Daniel 6:1-28

  • Ndị isi ndị Peshia kpaara Daniel nkata (1-9)

  • Daniel akwụsịghị ikpe ekpere (10-15)

  • A tụbara Daniel n’olulu ọdụm (16-24)

  • Eze Darayọs toro Chineke Daniel (25-28)

6  Eze Darayọs kpebiri na ya ga-ahọpụta otu narị ndị setrap* na iri abụọ (120) ka ha na-elekọta alaeze ya niile.+  Eze họpụtakwara ndị isi atọ ka ha na-elekọta ọrụ ndị setrap*+ ahụ na-arụ. Ndị setrap a ga na-akọrọ ha otú ihe si aga, ka ihe ghara imebinahụ eze. Daniel so na mmadụ atọ a e mere ndị isi.+  Daniel nọ na-eme nke ọma karịa ndị nke ọzọ so ná ndị isi nakwa ndị setrap* ahụ n’ihi na mmụọ pụrụ iche na-akpa ike n’ahụ́ ya.+ Eze bukwa n’obi ime ya onyeisi n’alaeze ahụ niile.  N’oge ahụ, ndị ahụ so ná ndị isi nakwa ndị setrap* nọ na-achọ ihe ha ga-ebo Daniel na o mere n’alaeze ahụ. Ma e nweghị ihe ọ bụla ha hụrụ ha ga-ebo ya, e nweghịkwa ihe ọjọọ ọ bụla ha ga-asị na o mere n’ihi na ọ na-akwụwa aka ọtọ. Ọ naghị eleghara ọrụ ya anya, ọ naghịkwa arụrụ aka.  Ha kwuziri, sị: “E nweghị ihe ọ bụla anyị ga-ahụ anyị ga-ebo Daniel na o mere, ọ gwụla ma ànyị ga-ahụ ya n’ihe gbasara iwu Chineke ya.”+  N’ihi ya, ndị a so ná ndị isi na ndị setrap nukọọrọ n’ìgwè gakwuru eze. Ha gwara eze, sị: “Eze Darayọs, ị ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.  Ndị isi niile, ndị prifekt,* ndị setrap,* ndị ọkwá ha gbagotere ná ndị na-ejere eze ozi, nakwa ndị gọvanọ ekwekọrịtala ka eze tie iwu ka a ghara inwe onye ga-arịọ chi ọ bụla ma ọ bụ mmadụ ọ bụla ọzọ arịrịọ n’ime ụbọchị iri atọ ma e wepụ gịnwa, eze. Onye ọ bụla mere otú ahụ, a ga-atụba ya n’olulu ọdụm.+  Ugbu a, eze, bịanye aka n’akwụkwọ ka ọ bụrụ iwu,+ ka a ghara ịgbanwe ya agbanwe, n’ihi na a naghị agbanwe iwu ndị Midia na ndị Peshia agbanwe.”+  Eze Darayọs wee bịanye aka n’iwu ahụ. 10  Ma ozugbo Daniel matara na a bịanyela aka n’iwu ahụ, ọ lara n’ụlọ ya. Windo ọnụ ụlọ ya nke dị n’elu ghe oghe, cheekwa ihu n’ebe Jeruselem dị.+ Ugboro atọ n’ụbọchị, Daniel gburu ikpere n’ala kpee ekpere ma too Chineke ya, otú ọ na-eme mgbe niile tupu e tie iwu ahụ. 11  N’oge ahụ, ndị ahụ nubatara n’ụlọ Daniel ma hụ na ọ na-ekpe ekpere ma na-arịọ Chineke ya ka o meere ya amara. 12  Ha wee gakwuru eze ma chetara ya iwu ahụ o tiri. Ha sịrị ya: “Eze, ọ̀ bụ na ị bịanyeghị aka n’iwu nke kwuru ka a ghara inwe onye ga-arịọ chi ọ bụla ma ọ bụ mmadụ ọ bụla ọzọ arịrịọ n’ime ụbọchị iri atọ ma e wepụ gịnwa, nakwa na a ga-atụba onye ọ bụla mere otú ahụ n’olulu ọdụm?” Eze zara ha, sị: “Ee, o doro anya na ọ bụ ihe e kwuru n’iwu ndị Midia na ndị Peshia, nke a na-anaghị agbanwe agbanwe.”