Esta 5:1-14

  • Esta gakwuuru eze (1-8)

  • Mgbe iwe juru Heman obi na mgbe o turu ọnụ (9-14)

5  N’ụbọchị nke atọ,+ ka eze nọ ọdụ n’ocheeze ya n’ụlọ* eze nke chere ihu n’ụzọ e si abata n’ụlọ ahụ, Esta jiri ejiji nwunye eze gaa guzoro n’ogige nke dị n’obí eze nke chere ụlọ eze ihu.  Ozugbo eze hụrụ Esta nwunye ya ka o guzo n’ogige ụlọ ya, obi tọrọ ya ụtọ, ya esetịara ya mkpanaka ọlaedo+ o ji n’aka. Esta wee bịa metụ aka n’ọnụ mkpanaka ahụ.  Eze wee jụọ ya, sị: “Esta nwunye m, gịnị bụ mkpa gị? Gịnịkwa ka ị chọrọ ka m meere gị? Ọ bụrụgodị na ị chọrọ ọkara alaeze m, m ga-enye gị ya.”  Esta asị ya: “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ka eze na Heman+ bịa oriri m ga-emere ya taa.”  Eze wee sị ndị na-ejere ya ozi: “Gwanụ Heman ka ọ bịa ozugbo otú Esta kwuru.” Eze na Heman wee gaa oriri ahụ Esta mere.  N’oge ha na-aṅụ mmanya n’oriri ahụ, eze sịrị Esta: “Gịnị ka ị na-arịọ ka m meere gị? M ga-emere gị ya. Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị? Ọ bụrụgodị na ị chọrọ ọkara alaeze m, m ga-enye gị ya.”+  Esta wee sị: “Ihe m na-arịọ na ihe m chọrọ ka e meere m bụ:  Ọ bụrụ na ihe m masịrị eze, ọ bụrụkwa na ọ dị eze mma imere m ihe m chọrọ na ime ihe m na-arịọ, ka eze na Heman bịa oriri m ga-emere ha echi. Ọ bụkwa echi ahụ ka m ga-agwa eze ihe ọ chọrọ ka m gwa ya.”  Ka Heman na-ala n’ụbọchị ahụ, obi bụ ya sọ aṅụrị. Ma, iwe juru ya obi ozugbo ọ hụrụ Mọdekaị n’ọnụ ụzọ ámá eze, hụkwa na o bilighị, nakwa na ọ tụghị ya ụjọ.+ 10  Ma, Heman jidere onwe ya, lawa n’ụlọ ya. Mgbe ọ laruru, ọ kpọkọtara ndị enyi ya na Ziresh+ nwunye ya. 11  Heman turu ọnụ otú akụnụba ya si dị ọtụtụ, otú ụmụ ya sikwa dị ọtụtụ,+ na otú eze si bulie ya n’ọkwá nakwa otú o si mee ka ọkwá ya karịa nke ndị isi ndị ọzọ na ndị na-ejere eze ozi.+ 12  Heman kwukwara, sị: “Esta nwunye eze kpọkwara naanị mụ na eze oriri o mere.+ Ọ gwakwara mụ na eze ka anyị bịa na nke ya echi.+ 13  Ma ihe a niile adịghị mụ mma ma m na-ahụ Mọdekaị onye Juu ahụ ka ọ nọ ọdụ n’ọnụ ụzọ ámá eze.” 14  Ziresh nwunye ya na ndị enyi ya niile wee sị ya: “Gwunye otu osisi n’ala. Ogo ya ga-adị kubit iri ise.* O ruzie n’ụtụtụ, gwa eze ka a kwụgbuo Mọdekaị n’elu ya.+ E mechaa, jirizie ọṅụ soro eze gawa oriri ahụ.” Ihe a ha kwuru dị Heman mma, ya ekwuo ka e gwunye osisi ahụ n’ala.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “n’obí.”
Ihe dị ka mita 22.3 (amaụkwụ 73). Gụọ B14.