Ezra 3:1-13
3 N’ọnwa nke asaa,+ mgbe ndị Izrel biirila n’obodo ha dị iche iche, ha ji otu obi zukọta na Jeruselem.
2 Jeshụa+ nwa Jehozadak na ndị nchụàjà ibe ya nakwa Zerubabel+ nwa Shieltiel+ na ụmụnne ya biliri rụọ ebe ịchụàjà nke Chineke Izrel, ka ha nwee ike ịna-achụ àjà a na-esu ọkụ na ya, otú e dere n’Iwu Mosis,+ onye nke ezi Chineke.
3 Ha wee rụọ ebe ịchụàjà ahụ n’ebe ọ dịbu n’agbanyeghị na ha na-atụ ndị bi n’ala ndị gbara ha gburugburu egwu.+ Ha malitere ịchụrụ Jehova àjà a na-esu ọkụ n’elu ya, ya bụ, àjà a na-esu ọkụ n’ụtụtụ na nke a na-esu ọkụ ná mgbede.+
4 Ha wee mee Ememme Ụlọ Ndò otú e dere ya n’Iwu.*+ Kwa ụbọchị, ha na-achụ àjà a na-esu ọkụ ole e kwesịrị ịchụ n’ụbọchị ọ bụla.+
5 Mgbe e mechara, ha chụrụ àjà a na-esu ọkụ nke a na-achụ mgbe niile+ na ndị nke a na-achụ n’ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ+ nakwa ndị nke a na-achụ n’oge ememme niile e doro nsọ+ maka Jehova. Ihe ọzọ ha chụrụ n’àjà bụ onyinye ndị mmadụ ji obi ha nye+ Jehova.
6 Malite n’abalị mbụ n’ọnwa nke asaa,+ ha bidoro ịchụrụ Jehova àjà a na-esu ọkụ, n’agbanyeghị na a tọbeghị ntọala ụlọ nsọ Jehova.
7 Ha nyere ndị na-awa nkume+ na ndị omenkà+ ego, nyekwa ndị Saịdọn na ndị Taya ihe oriri na mmanya na mmanụ maka na ha na-esi na Lebanọn eburu osisi sida, si n’oké osimiri bute ha na Jọpa,+ otú Eze Saịrọs nke Peshia nyere ha ikike ka ha mee.+
8 N’afọ nke abụọ ha rutechara n’ụlọ ezi Chineke dị na Jeruselem, n’ọnwa nke abụọ, Zerubabel nwa Shieltiel, Jeshụa nwa Jehozadak na ụmụnne ha ndị ọzọ, bụ́ ndị nchụàjà na ndị Livaị, na ndị niile si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta Jeruselem+ malitere ọrụ ahụ. Ha họpụtara ndị Livaị dị afọ iri abụọ gbagowe ka ha lekọtawa ọrụ a na-arụ n’ụlọ Jehova.
9 Jeshụa na ụmụ ya na ụmụnne ya nakwa Kadmiel na ụmụ ya, bụ́ ụmụ Juda, gbakọtara aka na-elekọta ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ ezi Chineke. Ụmụ Henadad+ na ụmụ ha na ụmụnne ha, bụ́ ndị Livaị, sokwa ha na-elekọta ndị ọrụ ahụ.
10 Mgbe ndị ọrụ ahụ tọrọ ntọala ụlọ nsọ Jehova,+ ndị nchụàjà, bụ́ ndị yi uwe ndị nchụàjà ma jiri opi,+ nakwa ndị Livaị bụ́ ụmụ Esaf, ndị ji ájà, biliri ka ha too Jehova otú Eze Devid nke Izrel kwuru ka a na-eme.+
11 Ha wee malite ịbụ abụ iji too Jehova ma kelee ya. Otu ìgwè na-abụ abụ, ìgwè nke ọzọ ana-ekwe ekwe,+ sị, “n’ihi na ọ dị mma. Ịhụnanya o nwere n’ebe Izrel nọ na-adịru mgbe ebighị ebi.”+ Ndị Izrel niile wee jiri oké olu too Jehova maka na a tọọla ntọala ụlọ Jehova.
12 Ọtụtụ n’ime ndị nchụàjà, ndị Livaị, na ndị isi ọnụmara dị iche iche, ya bụ, ndị agadi hụrụ ụlọ nke mbụ ahụ,+ bere ákwá n’oké olu mgbe ha hụrụ ka a na-atọ ntọala ụlọ a. Ma, ọtụtụ ndị ọzọ ji oké olu na-eti mkpu ọṅụ.+
13 N’ihi ya, ndị mmadụ amataghịzi nke bụ́ mkpu ọṅụ na nke bụ́ mkpu ákwá maka na ndị mmadụ nọ na-etisi mkpu ike nke na a na-anụ ya n’ebe dị ezigbo anya.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ya bụ, Iwu Mosis.