Ezikiel 33:1-33
33 Jehova gwara m, sị:
2 “Nwa nke mmadụ, gwa ndị obodo gị,+ sị,“‘Ọ bụrụ na mụ emee ka e jiri mma agha bịa ịlụso ndị obodo ọ bụla agha,+ ọ bụrụkwa na ndị obodo ahụ niile emee otu nwoke onye nche ha,
3 nwoke ahụ ahụkwa ka e ji mma agha na-abịa ịlụso obodo ha agha ma fụọ opi, gwakwa ndị obodo ha gbasara ya,+
4 ma, e nwee onye nụrụ ụda opi ahụ ma ghara ime ihe o kwesịrị ime,+ e jiri mma agha ahụ gbuo ya,* ọbara ya ga-adị ya n’isi.+
5 Ọ nụrụ ụda opi ahụ, ma o meghị ihe o kwesịrị ime. Ọbara ya ga-adị ya n’isi. A sị na o mere ihe o kwesịrị ime, ọ* gaara adịrị ndụ na-aga.
6 “‘Ma ọ bụrụ na onye nche ahụ hụrụ ka e ji mma agha na-abịa ma jụ ịfụ opi,+ gharakwa ịgwa ndị mmadụ gbasara ya, a bịa jiri mma agha ahụ gbuo onye ọ bụla n’ime ha, onye ahụ e gburu nwụrụ n’ihi mmehie ya, ma ọbara ya dị n’isi onye nche ahụ.’*+
7 “Nwa nke mmadụ, m họpụtara gị ka ị bụrụ onye nche ndị Izrel. Ọ bụrụ na ị nụ ihe ọ bụla n’ọnụ m, dọọ ha aka ná ntị otú m gwara gị dọọ ha.+
8 Ọ bụrụ na mụ asị onye ajọ omume, ‘Onye ajọ omume, ị ga-anwụrịrị,’+ ma, ị gwaghị ya okwu iji dọọ ya aka ná ntị ka ọ gbanwee àgwà ya, ebe ọ bụ onye ajọ omume, ọ ga-anwụ n’ihi mmehie ya,+ ma ọbara ya ga-adị n’isi gị.
9 Ma, ọ bụrụ na ị dọọ onye ajọ omume aka ná ntị ka ọ gbanwee àgwà ya, ya ajụ ịgbanwe, ọ ga-anwụ n’ihi mmehie ya,+ ma ị gbarala isi onwe gị.*+
10 “Nwa nke mmadụ, gwa ndị Izrel, sị, ‘Unu sịrị: “Mmehie anyị na ajọ omume anyị na-anyịgbu anyị, na-eme ka anyị gharazie ịba uru.+ Oleezi otú anyị ga-esi dịrị ndụ?”’+
11 Gwa ha, sị, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, “Ebe ọ bụ na m na-adị ndụ, obi anaghị atọ m ụtọ ma onye ajọ omume nwụọ,+ ma obi na-atọ m ụtọ ma onye ajọ omume gbanwee àgwà ya+ ma dịrị ndụ.+ Ndị Izrel, chegharịanụ. Hapụnụ ihe ọjọọ unu na-eme.+ Gịnị mere unu ga-eji anwụ?”’+
12 “Nwa nke mmadụ, gwa ndị obodo gị, sị, ‘Ihe ọma onye ezi omume mere agaghị anapụta ya ma o bido inupụ isi.+ Ihe ọjọọ onye ajọ omume mere agaghị eme ka e gbuo ya ma ọ kwụsị ihe ọjọọ ọ na-eme.+ Ihe ọma onye ezi omume mere agaghị eme ka ọ dịrị ndụ ma o mehie.+
13 Ọ bụrụ na mụ asị onye ezi omume: “Ị ga-adịrị ndụ na-aga,” ya emee ihe ọjọọ maka na o chere na ihe ọma ndị o mere ga-azọ ya,+ a gaghị echeta ihe ọma ọ bụla o mere. Kama, ọ ga-anwụ n’ihi ihe ọjọọ o mere.+
14 “‘Ọ bụrụkwa na mụ asị onye ajọ omume: “Ị ga-anwụrịrị,” ya ahapụ mmehie ya mewe ihe ziri ezi na ezi omume,+
15 onye ajọ omume ahụ agaa weghachi ihe e ji gbaa ibé,+ kwụọ ụgwọ ihe o zuuru,+ biwe ndụ dị mma, kwụsịkwa ime ihe ọjọọ, ọ ga-adịrị ndụ na-aga.+ Ọ gaghị anwụ.
16 A gaghị ata ya ahụhụ maka mmehie* ọ bụla o mere n’oge gara aga.+ Ọ ga-adịrị ndụ na-aga maka na ọ na-emezi ihe ziri ezi na ezi omume.’+
17 “Ma, ndị obodo gị sịrị, ‘Ihe Jehova na-eme adịghị mma.’ Ma, ọ bụ ihe hanwa na-eme bụ ihe na-adịghị mma.
