Daniel 11:1-45

  • Eze Peshia na eze Gris (1-4)

  • Eze ugwu na eze ndịda (5-45)

    • Onye na-ana ụtụ ga-agagharị (20)

    • E bibiri Onyeisi ọgbụgba ndụ ahụ (22)

    • A ga-eto chi nke obodo ndị a rụsiri ike (38)

    • Eze ugwu na eze ndịda ga-enurịta ibe ha aka (40)

    • Akụkọ si n’ebe ọwụwa anyanwụ na n’ebe ugwu ga-enye ya nsogbu (44)

11  “N’afọ nke mbụ n’ọchịchị Darayọs+ onye Midia, m biliri ka m nyere ya aka ma mee ka ọ dị ike.  Ihe m ga-agwa gị ugbu a bụ eziokwu: “Lee, eze atọ ọzọ ga-achị* na Peshia. Eze nke anọ ga-akpakọju akụnụba karịa ndị nke ọzọ niile. Ozugbo akụnụba ya mere ka o sie ike, ọ ga-eme ka ihe niile lụso alaeze Gris ọgụ.+  “Eze dị ike ga-eji ike dị ukwuu chịa,*+ ọ ga-emekwa ihe ọ bụla dị ya mma.  Ma mgbe ọ ga-achịwa,* a ga-agbajisị alaeze ya ma kesaara ya ifufe anọ nke eluigwe.+ Ma ọ bụghị ụmụ ya ka a ga-enye ya, ọ gaghịkwa esi ike otú ọchịchị nke ya siruru n’ike mgbe ọ na-achị, n’ihi na a ga-efopụ alaeze ya ma nyefee ya ndị ọzọ na-abụghị ndị a.  “Eze ndịda ga-adị ike, ya bụ, otu n’ime ndị o mere ndị isi. Ma e nwere onye ga-emeri ya ma jiri ike dị ukwuu nke karịrị nke ya chịwa.  “Mgbe afọ ole na ole gachara, ha ga-ejikọta aka. Ada eze ndịda ga-abịakwute eze ugwu ka ha kwekọrịta. Ma aka ada eze agaghị esiri ike na-aga. Eze ga-ada, ọ gaghịzi adị ike. A ga-enyefekwa ada eze na ndị kpọtara ya na onye mụrụ ya nakwa onye mere ka ọ dị ike n’oge ndị ahụ n’aka ndị ọzọ.  Otu onye nke si n’ezinụlọ* ada eze ga-amalite ịchị* wee nọchie eze. Ọ ga-abịakwute ndị agha ma lụso obodo a rụsiri ike nke eze ugwu agha. Ọ ga-alụso ha agha ma merie ha.  Ọ ga-eburukwa chi ha dị iche iche, arụsị ha ndị a kpụrụ akpụ, arịa ha ndị bara ezigbo uru e ji ọlaọcha na ọlaedo mee, kpụrụkwa ndị ọ dọtara n’agha, laa Ijipt. Ọ ga-enye eze ugwu ohere ruo afọ ole na ole.  Eze ugwu ga-abịa n’alaeze eze ndịda lụso ya ọgụ, ma ọ ga-alaghachi n’obodo ya. 10  “Ma ụmụ ya ga-ejikere agha ma chịkọta ọtụtụ ìgwè ndị agha. Otu n’ime ha* ga-abịa ma kpuchie ala ahụ ka idei mmiri. Ma ọ ga-alaghachi, ọ ga-alụrụkwa agha ruo n’obodo ya a rụsiri ike. 11  “Iwe ga-abịa eze ndịda, ọ ga-agakwa lụso eze ugwu agha. Ọ* ga-akpọkọta ọtụtụ ìgwè mmadụ, ma a ga-enyefe ìgwè mmadụ ahụ n’aka onye ahụ.