Ezikiel 34:1-31
34 Jehova gwara m okwu ọzọ, sị:
2 “Nwa nke mmadụ, buo amụma ihe a ga-eme ndị na-azụ ndị Izrel ka atụrụ. Buo amụma, gwa ndị ọzụzụ atụrụ ahụ, sị, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Ndị na-azụ ndị Izrel ka atụrụ ga-ata ahụhụ.+ Ha na-azụ onwe ha. Ọ́ bụghị ìgwè atụrụ ka ndị ọzụzụ atụrụ kwesịrị ịna-azụ?+
3 Unu na-eri abụba atụrụ, na-eyikwa uwe e ji ajị atụrụ mee. Unu na-egbu atụrụ gbara agba.+ Ma, unu anaghị enye ìgwè atụrụ unu na-azụ nri.+
4 Unu anaghị eme ka ndị nke ike gwụrụ dị ike. Unu anaghị agwọ ndị nke ahụ́ na-adịghị. Unu anaghị eke ọkpụkpụ ndị nke gbajiri agbaji ákwà. Unu anaghị akpọghachite ndị nke kpafuru akpafu. Unu anaghị achọ ndị nke furu efu.+ Kama, obi tara unu mmiri, unu ana-achị ha n’aka ike.+
5 Ha gbasasịrị n’ihi na e nweghị onye na-azụ ha.+ Ha gbasasịrị ghọọrọ anụ ọhịa niile anụ oriri.
6 Atụrụ m nọ na-akpafu n’ugwu ukwu niile nakwa n’ugwu ọ bụla ọzọ. Atụrụ m gbasasịkwara n’ụwa niile. E nweghị onye na-ajụ ajụjụ ha. E nweghịkwa onye na-achọ ha.
7 “‘“N’ihi ya, ndị ọzụzụ atụrụ, nụrụnụ ihe Jehova kwuru:
8 ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, “Ebe ọ bụ na m na-adị ndụ, m ga-emerịrị ihe n’ihi na anụ ọhịa niile ejirila atụrụ m mere anụ oriri maka na atụrụ m enweghị onye na-azụ ha, ndị na-azụ ha achọghịkwa ịma ebe ha nọ. Kama, ha hapụrụ ịzụ ha na-azụ onwe ha.”’
9 N’ihi ya, ndị ọzụzụ atụrụ, nụrụnụ ihe Jehova kwuru.
10 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: ‘M ga-eme ndị na-azụ atụrụ m ihe. M ga-ajụ ha ihe mere atụrụ m, kwụsịkwa ha ịzụ atụrụ m.+ Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ agaghịzi na-azụ onwe ha. M ga-anapụtakwa atụrụ m n’ọnụ ha. Ha agaghịzi eji ha mere anụ oriri.’”
11 “‘N’ihi na Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Ugbu a, m ga-eji aka m chọta atụrụ m, lekọtakwa ha.+
12 M ga-elekọta atụrụ m otú ahụ onye na-azụ atụrụ si elekọta atụrụ ya ndị gbasasịrị agbasasị ma ọ chọta ha.+ M ga-anapụtakwa ha n’ebe niile a chụsasịrị ha n’ụbọchị ígwé ojii na oké ọchịchịrị.+
13 M ga-esi ná mba dị iche iche kpọkọta ha, sikwa n’ala dị iche iche chịkọta ha ma kpọlata ha n’ala ha. M ga-azụkwa ha n’ugwu ndị dị n’Izrel,+ n’akụkụ iyi dị iche iche, nakwa n’ebe niile ndị mmadụ bi.
14 M ga-azụ ha n’ebe dị mma anụmanụ na-ata ahịhịa. Ha ga na-atakwa ahịhịa n’ugwu ndị dị n’Izrel.+ N’ebe ahụ dị mma ahịhịa juru ka ha ga-amakpu.+ Ha ga-atakwa ahịhịa n’ebe dị ezigbo mma anụmanụ na-ata ahịhịa n’ugwu ndị dị n’Izrel.”
