Ezikiel 21:1-32

  • Chineke si n’ọbọ mịpụta mma o ji asụ ndị mmadụ akwụ (1-17)

  • Eze Babịlọn ga-alụso Jeruselem agha (18-24)

  • A ga-anapụ onyeisi ọjọọ na-achị ndị Izrel ọchịchị (25-27)

    • ‘Kpupụ okpueze ya’ (26)

    • “Ruo mgbe onye o ruuru bịara” (27)

  • A ga-eji mma agha gbuo ndị Amọn (28-32)

21  Jehova gwara m okwu ọzọ, sị:  “Nwa nke mmadụ, chee ihu na Jeruselem ma kwuo ihe a ga-eme ebe ndị dị nsọ, buokwa amụma ihe a ga-eme ndị Izrel.  Gwa ndị Izrel, sị, ‘Jehova sịrị: “M ga-eme unu ihe. M ga-amịpụta mma agha m n’ọbọ,+ gbuo ma onye ezi omume ma onye ajọ omume.  M ga-amịpụta mma agha m n’ọbọ, jiri ya gbuo mmadụ* niile, malite n’ebe ndịda ruo n’ebe ugwu. M ga-egbu ma onye ezi omume ma onye ajọ omume.  Mmadụ* niile ga-amarakwa na mụnwa, bụ́ Jehova, amịpụtala mma agha m n’ọbọ ya. M gaghịkwa amịghachi ya.”’+  “Ma gịnwa, bụ́ nwa nke mmadụ, sụọ ude ka onye ụjọ ji.* Nọrọ n’ihu ha sụọ ude ka onye obi na-adịghị mma.+  Ọ bụrụkwa na ha asị gị, ‘Gịnị mere i ji na-asụ ude?’ ị ga-asị ha, ‘Ọ bụ n’ihi ozi a ga-ezite.’ N’ihi na ihe ahụ unu nụrụ ga-emezurịrị. Obi ga-awụnyekwa onye ọ bụla n’afọ. Aka niile ga-akụda. Onye ọ bụla ga-ada mbà. Ikpere niile ga-agụsịkwa mmiri.*+ ‘N’eziokwu, ihe ahụ unu nụrụ ga-emezurịrị.’ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.”  Jehova gwakwara m okwu ọzọ, sị:  “Nwa nke mmadụ, buo amụma, sị, ‘Jehova sịrị: ‘Mma agha, a mụọla mma agha!+ Ọ na-egbuzi maramara. 10  A mụrụ ya ka e jiri ya gbuo ọtụtụ mmadụ. A mụrụ ya ka ọ na-egbu ka àmụ̀mà.’”’” “Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịṅụrịwa ọṅụ?” “‘Ọ̀* ga-ajụ mkpanaka nwa m+ otú ọ na-ajụ osisi niile? 11  “‘E nyere mmadụ mma agha a ka o mee ka ọ na-egbu maramara, ka e jirikwa ya na-egbu ndị mmadụ. A mụọla ya, ya ana-egbu maramara. A ga-enyekwa ya onye na-egbu mmadụ.+ 12  “‘Nwa nke mmadụ, bee ákwá, tiekwa mkpu ákwá,+ n’ihi na e ji mma agha ahụ na-egbu ndị m. E jikwa ya na-egbu ndị isi niile n’Izrel.+ A ga-eji ya gbuo ndị a niile, ha na ndị m. N’ihi ya, tie aka n’apata ụkwụ ka onye ihe na-ewute. 13  E nyochaala ndị m.+ Gịnịkwa ga-eme ma ọ bụrụ na mma agha ahụ ajụ mkpanaka eze? Ọ gaghị adịgide.’*+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a. 14  “Ma gịnwa, bụ́ nwa nke mmadụ, buo amụma, kụọkwa aka,* kwuo ‘Mma agha!’ ugboro atọ. Ọ bụ mma agha e ji gbuo ndị mmadụ. Ọ bụ mma agha nke gbara ọtụtụ ndị gburugburu,+ nke e jikwa gbuo ha. 15  Obi ga-awụnye ndị mmadụ n’afọ.+ Ọtụtụ ndị ga-adakwa n’ọnụ ụzọ ámá ha. M ga-eji mma agha gbuo ndị mmadụ. N’eziokwu, ọ na-egbu ka àmụ̀mà. A mụrụ ya amụ ka e jiri ya gbuo ndị mmadụ. 16  Gosi na ị dị nkọ, gburukwa gaa n’aka nri nakwa n’aka ekpe. Gaa ebe ọ bụla e chere gị ihu. 17  M ga-ejikwa iwe kụọ aka ma taa ndị mejọrọ m ahụhụ ka iwe m dajụọ.