Esta 6:1-14

  • Eze kwanyeere Mọdekaị ùgwù (1-14)

6  N’abalị ahụ, ụra agaghị eze n’anya.* N’ihi ya, o kwuru ka e wetara ya akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge gara aga.+ E wee gụpụtara ya eze.  A gụtara ebe e dere ihe Mọdekaị kọrọ banyere Bigtena na Tiresh, mmadụ abụọ na-eje ozi n’obí eze, ndị nche ọnụ ụzọ, bụ́ ndị chọrọ igbu Eze Ahazuirọs.*+  Eze wee jụọ, sị: “Olee ihe e meere Mọdekaị ma ọ bụ ùgwù a kwanyeere ya maka ihe a?” Ndị na-ejere eze ozi wee sị: “O nwebeghị ihe e meere ya.”  E mechaa, eze sịrị: “Ònye nọ n’obí m?” N’oge a, Heman abatala n’ogige dị ná mpụta+ ụlọ* eze ka ọ gwa eze ka a kwụgbuo Mọdekaị n’osisi o gwunyere n’ala maka ya.+  Ndị na-ejere eze ozi wee sị ya: “Ọ bụ Heman+ guzo n’obí eze.” Eze wee sị: “Gwanụ ya ka ọ bata.”  Mgbe Heman batara, eze sịrị ya: “Gịnị ka a ga-emere nwoke eze chọrọ ịkwanyere ùgwù?” Heman ekwuo n’obi ya, sị: “Olee onye ọzọ eze ga-achọ ịkwanyere ùgwù ma ọ́ bụghị m?”+  Heman wee sị eze: “Ihe a ga-emere nwoke eze chọrọ ịkwanyere ùgwù bụ:  Ka a chịta uwe eze na-eyi,+ kpụtakwa ịnyịnya eze na-agba, nke e kere ákwà isi pụrụ iche n’isi ya.  Ka e nyefeekwa uwe ahụ na ịnyịnya ahụ n’aka otu n’ime ndị isi a ma ama nke eze. Ka e nweekwa ndị ga-eyiwe nwoke ahụ eze chọrọ ịkwanyere ùgwù uwe, ka ọ nọrọ n’elu ịnyịnya ahụ gbagharịa n’ámá obodo. Ha ga-anọkwa ya n’ihu na-eti, sị: ‘Ihe a ka a na-emere nwoke eze chọrọ ịkwanyere ùgwù.’”+ 10  Ozugbo ahụ, eze gwara Heman, sị: “Ngwa, chịrị uwe, kpụrụkwa ịnyịnya otú ahụ i kwuru, gaa meere Mọdekaị onye Juu ahụ na-anọ n’ọnụ ụzọ ámá eze otú ahụ. Ahapụkwala ime nke ọ bụla n’ime ihe niile i kwuru.” 11  Heman wee chịrị uwe, kpụrụkwa ịnyịnya, gaa yiwe Mọdekaị uwe,+ meekwa ka ọ nọrọ n’elu ịnyịnya ahụ na-agbagharị n’ámá obodo, nọrọkwa ya n’ihu na-eti, sị: “Ihe a ka a na-emere nwoke eze chọrọ ịkwanyere ùgwù.” 12  E mechaa, Mọdekaị laghachiri n’ọnụ ụzọ ámá eze. Ma ezigbo ihere nọ na-eme Heman, ya ekpuchie isi ya, mee ọsọ ọsọ lawa n’ụlọ ya. 13  Mgbe Heman kọọrọ Ziresh nwunye ya+ na ndị enyi ya niile ihe niile mere ya, ndị na-adụ ya ọdụ* na Ziresh nwunye ya wee sị ya: “Ọ bụrụ na Mọdekaị, onye kazi gị n’ọkwá, bụ onye Juu,* ị gaghị emerili ya. Nke ị na-eme agwụla.” 14  Ka ha na Heman ka nọ na-ekwu okwu, ndị na-eje ozi n’obí eze bịara kpọrọ ya ọsọ ọsọ gawa oriri ahụ Esta kpọrọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ụra gbafuru eze n’anya.”
Na Hibru, “ndị chọrọ otú ha ga-esi kpara Eze Ahazuirọs aka.”
Ma ọ bụ “obí.”
Na Hibru, “ndị amamihe ya.”
Na Hibru, “si ná mkpụrụ ndị Juu.”