Daniel 7:1-28
7 N’afọ nke mbụ n’ọchịchị Eze Belshaza+ nke Babịlọn, Daniel rọrọ nrọ ma hụ ọhụụ mgbe o dina n’àkwà ya.*+ O wee dee nrọ ahụ n’akwụkwọ.+ O dechara ihe niile ọ hụrụ.
2 Daniel kwuru, sị:
“Mgbe m nọ na-ele ihe na-eme n’ọhụụ m nọ na-ahụ n’abalị, m hụrụ ka ifufe nke si n’akụkụ anọ nke eluigwe* nọ na-eme ka oké osimiri na-enugharị.+
3 Nnukwu anụ ọhịa anọ+ sikwa n’oké osimiri ahụ pụta, nke ọ bụla dịkwa iche n’ibe ya.
4 “Nke mbụ yiri ọdụm,+ o nwekwara nku ugo.+ M nọ na-ele anya ruo mgbe a kara ya nku. E si n’ala selie ya elu ma mee ka o jiri ụkwụ abụọ guzoro ka mmadụ, e mekwara ka o nwee* obi mmadụ.
5 “Ma lee, anụ ọhịa ọzọ pụtara. Ọ bụ nke abụọ. O yiri anụ ọhịa bea.+ E weliri otu akụkụ ya elu, ọ kpụkwa ọgịrịga atọ n’ọnụ, tagide ha ezé. A sịkwara ya, ‘Bilie, rie anụ buru ibu.’+
6 “Mgbe m hụchara nke ahụ, m nọkwa na-ele anya wee hụ anụ ọhịa ọzọ. O yiri agụ owuru,+ ma o nwere nku anọ n’azụ ya ka nnụnụ. Anụ ọhịa ahụ nwere isi anọ,+ e nyekwara ya ikike ka ọ chịwa.
7 “Mgbe m hụchara anụ ọhịa ahụ, m nọ na-ele ihe na-eme n’ọhụụ m nọ na-ahụ n’abalị, m wee hụ anụ ọhịa nke anọ. Ọ dị egwu ma na-emenye ụjọ, ọ dịkwa ike nke ukwuu. O nwere ezé ígwè ndị buru ibu. Ọ nọ na-atapịa ihe niile ọ hụrụ ma na-ebibi ha, o jikwa ụkwụ ya na-azọpịa ihe fọrọnụ.+ Ọ dị iche n’anụ ọhịa ndị ọzọ niile bu ya ụzọ, o nwekwara mpi iri.
8 Ka m nọ na-ele mpi ndị ahụ ma na-eche banyere ha, m hụrụ ka obere mpi ọzọ+ pulitere n’etiti ha. E fopụkwara mpi atọ n’ime mpi ndị mbụ ahụ n’ihu ya. Lee, anya ndị yiri anya mmadụ dị n’obere mpi a, e nwekwara ọnụ dị na ya nke na-etu ọnụ.+
9 “Anọ m na-ele anya ruo mgbe a dọsara ocheeze dị iche iche. Onye Ochie ahụ+ wee nọdụ ọdụ.+ Uwe ya na-enwu ọcha ka snoo.+ Ntutu isi ya dị ka owu dị ọcha. Ocheeze ya bụ ire ọkụ ire ọkụ. Ụkwụ ocheeze ya bụ ọkụ na-ere ere.+
10 Ọkụ nke na-asọ asọ ka mmiri si n’ihu ocheeze ya na-asọpụta.+ Puku kwuru puku ndị mmụọ ozi nọ na-ejere ya ozi, iri puku kwuru iri puku ndị mmụọ ozi guzokwa n’ihu ya.+ Ụlọikpe a+ malitere ikpe ikpe, a saghekwara akwụkwọ dị iche iche.
11 “N’oge ahụ, anọ m na-ele anya n’ihi ọnụ mpi ahụ nọ na-etu.+ M nọ na-ele anya ruo mgbe e gburu anụ ọhịa ahụ, tụba ozu ya n’ọkụ ahụ ma bibie ya.
12 Ma a napụrụ anụ ọhịa ndị nke ọzọ+ ọchịchị ha, a hapụkwara ha ka ha nọtụ ndụ ruo otu oge nakwa mgbe a kara aka.
13 “Anọ m na-ele ihe na-eme n’ọhụụ m nọ na-ahụ n’abalị, ma lee, onye yiri nwa nke mmadụ+ nọ na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe. E kwere ka ọ banye n’ebe Onye Ochie ahụ nọ.+ E wee kpọrọ ya bịa nso n’ihu Onye ahụ.