18 “Ọ bụrụ na onye ezi omume akwụsị ime ezi omume, mewe ihe ọjọọ, ọ ga-anwụ maka ya.+
19 Ma, ọ bụrụ na onye ajọ omume akwụsị ihe ọjọọ ọ na-eme, mewezie ihe ziri ezi na ezi omume, ọ ga-adịrị ndụ na-aga maka ya.+
20 “Ma, unu sịkwara, ‘Ihe Jehova na-eme adịghị mma.’+ Ndị Izrel, m ga-ekpe onye ọ bụla n’ime unu ikpe ihe o mere.”
21 N’abalị ise, n’ọnwa iri, n’afọ nke iri na abụọ a dọrọchaara anyị n’agha, otu nwoke si na Jeruselem gbapụta bịakwutere m,+ sị: “E wegharala Jeruselem!”+
22 Mmụọ* Jehova dakwasịrị m ná mgbede tupu nwoke ahụ si Jeruselem gbapụ abịa. Chineke meghekwara ọnụ m tupu nwoke ahụ abịakwute m n’ụtụtụ. Ọnụ m ghezi oghe, mụ ebido kwuwe okwu.+
23 Jehova gwara m okwu ọzọ, sị:
24 “Nwa nke mmadụ, ndị bi n’obodo ndị a lara n’iyi+ na-ekwu banyere ala Izrel, sị, ‘Ebreham bụ naanị otu onye. Ma, o nwetara ala ahụ.+ Ebe anyịnwa dị ọtụtụ, o doro anya na ala ahụ bụ nke anyị.’
25 “N’ihi ya, sị ha, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: “Unu na-erikọta ọbara na anụ.+ Unu lekwasịkwara anya n’arụsị unu dị iche iche na-asọ oyi.* Unu nọkwa na-egbu ndị mmadụ.+ Oleezi ihe mere unu ji kwesị inweta ala ahụ?
26 Unu tụkwasịrị mma agha unu obi.+ Unu na-akpa arụ. Onye ọ bụla n’ime unu na-edina nwunye nwoke ibe ya.+ Oleezi ihe mere unu ji kwesị inweta ala ahụ?”’+
27 “Ihe a ka ị ga-agwa ha, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na m na-adị ndụ, a ga-eji mma agha gbuo ndị bi n’obodo ndị a lara n’iyi. M ga-eme ka anụ ọhịa jiri ndị nọ n’ọhịa mere nri. Ọrịa ga-egbukwa ndị niile nọ n’ebe ndị a rụsiri ike nakwa n’ọgba.+
28 M ga-eme ka ala ahụ tọgbọrọ nnọọ chakoo.+ A ga-eme ka onwe ya kwụsị ịna-ebu ya isi, meekwa ka ọ kwụsị ịna-akpa nganga. A ga-eme ka ugwu ndị dị n’Izrel tọgbọrọ nkịtị.+ E nweghịkwa onye ga-esi na ha na-agafe.
29 Ha ga-amarakwa na m bụ Jehova mgbe m ga-eme ka ala ahụ tọgbọrọ nnọọ nkịtị+ n’ihi arụ niile ha na-akpa.”’+
30 “Nwa nke mmadụ, ndị obodo gị na-agwa ibe ha banyere gị n’akụkụ mgbidi nakwa n’ọnụ ụzọ ụlọ ha.+ Onye ọ bụla n’ime ha na-agwa nwanne ya, sị, ‘Bịa ka anyị nụ ihe Jehova kwuru.’
31 Ha ga-ekworo bịa nọrọ ọdụ n’ihu gị otú ndị m na-eme. Ha ga-anụ ihe ị ga-ekwu, ma ha agaghị eme ya.+ N’ihi na ha ji ọnụ ha ekwu ihe ga-atọ gị ụtọ ná ntị,* ma n’ime obi ha, ha ji anyaukwu achọ ihe ga-abara naanị ha uru.
32 Ma, n’anya ha, ị dị ka onye ma ka e si akpọ ụbọ akwara, nke nwere olu ọma, na-agụkwa egwú ịhụnanya. Ha ga-anụ ihe i kwuru, ma e nweghị onye n’ime ha ga-eme ya.
33 Ihe ndị a ga-emezurịrị. Mgbe ha ga-emezu, ha ga-amara na ha na onye amụma nọ kemgbe.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “were ya.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
^ Ma ọ bụ “ma m ga-ajụta ọbara ya n’aka onye nche ahụ.”
^ Ma ọ bụ “gbapụtala mkpụrụ obi gị.”
^ Na Hibru, “echeta mmehie.”
^ Na Hibru, “Aka.”
^ Ọ ga-abụ na ihe a kpọrọ arụsị ndị ahụ n’asụsụ Hibru bụ nwanne okwu Hibru ọzọ nke pụtara “nsị.” E ji ya egosi na ihe na-asọ oyi.
^ Ma ọ bụ “ha ji ọnụ ha ekwu ihe rụrụ arụ.”