Daniel 4:1-37

  • Eze Nebukadneza kwetara na Chineke bụ eze kachanụ (1-3)

  • Eze rọrọ otu osisi ná nrọ (4-18)

    • Oge asaa ga-agafe mgbe e gbutuchara osisi ahụ (16)

    • Chineke na-achị n’alaeze ndị mmadụ (17)

  • Daniel kọwara nrọ ahụ (19-27)

  • Amụma ahụ mezuru nke mbụ ya n’isi eze (28-36)

    • Isi akpakọghị eze ọnụ ruo oge asaa (32, 33)

  • Eze toro Chineke nke eluigwe (37)

4  “Ihe a bụ ozi Eze Nebukadneza na-ezigara ndị niile, mba dị iche iche, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche, bụ́ ndị bi n’ebe niile n’ụwa: Udo dịrị unu nke ukwuu.  Obi dị m ụtọ ịkọrọ unu ọrụ ebube na ihe ndị dị ịtụnanya Chineke Onye Kacha Elu meere m.  Ọrụ ebube ya na ihe ndị dị ịtụnanya ọ na-eme dị nnọọ ukwuu! Alaeze ya bụ alaeze na-adịru mgbe ebighị ebi, ọchịchị ya na-adịkwa malite n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+  “Mụnwa bụ́ Nebukadneza nọ n’ụlọ m, obi ruru m ala, ihe na-agakwara m nke ọma n’obí m.  Arọrọ m nrọ tụrụ m egwu. Mgbe m dina n’àkwà m,* ihe ndị m hụrụ nakwa ọhụụ m hụrụ menyere m ụjọ.+  N’ihi ya, m nyere iwu ka a kpọtara m ndị niile ma ihe na Babịlọn ka ha kọwaara m ihe nrọ m rọrọ pụtara.+  “N’oge ahụ, ndị dibịa anwansi, ndị dibịa afa, ndị Kaldia,* na ndị na-eji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu+ batara. Mgbe m kọọrọ ha nrọ m rọrọ, ha enweghị ike ịkọwara m ihe ọ pụtara.+  N’ikpeazụ, Daniel, onye e ji aha chi m+ gụọ Belteshaza,+ onye mmụọ nke chi dị iche iche dị nsọ na-akpa ike n’ime ya,+ batara. M wee kọọrọ ya nrọ ahụ, sị:  “‘Belteshaza, onyeisi ndị dibịa anwansi,+ ama m nke ọma na mmụọ nke chi dị iche iche dị nsọ na-akpa ike n’ime gị+ nakwa na e nweghị ihe nzuzo ọ bụla na-esiri gị ike.+ N’ihi ya, kọwaara m ihe ihe ndị m hụrụ ná nrọ pụtara. 10  “‘Mgbe m dina n’àkwà m,* m hụrụ ọhụụ. N’ọhụụ ahụ, m hụrụ otu osisi+ nke dị n’etiti ụwa, o tokwara ezigbo ogologo.+ 11  Osisi ahụ toro wee sie ike. O toruru n’eluigwe, a na-anọkwa n’ebe niile n’ụwa ahụ ya. 12  Akwụkwọ ya mara mma. Mkpụrụ ọ mịrị hiri nne. Nri si na ya na-ezuru ma mmadụ ma anụmanụ. Anụ ọhịa dị iche iche na-anọ na ndò dị n’okpuru ya, nnụnụ dị iche iche bikwa n’alaka ya. Ihe niile e kere eke* si na ya enweta ihe ha na-eri. 13  “‘Ka m dina n’àkwà m* na-ahụ ọhụụ, m hụrụ otu onye nche, onye dị nsọ, ka o si n’eluigwe na-agbadata.+ 14  O ji oké olu kwuo, sị: “Gbutuonụ osisi a.+ Gbukapụsịanụ alaka ya. Gbụchasịanụ akwụkwọ ya, tụsasịakwanụ mkpụrụ ya! Ka anụ ọhịa gbapụsịa n’okpuru ya, ka nnụnụ dị iche iche sikwa n’alaka ya fepụsịa. 