Daniel 10:1-21

  • Onye ozi Chineke bịakwutere Daniel (1-21)

    • Maịkel nyeere mmụọ ozi aka (13)

10  N’afọ nke atọ n’ọchịchị Saịrọs+ Eze Peshia, e nwere ihe e mere ka Daniel, onye a na-akpọ Belteshaza,+ mata. Ihe ahụ bụ eziokwu. Ọ bụ gbasara agha dị egwu. Ọ ghọtara ihe ahụ, ghọtakwa ihe ọ hụrụ.  N’oge ahụ, mụnwa bụ́ Daniel nọ na-eru uju+ ruo izu atọ zuru ezu.  E nweghị ezigbo nri m riri, ataghị m anụ, aṅụghị m mmanya, eteghịkwa m mmanụ n’ahụ́ ruo izu atọ zuru ezu.  N’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa mbụ, mgbe m nọ n’akụkụ nnukwu osimiri, ya bụ, Osimiri Taịgris,*+  m leliri anya hụ otu onye yi uwe linin.+ O kekwara ájị̀ ọlaedo nke si Yufaz n’úkwù.  Ahụ́ ya na-egbuke egbuke ka nkume krisolaịt.+ Ihu ya na-enwu ka àmụ̀mà. Anya ya dị ka ọwa na-enwu ọkụ. Aka ya na ụkwụ ya yiri ọla kọpa na-egbuke egbuke,+ olu ya na-adasikwa ụda ike ka olu ìgwè mmadụ.  Ọ bụ naanị mụnwa bụ́ Daniel hụrụ ọhụụ ahụ. Ndị mụ na ha nọ ahụghị ya.+ Ma, ụjọ tụrụ ha nke ukwuu, ha agbapụ gaa zoo.  M wee nọrọ naanị m. Mgbe m hụrụ ọhụụ a dị egwu, ike gwụchara m, ihu m gbanwekwara. Ume ọ bụla afọghịzi m n’ahụ́.+  M wee nụ olu ya ka ọ na-ekwu okwu. Ma ka m nọ na-anụ ihe ọ na-ekwu, m kpudoro ihu n’ala, ezigbo ụra eburu m.+ 10  Ma, otu aka metụrụ m,+ kpọtee m, mee ka m bilie gbuo ikpere n’ala ma bido aka n’ala. 11  O wee sị m: “Daniel, nwoke a hụrụ n’anya nke ukwuu,*+ gee ntị n’ihe m na-agwa gị. Bilie, guzoro ọtọ n’ebe i guzobu n’ihi na e zitere m ka m bịakwute gị.” Mgbe ọ gwara m ihe a, ebiliri m, na-ama jijiji. 12  Ọ sịziri m: “Daniel, atụla egwu.+ Malite n’ụbọchị mbụ i ji obi gị chọwa ka ị ghọta ihe ndị a ma weda onwe gị ala n’ihu Chineke gị, a nụrụ ekpere gị. Abịakwala m n’ihi ya.+ 13  Ma onyeisi+ alaeze Peshia nọchiiri m ụzọ ruo ụbọchị iri abụọ na otu. Ma Maịkel,*+ otu n’ime ndị isi kachanụ, bịara inyere m aka. M nọkwa n’ebe ahụ n’akụkụ ndị eze Peshia. 14  M bịara ime ka ị ghọta ihe ga-eme ndị obodo gị n’oge ikpeazụ,+ n’ihi na ọhụụ a bụ maka ọdịnihu.”+ 15  Mgbe ọ gwara m ihe ndị a, m kpudoro ihu n’ala, ekwulighịkwa m okwu. 16  Otu onye nke yiri mmadụ metụziri egbugbere ọnụ m aka.+ M wee meghee ọnụ m gwa onye ahụ guzo m n’ihu, sị: “Onyenwe m, ahụ́ na-ama m jijiji n’ihi ihe m hụrụ n’ọhụụ, ike adịghịkwa m.+ 17  Oleezi otú ohu onyenwe m ga-esi agwa onyenwe m okwu?+ Ike gwụchara m. Anaghịzi m ekute ume.”+ 18  Onye ahụ nke yiri mmadụ metụrụ m aka ọzọ ma mee ka m dị ike.+ 19  Ọ sịziri m: “Atụla egwu,+ nwoke a hụrụ n’anya nke ukwuu.*+ Udo dịrị gị.+ Dị ike. M na-asị gị, dị ike.” Ka ọ nọ na-agwa m okwu, o mere ka m dị ike. M wee sị: “Onyenwe m kwuwe n’ihi na i meela ka m dị ike.” 20  O kwuziri, sị: “Ị̀ ma ihe mere m ji bịakwute gị? Ugbu a, m ga-agaghachi ka m lụso onyeisi Peshia ọgụ.+ M gawa, onyeisi Gris ga-abịa. 21  Ma, m ga-agwa gị ihe e dere n’akwụkwọ nke eziokwu. E nweghị onye na-akwadosi m ike n’ihe ndị a ma e wepụ Maịkel,+ onyeisi unu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Hidekel.”
Ma ọ bụ “e ji kpọrọ ihe nke ukwuu.”
Maịkel pụtara “Ònye Dị Ka Chineke?”
Ma ọ bụ “e ji kpọrọ ihe nke ukwuu.”