Esta 1:1-22

  • Oriri eze Ahazuirọs mere na Shushan (1-9)

  • Vashtaị nwunye eze nupụụrụ eze isi (10-12)

  • Eze jụrụ ndị ma omenala ihe a ga-eme Vashtaị (13-20)

  • E zipụrụ akwụkwọ ozi e dere ihe eze kwuru (21, 22)

1  Ihe a mere n’oge Ahazuirọs na-achị,* ya bụ, Ahazuirọs onye na-achị otu narị ógbè* na iri abụọ na asaa (127),+ malite n’India ruo n’Etiopia.*  N’oge ahụ, Eze Ahazuirọs nọ na Shushan,*+ bụ́ ebe obí ya dị.*  N’afọ nke atọ n’ọchịchị ya, o meere ndị isi ọchịchị ya niile na ndị niile na-ejere ya ozi oriri. Ndị agha Peshia+ na Midia,+ ndị a ma ama, na ndị isi nke ógbè* dị iche iche bịakwara oriri ahụ.  O jikwa ọtụtụ ụbọchị, otu narị ụbọchị na iri asatọ (180), gosi ha akụnụba alaeze ya dị ebube na ihe mere e ji asọpụrụ ya nakwa otú ọ dịruru ukwuu.  Mgbe ụbọchị ndị a gachara, eze ji ụbọchị asaa meere ndị niile nọ na Shushan,* bụ́ ebe obí ya dị,* oriri n’ogige dị n’obí eze, ma ndị ukwu ma ndị nta.  Ihe ndị e ji chọọ ogige ahụ mma bụ ákwà ọcha na ákwà na-acha anụnụ anụnụ e kere ụdọ e ji ákwà ọcha na ogho pọpụl kpaa. E kegidere ha n’ọlaọcha dị okirikiri nke dị n’ogidi e ji mabụl rụọ. Àkwà* ndị e ji ọlaedo na ọlaọcha rụọ dịkwa na pevment e ji nkume pọfiri, mabụl, nkume pel, na mabụl ojii rụọ.  E ji iko* ọlaedo gbanyere ndị mmadụ mmanya ha ṅụrụ. Iko nke ọ bụla dịkwa iche n’ibe ya. Mmanya eze bupụtara hiri nne maka na ọ bụ eze.  Otú e si hazie oriri ahụ bụ na o nweghị onye a ga-amanye ka ọ ṅụọ mmanya, maka na eze gwara ndị na-eje ozi n’obí ya ka onye ọ bụla mee ihe masịrị ya.  Vashtaị bụ́ nwunye eze+ mekwaara ụmụ nwaanyị nọ n’ụlọ* Eze Ahazuirọs oriri. 10  N’ụbọchị nke asaa, mgbe obi bụ eze sọ aṅụrị n’ihi mmanya ọ ṅụrụ, ọ gwara Mehuman, Bizta, Habona,+ Bigta, Abagta, Zita, na Kakas, mmadụ asaa ndị na-eje ozi n’obí eze, bụ́ ndị na-ejere Eze Ahazuirọs ozi, 11  ka ha kpọtara ya Vashtaị, bụ́ nwunye eze, mgbe o kpuuru okpu nwunye eze na-ekpu, ka o gosi ndị dị iche iche na ndị isi mma ya, n’ihi na ọ mara ezigbo mma. 12  Ma Vashtaị, bụ́ nwunye eze, jụrụ ịbịa za òkù eze dunyere ndị na-eje ozi n’obí ya ka ha kpọọ ya. Eze wee wee ezigbo iwe, ọnụma ejukwa ya obi. 13  Eze wee jụọ ndị ma gbasara omenala oge ahụ ihe ha chere a ga-eme. (Ụdị ihe a mee, eze na-agakwuru ha n’ihi na iwu na ikpe ikpe doro ha anya. 14  Ndị kacha anọ ya nso bụ Kashina, Shita, Admeta, Tashish, Mires, Masina, nakwa Memukan. Ha bụ ndị isi asaa+ e nwere na Peshia na Midia. Ha na-abịa ahụ eze mgbe niile. Ọkwá ha kachakwa n’alaeze ahụ). 15  Eze jụrụ ha, sị: “Gịnị ka iwu kwuru ka e mee Vashtaị, bụ́ nwunye eze, n’ihi na o meghị ihe mụnwa bụ́ Eze Ahazuirọs gwara ya, ihe m dunyere ndị na-eje ozi n’obí m ka ha gwa ya?” 16  Memukan wee gwa eze na ndị isi, sị: “Ọ bụghị naanị eze ka Vashtaị bụ́ nwunye eze mejọrọ.+ Kama, o mejọkwara ndị isi niile na ndị niile nọ n’ógbè* niile Eze Ahazuirọs na-achị. 17  N’ihi na ụmụ nwaanyị niile a lụ alụ ga-anụ ihe a nwunye eze mere, ha ga na-eleda di ha anya, sịkwa, ‘Eze Ahazuirọs kwuru ka a kpọtara ya Vashtaị bụ́ nwunye eze, ma o kweghị aga.’ 18  Taakwa, ndị nwunye ndị isi Peshia na Midia, ndị ma gbasara ihe a nwunye eze mere, ga-ejikwa ya na-agwa ndị niile eze mere ndị isi okwu. Ọ ga-emekwa ka mkparị na esemokwu ju ebe niile. 19  Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ka eze nye iwu, ka e denyekwa ya n’iwu ndị Peshia na Midia a na-anaghị agbanwe agbanwe,+ na Vashtaị agaghịzi abịa n’ihu Eze Ahazuirọs. Ka eze jiri nwaanyị ọzọ ka ya mma dochie ya, ka nwaanyị ahụ bụrụzie nwunye eze. 20  Mgbe ndị niile nọ ebe niile eze na-achị ga-anụ iwu a eze ga-eti, ụmụ nwaanyị niile a lụ alụ ga na-asọpụrụ di ha, ma hà bụ ndị ukwu ma hà bụ ndị nta.” 21  Ihe a Memukan kwuru dị eze na ndị o mere ndị isi mma. Eze wee mee ya. 22  O zigara akwụkwọ ozi n’ógbè* niile ọ na-achị,+ ógbè* nke ọ bụla n’otú ha si ede ihe, ndị ọ bụlakwa n’asụsụ ha. Ka onye ọ bụla bụ́ di bụrụ onyeisi n’ezinụlọ ya, ka ọ bụrụkwa asụsụ ya ka a ga na-asụ n’ezinụlọ ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọ dị ka ọ̀ bụ ya bụ Zaksis nke Mbụ, nwa Darayọs Onye Ukwu (Darayọs Histaspis).
Ma ọ bụ “mpaghara.”
Ma ọ bụ “Kush.”
Ma ọ bụ “Susa.”
Ma ọ bụ “ebe a rụsiri ike.”
Ma ọ bụ “mpaghara.”
Ma ọ bụ “ebe a rụsiri ike.”
Ma ọ bụ “Susa.”
Ma ọ bụ “Ihe ndina.”
Ma ọ bụ “arịa.”
Ma ọ bụ “n’obí eze.”
Ma ọ bụ “ná mpaghara.”
Ma ọ bụ “ná mpaghara.”
Ma ọ bụ “mpaghara.”