* 12  A ga-akpụrụ ìgwè mmadụ ahụ pụọ. Ọ* ga-adị mpako. Ọ ga-eme ka iri puku kwuru iri puku mmadụ daa, ma e nweghị ihe ọ ga-eji nnukwu ike o nwere mee. 13  “Ma eze ugwu ga-abịaghachi chịkọta ìgwè mmadụ karịrị nke mbụ. Mgbe oge gafere, ya bụ, afọ ole na ole, ọ ga-akpọrọ ọtụtụ ìgwè ndị agha, burukwa ọtụtụ ihe bịa. 14  N’oge ndị ahụ, ọtụtụ ndị ga-alụso eze ndịda agha. “A ga-akpọrọkwa ndị tigbuo zọgbuo* n’ime ndị gị ka ha gbalịa mee ka ọhụụ mezuo. Ma ha ga-ada. 15  “Eze ugwu ga-abịa rụọ mgbidi gburugburu obodo a rụsiri ike, weghara ya. Ndị agha* eze ndịda agaghị eguzoli, ndị agha ya pụrụ iche agaghịkwa eguzo. Ike ịlụ agha agaghịkwa adị ha. 16  Onye na-abịa ịlụso ya agha ga-eme ihe dị ya mma, e nweghịkwa onye ga-alụsoli ya agha. Ọ ga-eguzoro n’Ala Mara Mma,*+ ọ ga-enwekwa ikike ibibi ndị mmadụ. 17  Ọ ga-ekpebisi ike iji ike niile o nwere n’alaeze ya bịa. Ya na ya ga-ekwekọrịta, ọ ga-emezukwa ihe dị ya n’obi. A ga-enye ya ikike ka o bibie nwaanyị nke ụmụ nwaanyị mụrụ. Nwaanyị ahụ ga-ada, gharazie ịbụ nke ya. 18  Ọ ga-atụgharị chee ihu n’ala ndị dị n’akụkụ osimiri, ọ ga-ewegharakwa ọtụtụ n’ime ha. Otu ọchịagha ga-eme ka mkparị ọ na-akparị ya kwụsị. A gaghịzi na-akparị ya. Ọchịagha ahụ ga-eme ka ọ bụrụzie onye ahụ ka a ga na-akparị. 19  Ọ ga-atụgharịzi chee ihu n’obodo ndị a rụsiri ike n’ala ya. Ọ ga-azọhie ụkwụ wee daa, a gaghịkwa ahụ ya. 20  “Onye ọzọ ga-anọchi ya wee chịwa. Onye ahụ ga-anọchi ya ga-eme ka onye na-anara ndị mmadụ ụtụ gagharịa n’alaeze mara mma. Ma mgbe ụbọchị ole na ole gafere, ọ ga-anwụ,* ma ọ gaghị abụ n’iwe ma ọ bụ n’agha. 21  “Onye a kpọrọ asị ga-anọchi ya wee chịwa, ha agaghịkwa akwanyere ya ùgwù e kwesịrị ịkwanyere onye na-achị n’alaeze ahụ. Ọ ga-abata n’oge obi ruru onye ọ bụla ala* ma jiri ire ụtọ nweta alaeze ahụ. 22  A ga-emeri ndị agha* ahụ yiri idei mmiri n’ihi onye ahụ, a ga-ebibikwa* ha, bibiekwa Onyeisi+ ọgbụgba ndụ ahụ.