Esta 2:1-23

  • A malitere ịchọ onye ga-abụzi nwunye eze (1-14)

  • Esta mechara bụrụ nwunye eze (15-20)

  • Mọdekaị gbara ndị kpara nkata igbu eze n’anwụ (21-23)

2  Mgbe ihe ndị a gachara, mgbe iwe Eze Ahazuirọs+ dajụrụ, o chetara ihe Vashtaị mere+ nakwa ihe e kpebiri a ga-eme ya.+  Ndị na-ejere eze ozi wee sị: “Ka a chọtara eze ụmụ agbọghọ mara mma, ndị na-amaghị nwoke.  Ka eze họpụtakwa ndị mmadụ n’ógbè* niile ọ na-achị,+ ka ha kpọta ụmụ agbọghọ niile mara mma, ndị na-amaghịkwa nwoke, na Shushan,* bụ́ ebe obí eze dị,* n’ụlọ ụmụ nwaanyị.* Ka a kpọnyekwa ha Hegaị bụ́ ọnaozi eze, onye na-elekọta ụmụ nwaanyị, ka ọ na-elekọta ha.+ Ka e nyekwa ha ihe ndị ha ga-eji na-achọ mma.*  Nwa agbọghọ nke kacha dị eze mma ga-anọchi Vashtaị, bụrụzie nwunye eze.”+ Aro a dị eze mma, ọ bụkwa ihe o mere.  E nwere otu nwoke onye Juu nọ na Shushan,*+ bụ́ ebe obí eze dị.* Aha ya bụ Mọdekaị.+ Ọ bụ nwa Jeya nwa Shimiaị nwa Kish, onye ebo Benjamin.+  O so ná ndị e si na Jeruselem dọrọ n’agha mgbe Nebukadneza eze Babịlọn dọọrọ Jekonaya*+ bụ́ eze Juda n’agha.  Ọ bụ ya na-elekọta Hadasa, ya bụ, Esta, nwa nwanne nna ya,+ n’ihi na o nweghị ma nne ma nna. Nwa agbọghọ a mara mma, bụrụkwa asampete. Ma mgbe nne ya na nna ya nwụrụ, Mọdekaị kpọọrọ ya na-azụ ya ka nwa ya nwaanyị.  Mgbe a kpọsara ihe eze kwuru na iwu o nyere, mgbe a kpọtakwara ọtụtụ ụmụ agbọghọ na Shushan,* bụ́ ebe obí eze dị,* wee nyefee ha n’aka Hegaị,+ a kpọtakwara Esta n’ụlọ* eze ma nyefee ya n’aka Hegaị onye na-elekọta ụmụ nwaanyị.  Nwa agbọghọ ahụ dị Hegaị mma. Ihe ya masịkwara ya.* N’ihi ya, o mere ngwa ngwa hazie ka e nye ya ihe ọ ga-eji na-achọ mma*+ na ihe ọ ga na-eri. O sikwa n’ụlọ eze họta ụmụ agbọghọ asaa ga na-ejere ya ozi. Ọ kpọfekwara ya na ụmụ agbọghọ ya ebe kacha mma n’ụlọ ụmụ nwaanyị.* 10  Esta emeghị ka a mata onye ebe ọ bụ+ ma ọ bụ ndị bụ́ ndị ikwu ya, n’ihi na Mọdekaị+ gwara ya ka ọ ghara ịgwa onye ọ bụla.+ 11  Kwa ụbọchị, Mọdekaị na-agagharị n’ihu ogige ụlọ ụmụ nwaanyị* iji mara otú Esta mere nakwa ihe a na-eme ya. 12  Nwa agbọghọ nke ọ bụla ga-agakwuru Eze Ahazuirọs ma ọnwa iri na abụọ e ji achọ ya mma gachaa. Otú a ga-esi chọọ onye nke ọ bụla mma* bụ: A ga-eji ọnwa isii tee ya mmanụ e ji mea mee,+ jirikwa ọnwa isii tee ya mmanụ balsam+ na mmanụ otite ndị ọzọ e ji achọ mma.* 13  Nwa agbọghọ ahụ nweziri ike ịgakwuru eze ma e mechaa ya ihe ndị a. A ga-enyekwa ya ihe ọ bụla o kwuru ka e nye ya mgbe ọ ga-esi n’ụlọ ụmụ nwaanyị* gawa n’ụlọ eze. 14  Ná mgbede, ọ ga-agakwuru eze. N’ụtụtụ, ọ ga-aga n’ụlọ ụmụ nwaanyị* nke abụọ nke onye na-elekọta ya bụ Sheashgaz, bụ́ ọnaozi eze,+ onye na-elekọta ndị iko ya. Nwa agbọghọ ahụ agaghị agakwuru eze ọzọ ọ gwụla ma ihe ya ọ̀ dị eze mma, ya akpọọkwa ya aha ka ọ bịa.