Esta 10:1-3

  • Mọdekaị bụzi nnukwu mmadụ (1-3)

10  Eze Ahazuirọs manyere ndị bi n’ala ahụ na ndị bi n’agwaetiti niile nke oké osimiri ka ha na-arụrụ ya ọrụ.  Ọ bụ n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge+ ndị eze Midia na Peshia+ ka e dere ihe niile Mọdekaị+ rụrụ na ike niile ọ kpara nakwa ihe niile a kọrọ banyere otú eze si bulie ya n’ọkwá.+  Ọ bụ Mọdekaị onye Juu na-esote Eze Ahazuirọs n’ọkwá. Ọ bụkwa nnukwu mmadụ n’anya ndị Juu.* Ụmụnne ya niile na-akwanyekwara ya ùgwù. Ọ na-arụkwara ndị ya ihe na-abara ha uru, na-achọkwa ọdịmma ụmụ ha niile.*

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Ndị Juu na-akwanyekwara ya ùgwù.”
Na Hibru, “na-ekwukwa okwu udo maka ụmụ ha niile.”