+ 23  Ebe ọ bụ na e nwere ndị ya na ha jikọrọ aka, ọ ga-aghọ aghụghọ ma bilie wee si n’aka obere mba ghọọ onye ukwu. 24  N’oge obi ruru onye ọ bụla ala,* ọ ga-abanye n’ebe ndị kacha mma n’ógbè ahụ ọ na-achị ma mee ihe nna ya hà na nna nna ya hà na-emeghị. Ọ ga-ekesara ha ihe ndị a kwatara n’agha na ngwongwo dị iche iche. Ọ ga-akpara ebe ndị a rụsiri ike nkata, ma ọ ga-abụ naanị ruo obere oge. 25  “Ọ ga-akata obi ma jiri ike ya niile chịrị ọtụtụ ndị agha gawa ịlụso eze ndịda agha. Eze ndịda ga-akwadebe maka agha, ọ ga-akpọkọtakwa imirikitiimi ndị agha dị ike. Ma ọ ga-ada maka na ha ga-akpara ya nkata. 26  Ndị na-eri nri ya ga-eme ka ọ daa. “Ma a ga-ekpochapụ ndị agha ya, a ga-egbukwa ọtụtụ ndị. 27  “Ndị eze abụọ a ga-eburu ihe ọjọọ ha chọrọ ime n’obi, ha ga-anọdụkwa ọdụ n’otu tebụl na-aghara ibe ha ụgha. Ma nkata ha na-akpa agaghị enwe isi n’ihi na ọgwụgwụ ga-abịa n’oge a kara aka.+ 28  “Ọ ga-eburu ọtụtụ ngwongwo laghachi n’ala ya, jirikwa obi ya niile lụso ọgbụgba ndụ ahụ dị nsọ ọgụ. Ọ ga-emezu ihe dị ya n’obi ma laghachi n’ala ya. 29  “N’oge a kara aka, ọ ga-agaghachi ma lụso ebe ndịda agha. Ma oge a agaghị adị ka oge mbụ, 30  n’ihi na ụgbọ mmiri Kitim+ ga-alụso ya agha, a ga-ewedakwa ya ala. “Ọ ga-alaghachi weso ọgbụgba ndụ ahụ dị nsọ oké iwe+ ma mezuo ihe dị ya n’obi. Ọ ga-alaghachikwa lebara ndị hapụrụ ọgbụgba ndụ ahụ dị nsọ anya. 31  Ndị agha* ga-esi n’ebe ọ nọ bilie. Ha ga-emerụ ebe nsọ,+ bụ́ ebe a rụsiri ike, wepụkwa àjà a na-achụ mgbe niile.+ “Ha ga-akwụwakwa ihe arụ nke na-akpata mbibi.+ 32  “Ọ ga-eji ire ụtọ* mee ka ndị na-emebi ọgbụgba ndụ ahụ kwụsị ife Chineke fewe chi ọzọ. Ma ndị ma Chineke ha ga-emeri, ha ga-emezukwa ihe dị ha n’obi. 33  Ndị ma ihe+ ná ndị mmadụ ga-eme ka ọtụtụ ndị nwee nghọta. A ga-ejikwa mma agha na ọkụ na ịdọrọ ha n’agha na ịkwakọrọ ihe ha mee ka ha zọhie ụkwụ ruo ụbọchị ole na ole. 34  Ma mgbe e mere ka ha zọhie ụkwụ, a ga-enyetụrụ ha aka. Ọtụtụ ndị ga-eji ire ụtọ* sonyere ha. 35  A ga-eme ka ụfọdụ n’ime ndị ahụ ma ihe zọhie ụkwụ, ka e wee nụchaa ndị mmadụ n’ihi ha, sachaakwa ndị mmadụ ma mee ka ha dị ọcha+ ruo n’oge ikpeazụ, n’ihi na ihe a ga-eme n’oge ikpeazụ a kara aka. 36  “Eze ga-eme ihe dị ya mma. Ọ ga-adị mpako ma bulie onwe ya elu karịa chi ọ bụla. Ọ ga-ekwu ihe na-awụ akpata oyi gbasara Chi kacha chi niile.+ Ihe ga-agara ya nke ọma ruo mgbe oge iwe gafere, n’ihi na ihe e kpebiri ga-emezurịrị. 