+ 13  Ha gwaziri eze ozugbo, sị: “Eze, Daniel, onye so ná ndị Juda a dọtara n’agha,+ erubereghị gị isi, o rubeghịkwa isi n’iwu ị bịanyere aka na ya. Kama, ọ na-ekpe ekpere ugboro atọ n’ụbọchị.”+ 14  Ozugbo eze nụrụ ihe a, o wutere ya nke ukwuu, o chewekwara otú ọ ga-esi anapụta Daniel. Ọ nọ na-agbalịsi ike ka ọ napụta ya ruo ná mgbede. 15  N’ikpeazụ, ha nuuru n’ìgwè bịakwute eze. Ha sịrị eze: “Eze, chetakwa na iwu ndị Midia na ndị Peshia kwuru na a gaghị agbanwe iwu ọ bụla eze tiri agbanwe.”+ 16  Eze nyeziri iwu, ha wee kpọta Daniel ma tụba ya n’olulu ọdụm.+ Eze gwara Daniel, sị: “Chineke gị, onye ị na-efe mgbe niile, ga-anapụta gị.” 17  E wee buru otu nkume mechie ọnụ olulu ahụ. Eze jikwa mgbaaka o ji aka ihe akara nakwa mgbaaka ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị ya ji aka ihe akara kaa ya akara, ka a ghara ịgbanwe ihe e kpebiri a ga-eme Daniel. 18  Eze gawaziri n’obí ya. N’abalị ahụ, o righị ihe ọ bụla, o kweghịkwa ege egwú ọ bụla,* ụra agaghịkwa ya n’anya.* 19  N’ikpeazụ, eze biliri n’isi isi ụtụtụ gawa n’olulu ọdụm ahụ ọsọ ọsọ. 20  Mgbe o rutewere n’olulu ahụ, ọ kpọrọ Daniel òkù. Olu o ji kpọọ Daniel gosiri na ihe merenụ wutere ya. Eze jụrụ Daniel, sị: “Daniel, ohu Chineke dị ndụ, Chineke gị, onye ị na-efe mgbe niile, ọ̀ napụtara gị n’ọnụ ọdụm?” 21  Ozugbo ahụ, Daniel sịrị eze: “Eze, ị ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. 22  Chineke m zitere mmụọ ozi ya wee mechie ọnụ ọdụm ndị a.+ Ha emeghị m ihe ọ bụla+ maka na aka m dị ọcha n’anya Chineke m. Eze, e nweghịkwa ihe ọjọọ m mere gị.” 23  Obi tọrọ eze ezigbo ụtọ. O wee nye iwu ka a kpọpụta Daniel n’olulu ahụ. Mgbe a kpọpụtara Daniel n’olulu ahụ, e nweghị ihe ọ bụla mere ya maka na ọ tụkwasịrị Chineke ya obi.+ 24  Eze nyeziri iwu, e wee kpọta ndị ahụ boro Daniel ebubo. A tụbara ha na ndị nwunye ha na ụmụ ha n’olulu ọdụm ahụ. Ha adarubeghị n’ala olulu ahụ mgbe ọdụm ndị ahụ kpaara ha aka dọrie ha ma tapịa ọkpụkpụ ha niile.+ 25  Eze Darayọs wee degara ndị niile, mba dị iche iche, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche, bụ́ ndị bi n’ebe niile n’ụwa, akwụkwọ ozi,+ sị: “Udo dịrị unu nke ukwuu! 26  M na-eti iwu ka ndị mmadụ na-atụ egwu Chineke Daniel n’ebe niile n’alaeze m.+ N’ihi na ọ bụ ya bụ Chineke dị ndụ, ọ na-adịkwa ndụ ruo mgbe ebighị ebi. A gaghị ebibi alaeze ya ebibi, ọchịchị ya na-adịrukwa mgbe ebighị ebi.+ 27  Ọ na-anapụta ndị ya+ ma na-agbapụta ha. Ọ na-arụkwa ọrụ ebube ma na-eme ihe ndị dị ịtụnanya n’eluigwe nakwa n’ụwa,+ n’ihi na ọ napụtara Daniel n’aka ọdụm.” 28  Ihe nọ na-agaziri Daniel n’alaeze Darayọs+ nakwa n’alaeze Saịrọs onye Peshia.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “e nweghị ndị egwú a kpọbatara.”
N’Arameik, “ụra ya gbanahụrụ ya.”