15  Ma, hapụnụ úkwù osisi a na mgbọrọgwụ ya n’ala, n’etiti ahịhịa ndị dị n’ọhịa. Keekwanụ ya agbụ ígwè na agbụ ọla kọpa. Ka igirigi si n’eluigwe dee ya. Ka ya na anụ ndị bi n’ọhịa nọrọ n’etiti ahịhịa dị n’ala.+ 16  Ka a gbanwee obi ya ka ọ ghara ịbụkwa obi mmadụ. Ka e mee ka o nwee* obi anụ ọhịa, ka oge asaa+ gafeekwa.+ 17  Ọ bụ ndị nche nyere iwu a,+ ọ bụkwa ihe ndị nsọ kwuru ka e mee, ka ndị dị ndụ wee mara na ọ bụ Onye Kacha Elu na-achị n’alaeze ndị mmadụ.+ Ọ bụ onye ọ bụla ọ chọrọ ka ọ na-eme ka ọ chịwa, ọ na-emekwa ka onye kacha ala ná ndị mmadụ chịwa na ya.” 18  “‘Ọ bụ ihe a bụ nrọ mụnwa bụ́ Eze Nebukadneza rọrọ. Ugbu a, Belteshaza, kọwaara m ya n’ihi na ndị niile ọzọ ma ihe n’alaeze m enweghị ike ịkọwara m ihe ọ pụtara.+ Ma i nwere ike ịkọwa ya, n’ihi na mmụọ nke chi dị iche iche dị nsọ na-akpa ike n’ime gị.’ 19  “N’oge ahụ, egwu tụtụrụ Daniel, onye aha ya bụ Belteshaza.+ Ihe ọ na-eche n’obi ya* menyekwara ya ụjọ. “Eze wee sị ya, ‘Belteshaza, ekwela ka nrọ a na ihe ọ pụtara menye gị ụjọ.’ “Belteshaza sịrị ya, ‘Onyenwe m, ka nrọ a mezuo n’isi ndị kpọrọ gị asị. Ka ihe nrọ a pụtara mezuokwa n’isi ndị iro gị. 20  “‘Osisi ahụ ị hụrụ, nke toro ezigbo ogologo ma sie ike, nke toruru n’eluigwe, nke a na-anọ n’ebe niile n’ụwa ahụ,+ 21  nke akwụkwọ ya mara mma, nke mkpụrụ ọ mịrị hiri nne, nke nri si na ya na-ezuru ma mmadụ ma anụmanụ, nke anụ ọhịa dị iche iche bi n’okpuru ya, nke nnụnụ dị iche iche bikwa n’alaka ya,+ 22  bụ gị, eze, n’ihi na ị ghọọla onye ukwu ma dị ike. A na-anụ banyere ebube gị n’ebe niile. O ruola n’eluigwe,+ ọchịchị gị eruokwala n’ebe niile n’ụwa.+ 23  “‘Eze hụkwara onye nche, onye dị nsọ,+ ka o si n’eluigwe na-agbadata ma na-asị: “Gbutuonụ osisi ahụ, bibiekwanụ ya. Ma, hapụnụ úkwù ya na mgbọrọgwụ ya n’ala, n’etiti ahịhịa ndị dị n’ọhịa, keekwanụ ya agbụ ígwè na agbụ ọla kọpa. Ka igirigi si n’eluigwe dee ya, ka ya na anụ ọhịa nọrọ ruo mgbe oge asaa gafere.”+ 24  Eze, lekwa ihe ọ pụtara. Ọ bụ ihe Onye Kacha Elu kwuru nke ga-eme onyenwe m eze. 25  A ga-esi n’ebe ndị mmadụ bi chụpụ gị. Gị na anụ ndị bi n’ọhịa ga-ebi, ị ga na-atakwa ahịhịa ka ehi. Igirigi si n’eluigwe ga na-ede gị,+ oge asaa+ ga-agafekwa,+ ruo mgbe ị matara na ọ bụ Onye Kacha Elu na-achị n’alaeze ndị mmadụ, nakwa na ọ bụ onye ọ bụla ọ chọrọ ka ọ na-eme ka ọ chịwa.+ 26  “‘Ma ebe ọ bụ na ha kwuru ka a hapụ úkwù osisi ahụ na mgbọrọgwụ ya,+ ị ga-emecha chịwakwa n’alaeze gị mgbe ị matara na Chineke na-achị n’eluigwe.