14 E nyere ya ọchịchị,+ mee ka a na-akwanyere ya ùgwù,+ nyekwa ya alaeze, ka ndị dị iche iche, ndị si ná mba dị iche iche, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche na-ejere ya ozi.+ Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adịru mgbe ebighị ebi, nke na-agaghị akwụsị akwụsị. A gaghịkwa ebibi alaeze ya ebibi.+
15 “Ma obi ezughị mụnwa, bụ́ Daniel, ike n’ihi na ọhụụ ndị ahụ m hụrụ menyere m ụjọ.+
16 M jekwuuru otu n’ime ndị ahụ guzo ọtọ n’ebe ahụ ka m jụta ya ihe ihe ndị a m hụrụ pụtara n’eziokwu. O wee zaa m ma kọwaara m ihe ha pụtara.
17 “‘Nnukwu anụ ọhịa anọ ndị a+ bụ ndị eze anọ ndị ga-achị* n’ụwa.+
18 Ma ndị nsọ nke Onye Kacha Elu+ ga-enweta alaeze ahụ.+ Alaeze ahụ ga-abụkwa nke ha+ ruo mgbe ebighị ebi, ruokwa mgbe niile ebighị ebi.’
19 “M chọziri ịmatakwu banyere anụ ọhịa nke anọ ahụ, nke dị iche ná ndị nke ọzọ niile. Anụ ọhịa ahụ na-emenye ụjọ nke ukwuu. O nwere ezé ígwè, mbọ́ ya bụkwa ọla kọpa. Ọ nọ na-atapịa ihe niile ọ hụrụ ma na-ebibi ha, o jikwa ụkwụ ya na-azọpịa ihe fọrọnụ.+
20 M chọkwara ịmatakwu banyere mpi iri ahụ+ dị ya n’isi nakwa banyere mpi nke ọzọ puliterenụ, nke mekwara ka mpi atọ daa,+ ya bụ, mpi ahụ nke nwere anya na ọnụ nke na-etu ọnụ, nke bukwara ibu karịa mpi ndị nke ọzọ.
21 “Anọ m na-ele anya mgbe mpi ahụ lụsoro ndị nsọ ahụ agha, ọ nọkwa na-emeri ha,+
22 ruo mgbe Onye Ochie ahụ+ bịara, e wee kpelaara ndị nsọ nke Onye Kacha Elu ikpe.+ Oge a kara aka rukwara ka ndị nsọ ahụ nweta alaeze ahụ.+
23 “Ihe a bụ ihe o kwuru: ‘Banyere anụ ọhịa nke anọ ahụ, e nwere alaeze nke anọ nke ga-achị n’ụwa. Ọ ga-adị iche n’alaeze ndị nke ọzọ niile. Ọ ga-atapịa ụwa niile, zọpịa ya ma bibie ya.+
24 Banyere mpi iri ahụ, ndị eze iri ga-esi n’alaeze ahụ chịwa.* Eze ọzọ ga-achịkwa* mgbe ha chịchara. Ọ ga-adị iche ná ndị nke mbụ, ọ ga-emerikwa ndị eze atọ.*+
25 Ọ ga-ekwutọ Onye Kacha Elu,+ ọ ga na-enyekwa ndị nsọ nke Onye Kacha Elu nsogbu. Ọ ga-achọ ka ọ gbanwee oge na iwu, a ga-enyefekwa ha n’aka ya ruo otu oge, oge abụọ, na ọkara otu oge.*+
26 Ma Ụlọikpe ahụ malitere ikpe ikpe. Ha wee napụ ya ọchịchị ya, ka e wee laa ya n’iyi ma bibie ya kpamkpam.+
27 “‘E nyere ndị nsọ nke Onye Kacha Elu alaeze na ọchịchị na ebube nke alaeze ndị dị n’ụwa* niile.+ Alaeze ha bụ alaeze na-adịru mgbe ebighị ebi,+ ọchịchị niile ga-ejekwara ha ozi ma rubere ha isi.’
28 “Ebe a ka ihe m hụrụ na ihe m nụrụ gwụrụ. Ihe mụnwa, bụ́ Daniel, na-eche menyeziri m ụjọ nke ukwuu nke na ihu m gbanwere. Ma, m buuru ihe ndị a n’obi.”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “n’ihe ndina ya.”
^ N’Arameik, “ifufe anọ nke eluigwe.”
^ N’Arameik, “e nyekwara ya.”
^ N’Arameik, “ga-ebili.”
^ N’Arameik, “bilie.”
^ N’Arameik, “ga-ebili.”
^ N’Arameik, “ga-eweda ndị eze atọ ala.”
^ Ya bụ, oge atọ na ọkara.
^ N’Arameik, “n’okpuru eluigwe.”