37  E nweghị ihe ọ ga-eji Chi nna ya hà kpọrọ, e nweghịkwa ihe ọ ga-eji ihe na-agụ ụmụ nwaanyị agụụ kpọrọ. Ọ gaghị eji chi ọ bụla ọzọ kpọrọ ihe, ma ọ ga-ebuli onwe ya elu karịa onye ọ bụla. 38  Ọ ga-eto chi nke obodo ndị a rụsiri ike. Ọ ga-eji ọlaedo na ọlaọcha na nkume ndị dị oké ọnụ,* na ihe ndị bara ezigbo uru too chi nna ya hà na-amaghị. 39  Ọ ga-atụkwasị chi mba ọzọ obi wee* mezuo ihe o bu n’obi ime ebe dị iche iche a kacha rụsie ike. Ọ ga-akwanyere ndị na-akwado ya* ùgwù, ọ ga-emekwa ka ha chịa ọtụtụ ndị. Ọ ga-ekenyekwa onye ọ bụla kwụrụ ya ụgwọ ala. 40  “N’oge ikpeazụ, ya na eze ndịda ga-enurịta ibe ha aka.* Eze ugwu ga-ejikwa ụgbọ ịnyịnya na ọtụtụ ụgbọ mmiri duru ndị na-agba ịnyịnya bịa lụso ya agha. Ọ ga-abanye n’ala dị iche iche ma kpuchie ha ka idei mmiri. 41  Ọ ga-abanyekwa n’Ala Mara Mma,*+ a ga-emerikwa ọtụtụ ala. Ma, ndị ga-agbapụ n’aka ya bụ Ịdọm na Moab na ndị bụ́ isi ná ndị Amọn. 42  Ọ ga na-alụso ala dị iche iche ọgụ. Ma ala Ijipt agaghị agbapụ n’aka ya. 43  Akụ̀ ndị e zoro ezo na ọlaedo na ọlaọcha na ihe niile bara ezigbo uru* e nwere n’Ijipt ga-adịkwa n’aka ya. Ndị Libia na ndị Etiopia ga na-eso ya.* 44  “Ma akụkọ dị iche iche si n’ebe ọwụwa anyanwụ na n’ebe ugwu ga-enye ya nsogbu, ọ ga-ejikwa iwe na ọnụma gawa ka o kpochapụ ọtụtụ ndị ma laa ha n’iyi. 45  Ọ ga-ama ụlọikwuu ya nke dị ka obí eze n’agbata nnukwu oké osimiri na ugwu nsọ nke Ala Mara Mma.*+ Ọ ga-ala n’iyi, e nweghịkwa onye ga-enyere ya aka.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ga-ebili.”
Na Hibru, “bilie.”
Na Hibru, “ga-ebili.”
Na Hibru, “n’ome nke mgbọrọgwụ.”
Na Hibru, “ga-ebili.”
Na Hibru, “Ọ.”
O nwere ike ịbụ eze ugwu ka a na-ekwu.
O nwere ike ịbụ eze ndịda ka a na-ekwu.
Na Hibru, “Obi ya.”
Ma ọ bụ “ụmụ ndị ohi.”
Na Hibru, “Aka.”
Ma ọ bụ “Ihe E Ji Achọ Mma.”
Na Hibru, “a ga-agbaji ya.”
O nwere ike ịbụ, “mgbe ha na-atụghị anya ya.”
Na Hibru, “ga-agbaji.”
Na Hibru, “aka.”
O nwere ike ịbụ, “Mgbe ha na-atụghị anya ya.”
Na Hibru, “Aka.”
Ma ọ bụ “aghụghọ.”
Ma ọ bụ “aghụghọ.”
Ma ọ bụ “nkume ndị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “Chi mba ọzọ ga-enyere ya aka.”
O nwere ike ịbụ, “onye ọ bụla ọ ma.”
Ma ọ bụ “ga-asọrịta mpi.”
Ma ọ bụ “Ihe E Ji Achọ Mma.”
Ma ọ bụ “ihe ndị dị oké ọnụ.”
Ma ọ bụ “ga-anọ n’ụkwụ ya.”
Ma ọ bụ “Ihe E Ji Achọ Mma.”