* 27  N’ihi ya, eze, biko, nabata ndụmọdụ m na-enye gị. Kwụsị mmehie ị na-eme, mewe ihe dị mma, hapụkwa ajọ omume mewere ndị ogbenye ebere. Ikekwe, ihe ka ga na-agaziri gị ruo ogologo oge.’”+ 28  Ihe a niile mere Eze Nebukadneza. 29  Mgbe ọnwa iri na abụọ gafere, ọ nọ na-agagharị n’elu ụlọ ya, n’obí ya dị na Babịlọn. 30  Eze nọ na-asị: “Ihe a ọ́ bụghị Babịlọn Ukwu nke m ji ike m na ume m rụọ ka ọ bụrụ obí eze, ka ọ bụrụkwa ihe a ga-eji na-akwanyere m nnukwu ùgwù?” 31  Ka eze ka kpụ okwu a n’ọnụ, otu olu si n’eluigwe kwuo, sị: “Eze Nebukadneza, a na-agwa gị, sị, ‘A napụla gị alaeze gị,+ 32  e sikwa n’ebe ndị mmadụ bi na-achụpụ gị. Gị na anụ ndị bi n’ọhịa ga-ebi. Ị ga na-ata ahịhịa ka ehi, oge asaa ga-agafekwa, ruo mgbe ị matara na ọ bụ Onye Kacha Elu na-achị n’alaeze ndị mmadụ, nakwa na ọ bụ onye ọ bụla ọ chọrọ ka ọ na-eme ka ọ chịwa.’”+ 33  Ozugbo ahụ, okwu ahụ mezuru n’isi Nebukadneza. E si n’ebe ndị mmadụ bi chụpụ ya. O wee malite ịta ahịhịa ka ehi. Igirigi nke si n’eluigwe nọ na-ede ya ahụ́ ruo mgbe ntutu isi ya toro ogologo ka ábụ́bà* ugo, mbọ́ ya etookwa ogologo ka mbọ́ nnụnụ.+ 34  “Mgbe oge ahụ gwụrụ,+ mụnwa, bụ́ Nebukadneza, leliri anya n’eluigwe, anya wee doo m. M wee too Onye Kacha Elu. M toro Onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, jaakwa ya mma, n’ihi na ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adịru mgbe ebighị ebi, alaeze ya na-adịkwa malite n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+ 35  E nweghị ihe ndị niile bi n’ụwa bụ ma e were ha tụnyere ya, ọ na-emekwa ihe bụ́ uche ya n’ebe ndị bi n’eluigwe na ndị bi n’ụwa nọ. E nweghịkwa onye ga-egbochili ya ime ihe ọ bụla+ ma ọ bụ sị ya, ‘Gịnị bụ ihe a i mere?’+ 36  “N’oge ahụ, anya bịaziri doo m. M wee dị ebube otú m dịbu n’alaeze m, a malitekwara ịkwanyere m ùgwù ma na-asọpụrụ m.+ Ndị ọkwá ha gbagotere ná ndị na-ejere m ozi nakwa ndị ọnụ na-eru n’okwu bịakwutewere m ka m gwa ha ihe ha ga-eme. E wee nyeghachi m alaeze m, e mekwara ka m dị ukwuu karịa otú m dịbu. 37  “Ugbu a, mụnwa bụ́ Nebukadneza na-eto Eze eluigwe, na-ebuli ya elu ma na-aja ya mma+ n’ihi na ọrụ ya niile dị mma, ọ na-ekpekwa ikpe ziri ezi.+ M na-etokwa ya n’ihi na o nwere ike iweda ndị dị mpako ala.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “n’ihe ndina m.”
Ya bụ, ndị bụ́ aka ochie n’ịgba afa nakwa n’iji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu.
Ma ọ bụ “n’ihe ndina m.”
N’Arameik, “Anụ ahụ́ niile.”
Ma ọ bụ “n’ihe ndina m.”
N’Arameik, “ka e nyekwa ya.”
N’Arameik, “Echiche ya.”
N’Arameik, “matara na eluigwe na-achị.”
Ma ọ bụ “ugbene.”