihi ajọ akwụna nwaanyị akwụna na-agba. Ọ bụ nwaanyị mara ezigbo mma nke na-agba afa. O ji akwụna ọ na-agba na-amata mba dị iche iche n’ọnyà, jirikwa afa ọ na-agba na-amata ezinụlọ dị iche iche n’ọnyà.   Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị: “Ana m emegide gị.*+ M ga-achịli uwe mwụda gị, jiri ya wụchie gị ihu. M ga-eme ka mba dị iche iche hụ ọtọ gị,Meekwa ka alaeze dị iche iche hụ ihere e menyere gị.   M ga-ekpokwasị gị ihe rụrụ arụ. M ga-emekwa ka ị bụrụ ihe a na-asọ oyi. M ga-emekwa ka a gbaa gị nkiri.+   Onye ọ bụla hụrụ gị ga-agbara gị ọsọ,+ sịkwa,‘E bibiela Ninive! Ònye ga-emetere ya ebere?’ Ebee ka m ga-achọta ndị ga-akasi gị obi?   Ị̀ ka No-emọn* mma?+ Ọ bụ obodo nke dị n’akụkụ ọwa mmiri dị iche iche nke Naịl.+ Mmiri gbara ya gburugburu. Oké osimiri bụ akụ̀ ya, oké osimiri bụkwa mgbidi ya.   Ọ bụ Etiopia na Ijipt mere ka ọ na-akpa ike karịrị akarị. Pọt+ na ndị Libia nyekwaara ya* aka.+ 10  Ma, a dọọrọ ya n’agha,Ya agaa na-agba ohu n’ala ọzọ.+ A kụgburu ụmụ ya n’ebe niile ụzọ gbara mkpị.* Ha fekwara nza n’isi ndị ya a na-asọpụrụ. A tụọkwala ndị ukwu ya niile ịga. 11  Ị ga-aṅụbigakwa mmanya ókè.+ Ị ga-aga zoo. Ị ga-achọ ebe ị ga-agbaba ka onye iro gị ghara igbu gị. 12  Ebe gị niile a rụsiri ike dị ka osisi fig ndị mkpụrụ mbụ ha charala acha. Ọ bụrụ na a kwaa ha aka, mkpụrụ ha ga-adanye n’ọnụ onye ga-aracha ha. 13  “Ndị agha gị dị ka ụmụ nwaanyị. A ga-emeghere ndị iro gị ọnụ ụzọ ámá ala gị. Ọkụ ga-erepịa ihe e ji atụchi ọnụ ụzọ ámá gị. 14  Sepụtara onwe gị mmiri maka mgbe ndị agha ga-anọchibido gị.+ Mee ka ebe gị a rụsiri ike sikwuo ike. Banye n’apịtị, zọọkwa ájá. Buru ihe e ji akpụ brik. 15  Ọkụ ga-erepịakwa gị ebe ahụ. A ga-eji mma agha gbuo gị.+ Ha ga-ebibi gị dị ka ụmụ igurube si eripịa ihe.+ Gbaa mbọ ka ị dị ọtụtụ ka ụmụ igurube. Gbaa mbọ ka ị dị ọtụtụ ka igurube. 16  I meela ka ndị ahịa gị mụbaa karịa kpakpando ndị dị n’eluigwe. Nwa igurube na-ewe iwere, wee fepụ. 17  Ndị nche gị dị ka igurube. Ndị agha gị dịkwa ka ìgwè igurube. N’ụbọchị oyi, ha na-anọ ná mgbidi e ji nkume rụọ. Ma anwụ chawa, ha efepụ. O nweghịkwa onye ma ebe ha na-efega. 18  Eze Asiria, ndị na-azụrụ gị atụrụ na-ero ụra. Ndị gị a ma ama nọ n’ụlọ ha. A chụsasịala ndị gị n’ugwu. O nweghịkwa onye na-achịkọta ha.+ 19  O nweghị onye ga-enyere gị aka n’oké ọdachi dakwasịrị gị. Ọnyá na-aba gị agaghị ala ala. Ndị niile nụrụ akụkọ banyere ihe mere gị ga-akụ aka.+ N’ihi na ò nwere onye na-atabeghị ahụhụ maka na obi tara gị mmiri?”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “na-awụfu ọbara.”
Ya bụ, Ninive.
Ya bụ, Tibs.
Na Hibru, “gị.”
Na Hibru, “n’isi okporo ámá niile.”