Akwụkwọ Ozi E Degaara Taịtọs 3:1-15

  • Na-edonụ onwe unu n’okpuru ndị ọchịchị (1-3)

  • Dịrị njikere ịrụ ọrụ dị mma (4-8)

  • Zere arụmụka iberiibe na inwe òtù (9-11)

  • Ntụziaka na ekele (12-15)

3  Na-echetara ha ka ha na-edo onwe ha n’okpuru ndị ọchịchị na ndị nọ n’isi ma na-erubere ha isi,+ ka ha dị njikere ịrụ ọrụ ọma ọ bụla,  ka ha ghara ikwu okwu ọjọọ banyere onye ọ bụla, ghara ịbụ ndị okwu na ụka, kama ka ha na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị,+ jiri obi nwayọọ na-emeso mmadụ niile ihe mgbe niile.+  N’ihi na anyịnwa nwere mgbe anyị bụ ndị na-amaghị ihe, ndị na-enupụ isi, ndị e duhiere eduhie, ndị na-agbara ihe dị iche iche na-agụ anyị agụụ na ikpori ndụ ohu, ndị na-eme ihe ọjọọ na ndị na-enwere ndị ọzọ anyaụfụ, ndị omume ha jọgburu onwe ya, ndị kpọrọ ibe ha asị.  Ma, mgbe e mere ka obiọma Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Chineke,+ na ịhụnanya ọ hụrụ ụmụ mmadụ pụta ìhè  (ọ bụghị maka ọrụ ezi omume ọ bụla anyị rụrụ,+ kama ọ bụ n’ihi ebere ya),+ o si n’ahụ́ ọ sara anyị nke mere ka anyị dị ndụ+ nakwa mmụọ nsọ o ji mee ka anyị dị ọhụrụ zọpụta anyị.+  O si n’aka Jizọs Kraịst Onye Nzọpụta anyị wụkwasị anyị mmụọ nsọ a n’ụba,+  ka ọ ga-abụ mgbe a kpọrọ anyị ndị ezi omume n’ihi amara onye ahụ,+ anyị ga-eketa+ ndụ ebighị ebi anyị na-atụ anya ya.+  E kwesịrị ịtụkwasị okwu niile a obi, achọkwara m ka ị na-ekwusi okwu ha ike, ka ndị kweere na Chineke wee na-elekwasị anya n’ịrụ ọrụ dị mma mgbe niile. Ihe ndị a dị mma, ha bakwaara ndị mmadụ uru.  Ma zere arụmụka iberiibe na ịrụ ụka gbasara usoro ọmụmụ, zerekwa ise okwu na ịlụ ọgụ maka Iwu,* n’ihi na ha abaghị uru, ha bụkwa ihe efu.+ 10  Zere onye+ na-akwado inwe òtù+ ma ọ bụrụ na a dụọla ya ọdụ*+ nke mbụ na nke abụọ, 11  ebe ị ma na onye ahụ ahapụla ezigbo ụzọ ahụ ma na-eme mmehie, ọ maakwala onwe ya ikpe. 12  Mgbe m ga-ezitere gị Atemas ma ọ bụ Tikikọs,+ gbalịsie ike ka ị bịakwute m na Nikọpọlis, n’ihi na ọ bụ n’ebe ahụ ka m kpebiri ịnọ n’oge oyi. 13  Gbaa mbọ ka i nye Zinas, bụ́ onye ma Iwu,* nakwa Apọlọs ihe ndị dị ha mkpa, ka ihe ọ bụla ghara ịkọ ha na njem ha.+ 14  Ma, ka ụmụnna anyị mụtakwa ịna-arụ ọrụ dị mma ka ha nwee ike ịna-enyere ndị nọ n’ezigbo mkpa aka,+ ka ha wee na-arụpụta ihe dị mma.*+ 15  Ndị niile mụ na ha nọ na-ekele gị. Keleere m ndị hụrụ anyị n’anya, ndị bụ́ ụmụnna anyị n’okwukwe. Ka Chineke meere unu niile amara.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, Iwu Mosis.
Ma ọ bụ “a dọchaa ya aka ná ntị.”
Ya bụ, Iwu Mosis.
Na Grik, “na-amị mkpụrụ.”