+ Ọ bụ mụnwa, bụ́ Jehova, kwuru ihe a.” 18  Jehova gwakwara m okwu ọzọ, sị: 19  “Nwa nke mmadụ, see otu ụzọ si n’otu obodo pụta, nke nwere ebe o ruru gbaa abụọ. Eze Babịlọn, onye ji mma agha na-abịa, ga-ahọrọ ụzọ nke ọ ga-esi n’ime ha abụọ. N’ebe ụzọ a gbara abụọ, senye ihe* ga na-egosi ebe e si abanye n’obodo abụọ ahụ. 20  Ị ga-esenyekwa ihe ga-egosi ụzọ a ga-esi jiri mma agha bata ma lụso Raba,+ bụ́ obodo ndị Amọn agha, nakwa ụzọ a ga-esi bata Jeruselem, bụ́ ebe a rụsiri ike,+ nke dị na Juda, ma lụso ya agha. 21  N’ihi na eze Babịlọn ga-akwụsị otu ebe ụzọ gbara mkpị, n’isi ụzọ abụọ ahụ, ka ọ gbaa afa. Ọ ga-ayọgharị akụ́. Ọ ga-ajụ arụsị* ya ase. Ọ ga-elerukwa imeju anụ anya. 22  Afa o ji aka nri ya gbaa gosiri na ha kwesịrị ịga Jeruselem, gaa busa ihe e ji akwatu mgbidi, kwuo ka e gbuo ndị mmadụ, tie mkpu agha, busakwa ihe a ga-eji kwatuo ọnụ ụzọ ámá, jiri ájá rụọ mgbidi, rụọkwa mgbidi ọ ga-eji nọchibido ya.+ 23  Ma, ndị* ṅụụrụ ha iyi ga-eche na ihe ahụ ọ gbatara n’afa agaghị eme.+* ga-echetakwa ihe ndị ha mere ma dọrọ ha n’agha.+ 24  “N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: ‘Unu emeela ka e cheta mmehie unu, n’ihi na unu gbara mmehie unu n’anwụ, meekwa ka a hụ na naanị ihe unu na-eme bụ mmehie. Ebe ọ bụ na e chetala unu, a ga-akpụrụ unu n’ike.’* 25  “Ma gịnwa, bụ́ onyeisi Izrel, onye ọjọọ e merụrụ ezigbo ahụ́, oge gị eruola,+ ya bụ, oge a ga-ata gị ahụhụ ikpeazụ. 26  Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: ‘Wepụ ákwà ahụ e kere ya n’isi, kpupụkwa okpueze ya.+ Ihe agaghịzi adị otú ọ dịbu.+ Ka e bulie onye dị ala elu,+ ma wetuo onye dị elu ala.+ 27  Mbibi, mbibi, mbibi ka m ga-ebibi ya. Ọ gaghịkwa abụ nke onye ọ bụla ruo mgbe onye o ruuru bịara.+ M ga-ewerekwa ya nye ya.’+ 28  “Ma gịnwa, bụ́ nwa nke mmadụ, buo amụma, sị, ‘E nwere ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru banyere ụmụ Amọn nakwa banyere mkparị ha na-akparị ndị ya.’ Kwuokwa sị, ‘Mma agha! A mịpụtara mma agha iji gbuo ndị mmadụ. A mụrụ ya amụ ka e jiri ya gbuo ndị mmadụ. Ọ na-egbukwa ka àmụ̀mà. 29  N’agbanyeghị na ha na-ahụrụ gị ọhụụ ụgha, n’agbanyeghịkwa na afa ha na-agbara gị bụ iji duhie gị, a ga-atụkwasị gị n’elu ebe e bukọtara ozu ndị ọjọọ e gburu egbu, ndị oge ha zuru, ya bụ, oge a ga-ata ha ahụhụ ikpeazụ. 30  Mịghachi mma agha ahụ n’ọbọ ya. M ga-ekpe gị ikpe n’ebe a mụrụ* gị, ya bụ, n’obodo gị. 31  M ga-eji iwe taa gị ahụhụ. Iwe m ga-adị ọkụ, reekwa gị ka ọkụ. M ga-enyefekwa gị n’aka ndị obi fere azụ, ndị ma ka e si ebibi ihe.+ 32  Ị ga-aghọ nkụ e ji akwanye ọkụ.+ Ọbara gị ga na-asọ n’ala gị. A gaghịkwa echeta gị, n’ihi na mụnwa, bụ́ Jehova, ekwuola ya.’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “anụ ahụ́.”
Na Hibru, “Anụ ahụ́.”
Na Hibru, “mgbe úkwù na-ama gị jijiji.”
Ya bụ, ha ga-aba mamịrị ọkụ.
Ya bụ, mma agha Jehova.
Ma ọ bụ “Mkpanaka a agaghị adịgide.”
Aka ọ ga-akụ bụ iji gosi na iwe ji ya.
Na Hibru, “aka.”
Na Hibru, “terafim.”
Ya bụ, ndị bi na Jeruselem.
Ya bụ, Eze Babịlọn.
Na Hibru, “aka ga-akpara unu.”
Na Hibru, “e kere.”