15 “‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, “M ga-eji aka m na-azụ atụrụ m,+ meekwa ka ha zuru ike.+
16 M ga-achọ nke furu efu,+ dughachite nke kpafuru akpafu, kee ọkpụkpụ nke gbajiri agbaji ákwà, meekwa ka nke ike na-adịghị dị ike. Ma, m ga-ala nke buru ibu na nke dị ike n’iyi. M ga-ekpe ha ikpe, taakwa ha ahụhụ kwesịịrị ha.”
17 “‘Ma ununwa bụ́ atụrụ m, mụnwa bụ́ Ọkaakaa Onyenwe unu bụ́ Jehova kwuru, sị: “M na-aga ikpere otu atụrụ na ibe ya ikpe, kpeekwara ebule na mkpi.+
18 Ùnu weere na ahịhịa kacha mma unu na-ata bụ obere ihe? Gịnị mere unu ji jiri ụkwụ unu na-azọtọsị ebe ndị ọzọ ahịhịa fọdụrụ? Gịnịkwa mere o ji abụ, unu ṅụọ mmiri dị ọcha, unu ejiri ụkwụ unu gbarụọ nke fọrọnụ?
19 Ọ̀ dị mma ka atụrụ m taa ahịhịa n’ebe unu ji ụkwụ unu zọtọsịa, ṅụọkwa mmiri unu ji ụkwụ unu gbarụọ?”
20 “‘N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova gwara ha, sị: “Ọ bụ m ga-ekpere atụrụ buru ibu na atụrụ tara ahụ́ ikpe,
21 n’ihi na unu ji ahụ́ unu na ubu unu na-enupụ ndị niile ahụ́ na-adịghị, na-asọkwa ha mpi ruo mgbe unu chụgachara ha ebe dị iche iche.
22 M ga-azọpụta atụrụ m. E nweghịzi onye ha ga-abụrụ anụ oriri.+ M ga-ekpekwara otu atụrụ na ibe ya ikpe.
23 M ga-ahọpụta Devid* ohu m+ ka ọ na-azụ ha.+ Ọ ga-azụkwa ha. Ọ ga na-elekọta ha, na-azụkwa ha.+
24 Mụnwa, bụ́ Jehova, ga-abụ Chineke ha.+ Devid ohu m ga-abụkwa onyeisi ha.+ Ọ bụ mụnwa, bụ́ Jehova, kwuru ihe a.
25 “‘“Mụ na ha ga-agba ọgbụgba ndụ udo.+ M ga-emekwa ka anụ ọhịa ọjọọ gharazie ịdị n’ala ha.+ Ihe a ga-eme ka obi na-eru ha ala n’ala ịkpa ha bi, ha ana-ehikwa ụra n’oké ọhịa.+
26 M ga-eme ka ha na ebe niile gbara ugwu m gburugburu nweta ngọzi.*+ M ga-emekwa ka mmiri zoo n’oge ya. Ngọzi ga na-ezo ka mmiri.+
27 Osisi ndị dị n’ọhịa ga-amị mkpụrụ. Ala ga na-eme nri.+ Obi ga-erukwa ndị m ala n’obodo ha. Ha ga-amarakwa na m bụ Jehova mgbe m gbajiri osisi yok+ ha ma napụta ha n’aka ndị ji ha mere ohu.
28 Ha agaghịzi abụrụ mba dị iche iche anụ oriri. Anụ ọhịa agaghịzi na-adọri ha. Obi ga-eru ha ala n’ebe ha bi. E nweghịkwa onye ga-emenye ha ụjọ.+
29 “‘“M ga-eme ka ha nwee ubi na-ede ude. Ụnwụ agaghịzi egbu ha n’ala ha.+ Mba dị iche iche agaghịzi na-eweda ha ala.+
30 ‘Ha ga-amarakwa na mụnwa, bụ́ Jehova Chineke ha, nọnyeere ha, nakwa na hanwa, bụ́ ndị Izrel, bụ ndị m.’+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.”’
31 “‘Ma ununwa, bụ́ atụrụ m,+ atụrụ m na-elekọta, bụ mmadụ nkịtị. Mụnwa bụ Chineke unu.’ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ya bụ, onye si n’ezinụlọ Devid.
^ O nwere ike ịbụ, “bụrụ ebe e si enweta ngọzi.”