+ 15  Otú ahụ ka ha si mee Esta, onye Mọdekaị kpọọrọ na-azụ ka nwa ya nwaanyị.+ Esta bụ nwa Abihel nwanne nna Mọdekaị. Mgbe o ruru ka Esta gakwuru eze, ọ rịọghị ihe ọ bụla ma e wezụga ihe Hegaị bụ́ ọnaozi eze, onye na-elekọta ụmụ nwaanyị, kwuru ka e nye ya. (N’oge ahụ niile, ihe Esta nọ na-amasị onye ọ bụla hụrụ ya.) 16  A kpọọrọ Esta kpọgara Eze Ahazuirọs n’obí ya n’ọnwa nke iri, ya bụ, n’ọnwa Tibet,* n’afọ nke asaa+ n’ọchịchị ya. 17  Eze wee hụ Esta n’anya karịa ụmụ nwaanyị ndị ọzọ niile. Ọ bụkwa ya ka obi ya nabatara n’ime ụmụ agbọghọ niile ahụ na-amaghị nwoke. O wee kpuwe ya okpu nwunye eze na-ekpu, mee ya nwunye eze,+ ya anọchie Vashtaị.+ 18  Eze wee meere Esta oké oriri. Ọ kpọkwara ndị niile o mere ndị isi na ndị niile na-ejere ya ozi ka ha bịa oriri ahụ. O kwukwara na ya agbagharala ndị niile mejọrọ ya n’ógbè* niile ọ na-achị. Ọ nọkwa na-enye ndị mmadụ onyinye otú ndị eze si enye onyinye. 19  Na nke ugbo abụọ a kpọkọtara ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke,+ Mọdekaị nọ ọdụ n’ọnụ ụzọ ámá eze otú ọ na-anọ. 20  Esta emeghị ka a mata ndị bụ́ ndị ikwu ya na ndị obodo ya,+ n’ihi na ọ bụ ihe Mọdekaị gwara ya. Ọ bụkwa ihe Mọdekaị kwuru ka Esta na-eme, otú ọ na-eme mgbe Mọdekaị na-elekọta ya.+ 21  N’oge ahụ Mọdekaị na-anọdụ n’ọnụ ụzọ ámá eze, Bigtan na Tiresh, bụ́ ndị nche ọnụ ụzọ na ndị na-eje ozi n’obí eze, were iwe chọwa otú ha ga-esi gbuo* Eze Ahazuirọs. 22  Ma, Mọdekaị nụrụ ya gaa kọọrọ ya Esta nwunye eze ozugbo. Esta wee kọọrọ ya eze n’aha Mọdekaị. 23  E nyochakwara okwu ahụ ma chọpụta na ọ bụ eziokwu. E wee kwụgbuo mmadụ abụọ ahụ n’osisi, nọrọkwa n’ihu eze dee ihe a merenụ n’akwụkwọ a na-ede ihe ndị na-eme n’oge ahụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ná mpaghara.”
Ma ọ bụ “Susa.”
Ma ọ bụ “ebe a rụsiri ike.”
Ya bụ, ebe ụmụ nwaanyị na-ebi. Ha nwere ike ịbụ ndị nwunye eze ma ọ bụ ndị iko ya.
Ma ọ bụ “ihe ndị e ji ahịa ha aka n’ahụ́.”
Ma ọ bụ “ebe a rụsiri ike.”
Ma ọ bụ “Susa.”
A kpọrọ ya Jehoyakin ná 2 Eze 24:8.
Ma ọ bụ “Susa.”
Ma ọ bụ “ebe a rụsiri ike.”
Ma ọ bụ “n’obí.”
Ya bụ, ebe ụmụ nwaanyị na-ebi. Ha nwere ike ịbụ ndị nwunye eze ma ọ bụ ndị iko ya.
Ma ọ bụ “o gosikwara ya ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “ihe ọ ga-eji na-ahịa aka n’ahụ́.”
Ya bụ, ebe ụmụ nwaanyị na-ebi. Ha nwere ike ịbụ ndị nwunye eze ma ọ bụ ndị iko ya.
Ma ọ bụ “hịa onye nke ọ bụla aka n’ahụ́.”
Ma ọ bụ “ihe ndị ọzọ ụmụ nwaanyị ji ahịa aka n’ahụ́.”
Ya bụ, “ebe ụmụ nwaanyị na-ebi. Ha nwere ike ịbụ ndị nwunye eze ma ọ bụ ndị iko ya.”
Ya bụ, “ebe ụmụ nwaanyị na-ebi. Ha nwere ike ịbụ ndị nwunye eze ma ọ bụ ndị iko ya.”
Gụọ B15.
Ma ọ bụ “ná mpaghara.”
Na Hibru, “otú aka ha ga-esi kpara.”